Rite Uru n’Usoro Izi Ihe Jehova
1 Otu nwa okorobịa nọ na United States nwere ọrụ a na-akwanyere ùgwù—na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ na-emepụta ngwá agha na ụgbọ na-aga na mbara igwe. Otú ọ dị, ka ọ na-amụ Bible, ọ ghọtara na ọrụ ọ họọrọ na-emegide ụkpụrụ Bible. (Aịsa. 2:4) Akọ na uche ya nyere ya nsogbu. Ọ hụrụ n’ụzọ doro anya na ya apụghị ịnọgide na-arụ ọrụ ya ma n’otu mgbe ahụ nọgide na-enwe akọ na uche dị ọcha. (1 Pita 3:21) N’otu aka ahụ, ọtụtụ ndị taa etinyewo ọtụtụ afọ n’ịrụ ọrụ nke ha na-aghọta mgbe oge gafeworo ná ndụ na ọ na-emegide ụkpụrụ Bible. Olee otú anyị pụrụ isi kpebie ụzọ nke ga-eweta abamuru ndị na-adịgide adịgide?
2 Usoro Izi Ihe Ka Elu nke Jehova: Jehova na-ezi anyị ihe bụ́ nzube nke ndụ n’ezie na ụzọ isi jiri ndụ anyị mee ihe kasị baa uru. Ọ na-ezi anyị ịrụ ezigbo ọrụ. (Efe. 4:28) Ọ na-ezi anyị ụzọ isi meziwanye ọdịdị nke ndụ anyị n’uche, n’omume, na n’ụzọ ime mmụọ. Ọ na-ezi anyị ụzọ anyị na ụmụnna anyị, ezinụlọ anyị, na mmadụ ibe anyị ga-esi na-ebi n’udo. Ọ na-eme nke a site n’akwụkwọ ya, bụ́ Bible, nakwa site ná nzukọ ya.
3 Nzukọ ọgbakọ anyị dị oké mkpa n’akụkụ a. Ka anyị na-agachi anya ma na-ekere òkè ná nzukọ ise nile, anyị na-enweta ọzụzụ zuru ezu dị ka ndị ozi nke ozi ọma ahụ nakwa izi ihe zuru ezu n’ibi ndụ ndị Kraịst. (2 Tim. 3:16, 17) Onye Nkụzi Ukwu anyị na-ezikwu ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke site ná mgbakọ dị iche iche. Ihe mgbaru ọsọ anyị kwesịrị ịbụ ka anyị ghara mgbe ọ bụla ịhapụ otu nzukọ ma ọ bụ nnọkọ ma ọ bụrụ na ahụ ike na ọnọdụ anyị nyere anyị ohere ịga.
4 Ọ Bụ Ụzọ Nwere Ihe Ịga nke Ọma: N’Abụ Ọma 1:1-3, anyị na-agụ, sị:“Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahụ bụ nke na-ejeghị ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu. . . . N’iwu Jehova ka ihe ụtọ ya dị . . . Ihe ọ bụlakwa nke ọ na-eme, ọ na-eme ka ọ gaa nke ọma.” A na-achọta ezi ihe ịga nke ọma n’ime ihe na-atọ Chineke ụtọ—gụnyere ịgbaso iwu Jehova dị ka ọ dị na Bible na dị ka e si akọwa ya ná nzukọ ndị Kraịst.
5 Nwa okorobịa ahụ e kwuru okwu ya na paragraf mbụ malitere iso Ndịàmà Jehova na-eje nzukọ ma na-etinye izi ihe Jehova n’ọrụ ná ndụ ya. Ọ kwụsịrị ọrụ na-enye ya nnukwu ego ma nweta nke ọhụrụ nyere ya ‘ezi akọ na uche’ n’ebe Jehova nọ. Ọ raara ndụ ya nye Jehova ma na-eje ozi dị ka ọsụ ụzọ. Ugbu a ọ pụrụ ikwu, sị: “N’otu mgbe, ndụ m nile hiwere isi n’ịkpụpụta ajọ ngwá agha maka iji na-egbu ndị mmadụ ibe m. Otú ọ dị, n’ihi obiọma ya na-erughịrị mmadụ, Jehova megheere mụ na ezinụlọ m ụzọ ịghọ ndị ohu ya raara onwe ha nye na imikpu ndụ anyị n’iwetara ndị mmadụ ozi ọma banyere ndụ ebighị ebi n’ụwa paradaịs.”
6 Ka anyị jiri ịdị uchu na-achọ ịbụ ndị Jehova ziri ihe, iji nye Ya otuto na maka abamuru ebighị ebi anyị!—Aịsa. 48:17.