Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/99 p. 1
  • Kwanyere Aha Ọma Jehova Ùgwù nke Ukwuu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kwanyere Aha Ọma Jehova Ùgwù nke Ukwuu
  • Ozi Alaeze Anyi—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ka E Doo Aha Gị Nsọ”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Jehova Na-eme Ka E Too Aha Ya
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
  • Ime Ka A Mara Aha Chineke
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Na-akwanyere Aha Ukwu Jehova Ùgwù
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1999
km 8/99 p. 1

Kwanyere Aha Ọma Jehova Ùgwù nke Ukwuu

1 Setan kwutọrọ aha Chineke mgbe ọ rabanyere nne na nna mbụ anyị ná mmehie. Ekwensu nyere echiche na Jehova ghaara Adam ụgha. (Jen. 3:1-5) Ebe e jikọtara aha Chineke na ikike o nwere imezu okwu ya, ebubo Setan bụ nkwutọ kasị njọ. Site n’iji ụzọ na-aga n’ihu n’ihu na-emezu nzube ya, Jehova ewepụwo aha ya ná nkọcha ma mee ka ọ dị mma.—Aịsa. 63:12-14.

2 Anyị bụ ndị Jehova ‘gụrụ aha ya.’ (Ọrụ 15:14, 17) Nke a na-enye anyị ohere igosipụta mmetụta anyị nwere banyere ido ya nsọ. Anyị na-ahụ aha Jehova dị ka ihe dị mma n’ezie, n’ihi na ọ na-anọchite anya ihe nile dị mma, nwere obiọma, nwere ịhụnanya, dị obi ebere, na ihe nile nwere ezi omume. Anyị na-atụ ụjọ dị ukwuu n’ihi ịdị ukwu nke aha Chineke dị ebube. (Abụ Ọma 8:1; 99:3; 148:13) Gịnị ka e kwesịrị ịkpali anyị ime?

3 Doo Aha Chineke Nsọ: A pụghị ime ka aha Chineke dị nsọ karịa otú ọ dịrịla. Ma site n’omume anyị dị ọcha na nkwusa Alaeze anyị, anyị pụrụ igosipụta na anyị na-akwanyere aha Chineke ùgwù kasịnụ. Ka anyị tie, sị: “Keleenụ Jehova, kpọkuonụ aha Ya, meenụ ka a mara omume Ya nile n’etiti ndị nile dị iche iche, hotanụ na e mewo ka aha Ya dị elu.” (Aịsa. 12:4) Olee otú anyị pụrụ isi mee nke a?

4 Anyị pụrụ iji ohere nile dapụtaranụ kpọsaa aha Jehova na ihe nile ọ na-anọchite anya ha. Ọrụ nkwusa anyị na-enye Jehova nsọpụrụ, ma ọ̀ bụ nke a haziri ahazi ma ọ bụ nke mberede, site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma ọ bụ site n’ụlọ ahịa ruo n’ụlọ ahịa, n’okporo ámá ma ọ bụ na telifon. Mgbe anyị hụrụ ndị nwere mmasị na-ege ntị, anyị kwesịrị iyi agba a kapịrị ọnụ iji gaghachi ma kụzikwuoro ha banyere Jehova. Nke ahụ pụtara na anyị aghaghị imezu ihe anyị yiri n’agba ma nọgidesie ike ná mgbalị anyị na-eme ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. Dị ka ihe obi ụtọ, kwa afọ ọtụtụ narị puku mmadụ na-amata, na-asọpụrụ, ma na-edo aha ọma Jehova nsọ.

5 Anyị iji obi anyị dum na-ekere òkè n’ọrụ nke ido aha Chineke nsọ na-egosi n’ụzọ doro anya ebe anyị kwụ n’esemokwu ahụ Setan welitere n’Iden. Nke a bụ ọrụ kasị mma ma dị nsọpụrụ anyị pụrụ ịrụ. Ka anyị kwanyere aha ọma Jehova ùgwù nke ukwuu ma jiri ịnụ ọkụ n’obi too ya!—1 Ihe 29:13.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya