Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/99 p. 7
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Zụlite Nwa Gị Site na Nwa Ọhụrụ
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Ndị Nne na Nna—Jirinụ Ịhụnanya Na-azụ Ụmụ Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ndị Nne Ma Ọ Bụ Nna Nanị Ha Na-azụ Ụmụ, Ọtụtụ Ihe Ịma Aka Ha Na-enwe
    Teta!—2002
  • Ịmụta Ikwe Ka A Pụọ
    Teta!—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 5/99 p. 7

Igbe Ajụjụ

◼ Ndị nne na nna kwesịrị inwe nlezianya dịgasị aṅaa mgbe obere ụmụaka ha na-ekere òkè n’ozi ubi?

N’ụzọ kwesịrị ekwesị ndị nne na nna bụ́ ndị Kraịst na-akpọ ụmụ ha aga ozi ubi, na-azụ ha isoro ndị ọzọ kerịta ozi ọma Alaeze ahụ. N’ime otú ahụ, ọ dị mkpa ka ha na-eleru obere ụmụaka ha anya n’ihi ihe ize ndụ ndị pụrụ ịdị n’ókèala ha, ọbụna n’ebe ndị “na-adịchaghị ize ndụ.” N’ụzọ na-arị elu a na-emeso ụmụaka ihe ike ma na-emetọ ha n’ihi mmụba nke anyaukwu na mmekọahụ rụrụ arụ nke “oge dị oké egwu” ndị a anyị bi n’ime ha. (2 Tim. 3:1-5) Ọ dị ndị nne na nna mkpa ime ihe ndị ezi uche dị na ha iji chebe ụmụaka ha pụọ n’aka ndị ga-awakpo ha. Gịnị ka a pụrụ ime?

Bible na-adụ ọdụ n’ụzọ amamihe dị na ya ka anyị na-elezi anya ma na-elepụ anya n’ihu iji hụ ihe ize ndụ. (Ilu 22:3; Mat. 10:16) Nzube ya abụghị iji tie iwu, kama ọ bụ ihe amamihe dị na ya nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ onye ọzọ toworo eto na nwatakịrị iso mgbe a na-aga ozi ubi. Ọ bụrụ na ndị nkwusa abụọ na-eto eto ji ihe akpọrọ ihe arụkọọ ọnụ, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ka nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ onye ọzọ toworo eto nọrọ ebe ọ ga na-ahụ ha anya mgbe nile. Otú ọ dị, ka nwatakịrị na-emewanye okenye ma na-egosipụta na ya ji ihe akpọrọ ihe karị, nne na nna pụrụ ikpebi ma ọ chọrọ nlekọta nke nne na nna dị ala karị.—Leekwa Igbe Ajụjụ dị n’Ozi Alaeze Anyị nke October 1992.

Ọ bụkwa ihe amamihe dị na ya izere ihe ọghọm mgbe nile mgbe e ji ụgbọala na-eme njem na mgbe e ji ụkwụ na-agagharị. Ime ihe n’ezi nlezianya na-egbochikarị ihe ọghọm na ajọ ibu arọ nke ihe mgbu, mmefu ụlọ ọgwụ, na nsogbu ndị metụtara iwu bụ́ ndị pụrụ ịdapụta ma ọ bụ okwu ikpe.

O kwesịrị ekwesị ka ndị na-eto eto “too aha Jehova.” (Abụ Ọma 148:12, 13) Okwu ha ndị na-adọrọ mmasị na ezi akparamàgwà ha mgbe ha nọ n’ozi ubi na-amasị nnọọ ndị ọzọ ma na-ewetara Jehova otuto. Ndị nne na nna, jisienụ ike, nyere ụmụ unu aka ikerechi òkè anya n’ịkpọsa ozi ọma ahụ ka unu na-elezikwa anya ichebe ha pụọ n’ihe ize ndụ ọ bụla pụrụ ịdị!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya