Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe n’August na September: A pụrụ inyefe akwụkwọ ọ bụla nwere peji dị 192 n’ọnụ ego e mere ka ọ dị ala bụ́ ₦20 ma e wezụga Akwukwọ-nduzi Ulo-akwukwọ Ije-ozi Ọchichi-Chineke, Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, na Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị. E degaara ọgbakọ na òtù ndị okenye ọ bụla akwụkwọ banyere nke a na March. October: Ụtụ maka Teta! ma ọ bụ Ụlọ Nche ma ọ bụ maka magazin abụọ ahụ. November: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi.
◼ Anyị enwetawo akụkọ site n’aka ọtụtụ Kọmitii Mmekọrịta Ụlọ Ọgwụ anyị banyere ahụmahụ ndị ha na-enwe mgbe ha jere ileta ụlọ ọgwụ dị iche iche. Ụfọdụ ndị dọkịta na ndị nọọsụ na-eme mkpesa na Ndịàmà Jehova adịghị eji kaadị Medical Directive ha mgbe ha na-achọ ka a gwọọ ha. Ha na-akọkwa na mgbe a na-edejupụta fọm Hospital Registration ma ọ bụ nke Admission na akwụkwọ ndị ọzọ, ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị nwoke na nwanyị na-edenye okwu bụ́ “Onye Kraịst” n’ịkọwa okpukpe ha. Nke a ewetawo mgbagwoju anya n’ime ka a mata ụfọdụ n’ime anyị dị ka Ndịàmà Jehova bụ́ ndị na-emegide usoro iji ọbara agwọ ọrịa. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị idenye “Ndịàmà Jehova.” N’ụzọ dị otú a, ha ga-amata ndị anyị bụ ozugbo ka e wee gwọọ anyị n’ụzọ kwesịrị ekwesị. N’ezie, anyị agaghị ahapụ ịgwa dọkịta site ná mmalite na anyị bụ Ndịàmà Jehova. Anyị na-adọrọ uche unu gaa n’ihe e kwuru n’akwụkwọ ozi anyị nke July 19, 1995, nye ọgbakọ nile, na anyị na-akpatara onwe anyị na ụlọ ọgwụ dị iche iche nsogbu mgbe anyị na-agbasoghị usoro ahụ e depụtara n’elu.
◼ A ga-amụ ọtụtụ broshuọ n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ mgbe a mụsịrị Ịnọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ. Na-amalite n’izu nke September 21, a ga-eji broshuọ Na-achọ mee ihe. Ntụle nke Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya? na Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie? ga-esochi.
◼ A na-ezigara ọgbakọ ọ bụla ókè fọm zuru ezu maka iji mee ihe n’afọ ije ozi 1999. Biko jiri ezi uche jiri fọm ndị a mee ihe. E kwesịrị iji ha mee ihe nanị maka nzube e ji mepụta ha.
◼ Ọgbakọ ọ bụla ga-anata fọm Literature Inventory (S-18) atọ. Odeakwụkwọ ọgbakọ na onye na-ahụ maka akwụkwọ kwesịrị izukọ ná mmalite August ma setịpụ ụbọchị maka ime ngụkọ nke akwụkwọ nile e nwere n’ọgbakọ ná ngwụsị ọnwa. A ghaghị ịgụ akwụkwọ nile e nwere ọnụ, a ga-edebakwa ngụkọta ha na fọm Literature Inventory. A pụrụ ịnata ngụkọta magazin ndị e nwere site n’aka onye na-elekọta magazin. Biko zitere Society ibe nke mbụ tupu September 6 agafee. Debe ibe nke abụọ ya na faịlụ unu. A pụrụ iji nke atọ mee ihe dị ka ibe akwụkwọ a ga-eji rụọ ọrụ. Odeakwụkwọ kwesịrị ilekọta ngụkọ ahụ, onyeisi oche ndị nlekọta kwesịkwara inyocha fọm ahụ e dejupụtara edejupụta. Odeakwụkwọ na onyeisi oche ndị nlekọta ga-abịanye aka na fọm ahụ.
◼ Malite n’August 21, 1998, ruo August 30, 1998, Society ga na-eme ngụkọ nke akwụkwọ nile e nwere n’Igieduma. N’ihi ngụkọ a, ọ dịghị ọda akwụkwọ ọgbakọ tinyere nke a ga-akwadebe maka ibupụ ma ọ bụ ka a bịa buru n’ụbọchị ndị ahụ.
◼ Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwesịrị ilebara akwụkwọ nile e tinyere maka ozi ọsụ oge nile anya ozugbo. Kọmitii ije ozi ekwesịghị ijide akwụkwọ ahụ iji hụ ma onye tinyere akwụkwọ ahụ ọ̀ pụrụ ịrụtazu hour a chọrọ. Anyị pụrụ ịgbanwe akara ụbọchị nhọpụta dị n’akwụkwọ ndị e nwetara n’onwe anyị mgbe akara ụbọchị e denyere gafeworo. A dịghị eme nhọpụta ma denye akara ụbọchị gafeworo ọ gwụla ma e nwere ọnọdụ gbara ọkpụrụkpụ ndị ga-eme ka e mee ya. Ọ bụrụ na e nwere ụdị ọnọdụ ahụ, akwụkwọ ozi kwesịrị iso akwụkwọ ozi ọsụ ụzọ ahụ bịa.—Lee ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke September 1986, paragraf nke 24-26.
◼ A na-ezigara ọgbakọ ọ bụla fọm S-10 Congregation Analysis Report abụọ. E kwesịrị iji nlezianya dị ukwuu dejupụta fọm a ma zitere Society ibe nke mbụ tinyere akụkọ ozi unu nke ọnwa August tupu September 6, 1998 agafee. Ibe ya nke abụọ bụ maka faịlụ unu.