Kpọọ Onye Ọ Bụla Akpịrị Na-akpọ Nkụ Òkù
1 Dị ka Emọs onye amụma bu ụzọ kwuo, ezinụlọ mmadụ taa nwere ‘akpịrị ịkpọ nkụ, na-abụghị nke mmiri, kama nke ịnụ okwu nile nke Jehova.’ (Emọs 8:11) Iji nyere ndị nwere akpịrị ịkpọ nkụ ime mmụọ a aka, anyị na-agwa ha banyere ndokwa ndị Chineke mere maka ịnapụtaghachi ụmụ mmadụ na-erube isi n’aka mmehie na ọnwụ, bụ́ ndị a kọwara n’isiakwụkwọ ikpeazụ nke Mkpughe dị ka “osimiri nke mmiri nke ndụ.” Anyị nwere ihe ùgwù nke ịkpọ onye ọ bụla akpịrị ezi omume na-akpọ nkụ òkù ịbịa “nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu.” (Mkpu. 22:1, 17) Olee otú anyị pụrụ isi mee nke a n’August? Ọ bụ site n’inyefe ndị nwere ezi mmasị broshuọ dị iche iche. Ị pụrụ ịnwale ụzọ iche ihe n’ihu ndị a:
2 Ebe ọtụtụ ndị na-echegbu onwe ha banyere ahụ ike, ụzọ njekwu a pụrụ ịdịrị gị irè mgbe i ji broshuọ bụ́ “Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?” eme ihe:
◼ “Ọtụtụ na-echegbu onwe ha banyere ọnụ ego na-arịwanye elu ọ na-ewe inwe nlekọta ahụ ike dị mma. Ikekwe i chetụwo echiche banyere nke a. [Nye ohere maka nzaghachi.] È nwere ngwọta na-adịgide adịgide nye nsogbu a? [Chere maka nzaghachi.] Lee olileanya magburu onwe ya e kwuru n’ebe a.” Gụọ Mkpughe 22:1, 2. Sapetazie ihe osise ahụ dị na peji nke 24 nke broshuọ ahụ ma jiri paragraf nke 11 kọwaa ya. Mechie site n’ikwu, sị: “Akwụkwọ a na-atụle ihe ị ga-eme ka i wee nwee ike iji obi ike na-atụ anya ibi n’ụwa ọhụrụ dị ebube nke Chineke.” Nyefee broshuọ ahụ n’ụtụ ₦15. Mee ndokwa ịlọghachi.
3 Mgbe ị na-eme nletaghachi, ị pụrụ ịmaliteghachi nkwurịta okwu gị site n’ikwu, sị:
◼ “N’oge gara aga m bịara, anyị kwuru banyere ngwọta na-adịgide adịgide nye nsogbu ahụ ike. Ì chere na ọ ga-adị mgbe ọ na-adịghị onye ga-arịakwa ọrịa? [Nye ohere maka nzaghachi.] Nụrụ okwu a dị ịrịba ama.” Gụọ Aịsaịa 33:24. Sapetazie Ihe Ọmụmụ nke 5 na broshuọ Na-achọ, ma tụlee paragraf nke 5-6, na-ajụ ajụjụ ndị kwekọrọ ekwekọ dị ná mmalite nke ihe ọmụmụ ahụ ma gụọ ole na ole n’ime akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka na ha. Kwuo na iwepụ ọrịa na ọnwụ so ná mmezu nke ihe mbụ Chineke zubere maka ụwa. Mee ndokwa ịlọghachi iji tụlee paragraf nke 1-4 na nke 7 n’otu ihe ọmụmụ ahụ.
4 Ọ bụrụ na akụkọ banyere ọnwụ nnwụchu mere ọhụrụ ka dị ndị mmadụ n’obi, ị pụrụ ịnwale ụzọ njekwu a, na-eji broshuọ bụ́ “Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ” eme ihe:
◼ “Ọ pụrụ ịbụ na ị nụwo banyere [kwuo akụkọ ahụ]. Mgbe ndị mmadụ nwụrụ ọnwụ ike, ọtụtụ na-eche banyere ụdị nkasi obi a pụrụ inye ezinụlọ ndị ahụ mmadụ nwụnahụrụ. Gịnị ka i chere?” Nye ohere maka nzaghachi. Sapetazie peji nke 30 ma gosi ihe osise ahụ banyere mbilite n’ọnwụ. Gaa n’ihu site n’ikwu, sị: “Ọ na-eju ọtụtụ ndị anya ịnụ na a ga-akpọliteghachi ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume ná ndụ na Paradaịs n’elu ala. [Gụọ ma kọwaa Ọrụ 24:15.] Broshuọ a na-atụle ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-adọrọ mmasị banyere nzube Chineke maka ọdịnihu. Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị ịmatakwu ihe banyere ya, ị pụrụ inweta nke a n’ụtụ ₦15.” Mee ndokwa ịlọghachi, na-arịba ama ihe ndị onye ahụ nwere mmasị na ha na ihe ndị na-echegbu ya kpọmkwem.
5 Mgbe ị gara ọzọ, mee ka ụzọ i si eche ihe n’ihu onye ahụ nwee ụlọ kwekọọ n’ọnọdụ ya. Ikekwe ị pụrụ ikwu, sị:
◼ “N’oge gara aga anyị kwurịtara okwu, enwere m mmasị n’ihe i kwuru banyere nzube Chineke maka ụwa. [Kwughachi ihe o kwuru.] Achọtara m ihe ọmụma ụfọdụ m chere ga-amasị gị.” Sapeta Ihe Ọmụmụ nke 5 na broshuọ Na-achọ. Gụọ ma tụlee ọtụtụ paragraf dị n’ihe ọmụmụ ahụ ruo n’ókè o kwere mee dị ka onye nwe ụlọ nweruru mmasị. Mgbe i kwusịrị mgbe ị ga-alọghachi iji gaa n’ihu n’ọmụmụ ihe ahụ, nye onye ahụ nwe ụlọ mpempe akwụkwọ ọkpụkpọ òkù na-egosi oge ọgbakọ ji enwe nzụkọ. Kọwaa banyere Nzukọ Ihu Ọha, ma kpọọ ya ka ọ bịa.
6 Ọ bụrụ na i nwere mmasị karị n’ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke dị mfe, nke iji traktị mee ihe, ị pụrụ ikwu nke a:
◼ “Ọ ga-amasị m ka i nweta traktị a bụ́ Olileanya Dị Aṅaa Dịịri Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ?” Nye ya onye ahụ nwe ụlọ, ma gwa ya ka ọ na-ele anya ka ị na-agụpụta paragraf nke mbụ. Nye ya ohere ka ọ zaa ajụjụ ahụ a jụrụ n’ahịrịokwu ikpeazụ. Gụọ paragraf nke abụọ, ma sapetazie ihe osise ahụ dị na peji nke 31 na broshuọ bụ́ Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Gaa n’ihu site n’ikwu, sị: “Akwụkwọ a na-akọwakwu mbilite n’ọnwụ na nkwa ndị magburu onwe ha dị na Bible maka ọdịnihu. Nke a pụrụ ịbụ nke gị n’ụtụ ₦15.” Mee ndokwa maka nletaghachi.
7 Anyị ịkpọ ndị ọzọ òkù n’ụzọ na-adọrọ mmasị pụrụ ime ka ha bịa na mmiri nke ndụ ahụ, nke Jehova na-enye ugbu a. Ya mere ka anyị sị onye ọ bụla akpịrị na-akpọ nkụ, “Bịa.”—Mkpu. 22:17.