Inweta Ọṅụ n’Ozi Dị Nsọ Ị Na-eje
1 Ha “weere ọṅụ” lọghachi. Ihe ndekọ Bible na-egosi mmetụta ndị na-eso ụzọ 70 ahụ nwere mgbe ha na-akọrọ Jisọs otú ha si jee, ka ha mesịrị ogologo njem ije mee nkwusa. Ha nwetara ọṅụ dị ukwuu site n’ime uche Chineke. (Luk 10:17) Gịnị pụrụ inyere gị aka inweta ọṅụ yiri nke ahụ n’ije ozi dị nsọ?
2 Àgwà Ziri Ezi: I nwere ihe ùgwù sitere n’aka Chineke nke ime ka ndị ọzọ mara nzube dị ebube nke Jehova. Site ná nkwusa ị na-eme, ị pụrụ inye aka tọhapụ mmadụ pụọ n’omume rụrụ arụ nke ụwa a na ihe mgbochi dị iche iche nke okpukpe ụgha. Ị pụrụ ime ka ndị mmadụ nwee olileanya nke ịdị ndụ n’ime ụwa nke nkewa gbara anyị gburugburu taa na-adịghị. Chee echiche banyere ọṅụ Jehova na-enwe mgbe ị kụrụ mkpụrụ eziokwu ahụ n’obi nabatara ya. Nwee echiche ziri ezi mgbe ị na-ekpe ekpere ka mmụọ Chineke zụlite mkpụrụ nke ọṅụ n’ime gị, ka i ji obi gị nile na-ezisa ozi ahụ.
3 Ọzụzụ Dị Irè: E jiriwo oge ahụ Jisọs ji nye ndị na-eso ụzọ 70 ahụ ntụziaka tụnyere Nzukọ Ije Ozi nke oge a. O nyere ha ọzụzụ ka ha wee nwee ike ijezu ozi ha n’ụzọ dị irè. (Luk 10:1-16) Taa, Nzukọ Ije Ozi na-azụ gị n’ụzọ ndị ị pụrụ isi jekwuru ndị mmadụ, otú ị pụrụ isi malite mkparịta ụka, na otú ị pụrụ isi malite ma na-eduzi ọmụmụ Bible ebe obibi. Site n’ịrụsi ọrụ ike na ime ka nkà i nwere n’ime nkwusa na-adịwanye mma, ị ga-ahụ na mmetụta ọ bụla nke ahụ erughị ala na erughị eru ị pụrụ inwe ga-ebelata ma bụrụ nke e ji obi ike na ọṅụ dochie.
4 Lekwasị Anya n’Ọdịnihu: Jisọs nwetara ọṅụ n’ije ozi ya dị nsọ n’agbanyeghị ahụhụ ndị ọ tachiri obi na ha. N’ihi gịnị? N’ihi na o lekwasịsiri anya ike ná ngọzi na ihe ùgwù ndị dị n’ihu ya. (Hib. 12:2) Ị pụrụ ime otu ihe ahụ site n’ịtụkwasị uche na obi gị n’aha Jehova nakwa ná ngọzi ndị ga-adị n’ụwa ọhụrụ Chineke. Nke a ga-eme ka i nwekwuo ọṅụ na nzube n’ozi gị.
5 Ijere Jehova ozi dị nsọ bụ ihe ùgwù kasị ukwuu ị pụrụ inwe taa. N’ihi ya, ị pụrụ ikwu sị: “Ime ihe dị Gị ụtọ atọwo m ụtọ, Chineke.”—Abụ Ọma 40:8.