Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe na May ruo July: Nnyefe pụrụ iche nke ùkwù akwụkwọ ndị e mere ọda ha site n’aka Society dị ka a kọwapụtara n’akwụkwọ ozi anyị nke March 1, 1999. Ùkwù ndị nwere akwụkwọ anọ maka ₦70 (ma ọ bụ ₦60 ma ọ bụrụ na Akwukwọm nke Akukọ Bible esoghị n’ùkwù ahụ). Rịba ama na nke a bụ mgbanwe nke ihe a mara ọkwa ya ná mbipụta Ozi Alaeze Anyị nke February, March, na April. August: A pụrụ iji nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ nwere peji dị 32 mee ihe: Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs. A pụkwara inyefe broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile na Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie? n’ebe o kwesịrị.
◼ Malite ná mbipụta ya nke June 1, 1999, a ga na-ebipụta Ụlọ Nche n’asụsụ Tiv otu ugbo n’ọnwa. Malitekwa ná mbipụta nke June 1999, a ga na-ebipụta Ozi Alaeze Anyị n’asụsụ Tiv. Ọgbakọ ndị chọrọ ime ọda Ụlọ Nche Tiv kwesịrị ime otú ahụ ugbu a, na-eji fọm M-202 eme ihe.