Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/99 p. 1
  • Kụziere Ndị Ọzọ Ịbara Onwe Ha Uru

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kụziere Ndị Ọzọ Ịbara Onwe Ha Uru
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ị̀ Na-erite Uru?
    Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Nwee Ọṅụ ná Ndụ Ezinụlọ
    Nwee Ọṅụ ná Ndụ Ezinụlọ
  • È Nwere Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ?
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Ndụ Ezinụlọ—Ụzọ Ị Pụrụ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma
    Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 5/99 p. 1

Kụziere Ndị Ọzọ Ịbara Onwe Ha Uru

1 Jehova chọrọ ka mmadụ nile baara onwe ha uru. (Aịsa. 48:17) Ọ maara ihe na-enye anyị ezi obi ụtọ. Ọchịchọ ya siri ike bụ ka ụmụ mmadụ zere ọdachi ma nụ ụtọ ndụ site n’ige ntị n’iwu ya. Anyị na-abara onwe anyị uru nke ukwuu site n’ibi ndụ anyị n’ụzọ kwekọrọ n’ụzọ Chineke. (Abụ Ọma 34:8) Olee otú anyị pụrụ isi kụziere ndị ọzọ ime otú ahụ?

2 Gịnị Ka Ndị Mmadụ Chọrọ? Gịnị na-echegbu ndị nwe ụlọ n’ebe i bi? Ọ́ bụghị inwe nchebe nke ebe obibi ha, otú alụmdi na nwunye ha siruru n’ike, ọdịnihu nke ụmụ ha, na ihe ndị yiri ha? Mgbe ha nwere nsogbu, olee ebe ha na-aga maka enyemaka? Ha pụrụ ịdị na-adabere n’onwe ha, n’usoro ihe omume ndị na-akụzi ụzọ isi nyere onwe onye aka, ma ọ bụ ná nduzi nke ndị ọzọ. Mgbe a nọ na-eme nke a, echiche ndị na-emegiderịta ibe ha, ndị na-adịghịkwa irè na-eme ka ọtụtụ ndị ghara ịma ihe ha ga-eme iji baara onwe ha uru. Anyị aghaghị ime ka ha kwere na nduzi nke Okwu Chineke na-enye ka nnọọ mma. (Abụ Ọma 119:98) Anyị pụrụ ime nke a site n’igosi ha otú ha pụrụ isi mee ka ndụ ha ka mma ọbụna ugbu a ma ọ bụrụ na ha etinye mgbalị ịmụ Bible ma tinye ihe ọ na-ekwu n’ọrụ.—2 Tim. 3:16, 17.

3 Ndụ Ezinụlọ Ka Mma: Mmadụ ole na ole na-amata otú ndụmọdụ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ nke dị ná Ndị Efesọs 5:22–6:4 si dị irè n’ezie n’idozi nsogbu ezinụlọ. Nke a bụ ihe mere otu di na nwunye bụ́ ndị kpebiri na ha ga-ekewa mgbe afọ iri nke alụmdi na nwunye gasịrị. Otú ọ dị, a maliteere nwunye ya ọmụmụ Bible, bụ́ onye a kụziiri ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ banyere ndụ alụmdi na nwunye. N’oge na-adịghị anya di ya hụrụ mgbanwe ndị ọ nọ na-eme ka ọ na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, o sonyekwara n’ọmụmụ ihe ahụ. O mesịrị kwuo, sị: “Ugbu a anyị achọtawo ebe ndụ ezinụlọ nwere ezi obi ụtọ hiwere isi.”

4 Ezi Nzube ná Ndụ: Mgbe otu onye na-eto eto ọgwụ ọjọọ riri ahụ chọrọ ka Ndịàmà nyere ya aka, a kụziiri ya na Jehova nwere mmasị n’ebe ọ nọ. O kwuru, sị: ‘Amụtara m na Onye Okike nwere nzube maka mmadụ ma na-ekwe ndị ọ nwapụtara nkwa ndụ ebighị ebi. Enwere m nnukwu obi ụtọ maka nke a. Taa enwere m ezi ahụ ike, udo nke uche, na mmekọrịta chiri anya nke mụ na Chineke.’

5 Onye ọ bụla pụrụ irite uru n’enyemaka dị irè dị n’Okwu Chineke. Site n’iji ya eme ihe dị ka ihe nduzi anyị, anyị na-ekwenye na ụzọ Jehova ka ụzọ nile nke ụwa mma. (Abụ Ọma 116:12) Ọ bụụrụ anyị ihe ùgwù izi ndị ọzọ ozi a, ịkụziri ha ịbara onwe ha uru. Ka anyị na-eme otú ahụ, anyị ga-ahụ ọtụtụ ezi ihe ga-esi na ya pụta.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya