Ima Ọkwa
◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe na July: Nnyefe pụrụ iche nke ùkwù akwụkwọ ndị e mere ọda ha site n’aka Society dị ka a kọwapụtara n’akwụkwọ ozi anyị nke March 1, 1999. Ùkwù ndị nwere akwụkwọ anọ maka ₦70 (ma ọ bụ ₦60 ma ọ bụrụ na Akwukwọm nke Akukọ Bible esoghị n’ùkwù ahụ). August: A pụrụ iji nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ nwere peji dị 32 mee ihe: Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs. A pụrụ inyefe broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile na Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie? n’ebe o kwesịrị. September: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. October: Asụsụ nile—ụtụ Ụlọ Nche na Teta!
◼ Na-amalite na September, ndị nlekọta sekit ga na-ekwu okwu ihu ọha isiokwu ya bụ “Jehova Bụụrụ Ndị Ya ‘Ụlọ Elu.’”
◼ A na-ezigara ọgbakọ ọ bụla fọm Report on Literacy abụọ. E kwesịrị idejupụta fọm a n’August 1, zitekwara anyị ya mgbe ọ na-erule August 6. Debe otu na faịlụ unu. E kwesịrị idejupụta fọm ahụ, ma ùnu nwere klas ịmụ ịgụ na ide ihe ma ọ bụ na unu enweghị ya.