Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe na September: A pụrụ iji nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ nwere peeji 32 mee ihe: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs. A pụrụ inyefe broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile na Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie? n’ebe o kwesịrị. October: Ụlọ Nche na Teta! A pụrụ inyefe ụtụ ebe a chọtara mmasị ná nletaghachi. Na-amalite ná ngwụsị ọnwa ahụ, a ga-ekesa Akụkọ Alaeze nke 36. November: Nkesa nke Akụkọ Alaeze nke 36 ga-aga n’ihu. Ọgbakọ ndị jezuru ókèala ha site n’iji otu mkpụrụ Akụkọ Alaeze nke 36 jekwuru ndị nwe ụlọ n’ebe obibi ọ bụla pụrụ inyefe broshuọ Na-achọ ma ọ bụ akwụkwọ Ihe Ọmụma. Ọ bụrụ na ndị mmadụ enwetala ha, a pụrụ iji akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi mee ihe. December: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi.
◼ Ọ dịwo mkpa mgbe nile inwe ihe enyemaka mgbe e nwere ọdachi. Ọ bụrụ na ị chọrọ inye ego maka ihe enyemaka n’ihi ọdachi, ị pụrụ izitere Society onyinye gị, bụ́ ebe e wepụtara ego enyemaka iche maka nzube a. Adres bụ: Watch Tower, P.M.B. 1090, Benin City, Edo State. (Lee Ụlọ Nche nke August 1, 1986, peeji nke 20-22.) Biko eziterela Society uwe, ihe oriri ma ọ bụ ihe ndị ọzọ, ma ọ bụ ziga ha n’ebe e nwere ọdachi ọ gwụla ma Society ma ọ bụ kọmitii enyemaka ha rịọrọ kpọmkwem ka e mee otú ahụ. Nke a ga-eme ka e nwee ụzọ dị n’usoro nke isi nye ihe enyemaka na ikesa ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị.
◼ A na-echetara ndị okenye ịgbaso ntụziaka ndị e nyere na peeji nke 21-23 nke Ụlọ Nche April 15, 1991, banyere ndị ọ bụla a chụpụrụ n’ọgbakọ ma ọ bụ kewapụrụ onwe ha bụ́ ndị pụrụ ịchọ ka a nabataghachi ha.
◼ Ndị nọ n’ọgbakọ kwesịrị izite ụtụ ọhụrụ na ndejupụtaghachi ụtụ nile maka Ụlọ Nche na Teta!, tinyere ụtụ nke ha, site n’ọgbakọ.
◼ Society adịghị ahụ maka ọda akwụkwọ nke ndị nkwusa n’otu n’otu. Onyeisi oche ndị nlekọta kwesịrị ime ndokwa ka a na-ama ọkwa kwa ọnwa tupu e zigara Society ọda akwụkwọ nke ọgbakọ kwa ọnwa ka ndị nile nwere mmasị inweta akwụkwọ nke onwe ha nwee ike ịgwa nwanna na-elekọta akwụkwọ. Biko buru n’uche akwụkwọ ndị a na-emere ọda pụrụ iche.
◼ Kaseti Ọhụrụ A Na-ege Ege E Nwere:
Appreciating Our Spiritual Heritage (Ihe nkiri, otu kaseti)—Bekee