Gaa Mgbakọ n’Ebe Ndị Nzukọ Jehova Họpụtara
1 Ndị Jehova akwadowo mgbe nile ndokwa ndị ọ na-eme banyere ebe a ga-anọ fee ofufe. N’oge nke Alaeze dị n’otu nke Israel, e nyere ndị Israel iwu ịga Jerusalem, “bụ́ obodo nke Jehova họpụtara n’etiti ebo nile nke Israel, itinye aha Ya n’ebe ahụ,” ihe karịrị otu ugboro n’afọ.—1 Eze 14:21; Ọpụ. 34:23, 24.
2 A Chọrọ Mmụọ Ịchụ Onwe Onye n’Àjà: Ihe ka ukwuu n’ụmụ Israel bi n’ebe dị nnọọ anya site na Jerusalem, ha aghaghịkwa iji ụkwụ gaa ije ọtụtụ ụbọchị iji rute Jerusalem. Ma ndị ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe n’ime ha nwere mmasị ná mgbakọ ukwu ndị a ma chụọ àjà ndị dị mkpa iji gaa. Ha ji ndokwa Jehova kpọrọ ihe, na-amata na ọ bụ maka ọdịmma ha na-adịgide adịgide.—Luk 2:41.
3 N’eziokwu, ime njem dị anya iji gaa mgbakọ ukwu dị iche iche pụrụ ịchọ ịchụ ihe n’àjà. N’agbanyeghị àjà ndị ọ pụrụ ịchọ, ọṅụ na uru ime mmụọ ndị a na-enweta site ná mgbakọ dị iche iche enweghị atụ. (2 Ihe 30:26; Neh. 8:17) Ọtụtụ afọ gara aga, ụmụnna chụrụ àjà dị ukwuu iji gaa mgbakọ dị iche iche a na-ebugharị mgbe nile site n’otu ebe gaa n’ọzọ—ụfọdụ n’ebe dị nnọọ anya site n’ụlọ. (yb86-E 198-199) E nwere ihe nlereanya nke oge a nke ndị na-eji ụkwụ gaa njem dị anya iji ruo n’ebe ahụ. Ndjaukua Ulimba, bụ́ agadi nwoke dị afọ 73, ọtụtụ mgbe na-eji ụkwụ aga kilomita 724 nakwa ruo ụbọchị 16 iji garuo ụlọ mgbakọ dị n’ógbè ya!—Lee w98-IB 8/1 p. 32; km-IB 9/98 3 para. 3-4.
4 Ị̀ dị njikere iche ihe isi ike, ule, na ihe ịma aka ndị pụrụ ibilite na mgbe ikpeazụ a ihu iji sonyere ndị Jehova n’oriri? Dị ka Pọl onyeozi na-echetara anyị n’Ọrụ 14:22: “Anyị aghaghị isite n’ọtụtụ mkpagbu baa n’alaeze Chineke.” Ya mere, enwela nkụda mmụọ n’ihi ịdị oké ọnụ nke ego ụgbọ, ma ọ bụ ọbụna ụzọ ọjọọ wee jụzie òkù ahụ a kpọrọ izukọta ọnụ maka ntụziaka sitere n’aka Chineke. Iji agụụ siri ike na-etinye mgbalị dị mkpa iji nọrọ ná mgbakọ ukwu ọ bụla Jehova mere ndokwa ya site ná nzukọ ya ga-ewetarịrị ngọzi ime mmụọ, ‘n’ihi na otu ụbọchị n’ogige Jehova karịrị otu puku n’ebe ọzọ.’—Abụ Ọma 84:10.
5 Enwela Mmụọ nke Nnwere Onwe: Ọtụtụ ndị nkwusa enwewo ndakpọ olileanya mgbe Society, n’ihi ihe ụfọdụ, jụrụ imezu ọchịchọ ha maka Ụlọ Mgbakọ ọhụrụ dị iche na nke e ji eme ihe ugbu a. N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ emewo mkpesa banyere ebe e kenyere ha ma jụ ịga maka usoro ihe omume nke mgbakọ dị iche iche n’agbanyeghị na ha pụrụ ịga, ma ọ bụ ọbụna na-ala azụ ịga n’ihi ihu igwe na-adịchaghị mma ma ọ bụ ụzọ ọjọọ. Nke a adịghị agba ume. Ịkpali ndị ọzọ ileghara ndokwa ọchịchị Chineke anya n’okwu ndị dị otú a bụkwa ihe na-adịghị mma, ọ na-egosikwa mmụọ nke nnwere onwe. (1 Kọr. 4:2) Ọ bụ ezie na nzukọ a na-agbalị ime ka ọ dịrị ụmụnna mfe mgbe ọ bụla o kwere mee, ọ dị mgbe a ga-achọ ka anyị mee ihe maka abamuru nke ndị ọzọ na maka ọdịmma nke nzukọ a. Ọ bụrụ na anyị emee ihe na-atọ Jehova ụtọ ma ghara ịdị na-achọ ọdịmma anyị mgbe nile, ọ bụghị nanị na ndị ọzọ na-erite uru, kama ka oge na-aga anyị na-enweta ngọzi Jehova.—Rom 15:1, 2; 1 Kọr. 10:31-33; 1 Tesa. 2:4.
6 Jide Ihe Ndị Ka Mkpa n’Aka: N’ezie, anyị nile, dị ka ndị Israel ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, kwesịrị inwe mmasị ná nri ime mmụọ ahụ karịa n’ebe Ụlọ Mgbakọ dị. Ọ bụ ezie na inwe mgbakọ sekit na mgbakọ pụrụ iche na gburugburu ebe mmadụ bi pụrụ ime ka ọ dịrị onye ọ bụla mfe, ọ naghị ekwecha omume mgbe nile ma ọ bụ na-ebelata mmefu ego. Ihe sekit ọ bụla ịgbalị inwe ụlọ nzukọ nke ya ga-ewe n’ụzọ ego na n’ụzọ nkịtị pụrụ ịkarị nsogbu ndị a na-enwe ugbu a. Cheedị echiche banyere oké mmefu ego dị n’iwu ihe owuwu, nlekọta, na mmebi nke ihe owuwu na-emebi ngwa ngwa n’ihi ejighị ya na-eme ihe mgbe nile. N’eziokwu, ọ pụrụ ọbụna ịdọpụ uche a pụrụ itinye n’ihe ndị ka mkpa, ma ọ bụrụ na a malite ya mgbe ọ na-adịghị oké mkpa.
7 Mkpebi anyị siri ike kwesịrị ịbụ igosipụta mmụọ nke ọbụ abụ ahụ dị ka e gosiri n’Abụ Ọma 122:1: “Aṅụrịrị m ọṅụ mgbe ha na-asị m, Ka anyị jee n’ụlọ Jehova.” Jiri ikwesị ntụkwasị obi nakwa obi gị nile na-akwado ndokwa Jehova mere site n’ịga mgbakọ dị iche iche n’ebe ndị a họpụtara. (Hib. 10:24, 25) Àjà ọ bụla anyị na-achụ iji nweta ntụziaka ime mmụọ ga-abụ maka ọdịmma ebighị ebi anyị.