Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/99 p. 1
  • Kpee Ekpere Maka Enyemaka Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kpee Ekpere Maka Enyemaka Jehova
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Meenụ Ka Chineke Mara Ihe Unu Na-arịo”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Gịnị Ka Ekpere Gị Na-egosi Banyere Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Jiri Onyinye I Nwere Ikpe Ekpere Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Otú Anyị Ga-esi Mee Ka Ekpere Anyị Na-akakwu Mma
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 7/99 p. 1

Kpee Ekpere Maka Enyemaka Jehova

1 Jisọs mere ka ịdị mkpa nke ngọzi Jehova n’ozi doo ndị na-eso ụzọ ya anya. (Mat. 9:37, 38) Ekpere anyị nke otuto na ekele si n’ala ala obi anyị tinyere arịrịọ siri ike na-egosi ndabere anyị kpam kpam n’ebe Jehova nọ maka enyemaka ya. (Fil. 4:6, 7) Akwụkwọ Nsọ na-agba anyị ume ikpe ekpere site “n’ekpere na arịrịọ nile,” nke a ga-agụnyekwa ekpere ndị anyị na-ekpe banyere ozi anyị.—Efe. 6:18.

2 Anyị na-eto Jehova n’ekpere maka àgwà na ihe ndị ọ na-emezu bụ́ ndị na-enweghị atụ. Anyị na-etokwa ya dị ka Onye Nyere anyị ozi ọma anyị na-ekwusa. O kwesịrị ka anyị too ya n’ihi na ọ bụ nanị ya na-eme ka ozi anyị gaa nke ọma.—Abụ Ọma 127:1.

3 Ekpere anyị nke inye ekele na-egosipụta ekele maka nghọta Jehova nyeworo anyị banyere uche na nzube ya. Ọ́ bụghị ihe ùgwù iso ndị ọzọ na-ekerịta eziokwu nke Alaeze ahụ? Anyị na-ekele Jehova maka ihe nile anyị na-arụzu n’ozi.—Abụ Ọma 107:8; Efe. 5:20.

4 N’ụzọ kwesịrị nnọọ ekwesị, anyị na-arịọ Jehova maka enyemaka n’ichọta ndị ga-anakwere ka anyị duziere ha ọmụmụ Bible, anyị na-arịọkwa maka enyemaka iji mee ka eziokwu ahụ baa n’obi ha. Site n’ịrịọ arịrịọ ndị dị otú ahụ, anyị na-egosi na ọ bụ nanị Chineke pụrụ ime ka ọrụ anyị na-arụ n’ozi na-arụpụta ihe.—1 Kọr. 3:5-7.

5 Otu nwanna nwanyị chere na otu nwanyị nọ n’ụzọ magazin ya adịghị agụ Ụlọ Nche na Teta! N’achọghị ka magazin ndị a dị oké ọnụ ahịa laa n’iyi, ọ rịọrọ Jehova na ọ bụrụ na nwanyị ahụ adịghị agụ ha, ya jụ ha. Mgbe nwanna nwanyị ahụ letara ya n’oge ọzọ, di nwanyị ahụ kwuru, sị: “I meela maka ịdị na-eweta magazin ndị a mgbe nile. Ana m agụ ha, enwekwara m nnọọ mmasị na ha.”

6 Site n’arịrịọ siri ike nke e ji obi umeala rịọ, anyị pụrụ ịrịọsi Jehova ike ka o nyere anyị aka ịnagide enweghị mmasị na ịkwa emo ọha na eze ma merie egwu ọ bụla nke mmadụ iji nọgide jiri nkwuwa okwu na-agbara ndị ọzọ àmà. (Ọrụ 4:31) Ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekpe ekpere site “n’ekpere na arịrịọ nile” ka anyị ji nrubeisi na-eje ozi anyị dị nsọ, anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova ga-enyere anyị aka.—1 Jọn 3:22.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya