Zere Agbụ nke Omenala Ndị Na-ekwesịghị Ndị Kraịst
1 Ọtụtụ ọdịnala na-ebogbu ndị mmadụ n’ibu arọ ma na-ewetara ha ọtụtụ ihe isi ike. Jisọs kwuru banyere ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nke oge ya, sị: “Ha na-eke ibu dị arọ dịkwa ike obubu, tụkwasị ha n’ubu mmadụ.” (Mat. 23:4) Ọ bụ ezie na n’ụzọ bụ́ isi, ọdịnala ụfọdụ emegideghị Akwụkwọ Nsọ, ha pụrụ ịbụ ibu arọ. Nke a bụ eziokwu banyere ọtụtụ ihe omume e jikọtara ha na ememe agbamakwụkwọ. Oké ibu arọ nke mmefu ndị na-adịghị mkpa nke ego na oge pụrụ ime ka agbamakwụkwọ gharazie ịbụ ememe na-enye obi ụtọ.
2 Dị ka ndị Kraịst, anyị aghaghị ịnọgide na-adị ọcha, n’ihi ya, anyị na-ezere omenala na ọdịnala nile megidere ụkpụrụ Bible. Otú ọ dị, Setan na-eji ụzọ aghụghọ ndị ọzọ eme ihe iji mata anyị n’ọnyà ma e wezụga kpọmkwem omenala ndị ọgọ mmụọ. Ọ dị anyị mkpa ịnọ na nche banyere ụzọ aghụghọ ya nile. Ma ọ bụghị ya, anyị pụrụ itinye aka n’omume ndị na-ekwesịghị ndị Kraịst n’oge ememe agbamakwụkwọ. Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ụzọ ndị o ji eme ihe? Nke mbụ, ka anyị tụlee ihe ụfọdụ banyere ememe alụmdi na nwunye ọdịnala.—2 Kọr. 2:11.
3 Alụmdi na Nwunye Ọdịnala: Ha dị irè, bụrụ ndị iwu kwadoro, na ndị kwesịrị nsọpụrụ. N’ihi ya, ọgbakọ ndị Kraịst na-anabata ha mgbe e mere ha n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Olee otú e si eme ememe alụmdi na nwunye ọdịnala dị irè? Otu ụlọikpe dị elu na Nigeria kwuru n’oge na-adịbeghị anya, sị: “E nwere ihe ndị dị mkpa ma kwesị ekwesị a chọrọ maka ime ememe alụmdi na nwunye ọdịnala dị irè. Ụmụ irighiri ihe ndị a chọrọ na-adịgasị iche site n’otu ebe ruo n’ebe ọzọ, ma e nwere ụkpụrụ ndị sara mbara bụ́ ndị na-eyirịta ibe ha mgbe ụfọdụ.” Ụkpụrụ ndị a sara mbara gụnyere eziokwu ahụ bụ́ na (a) mmadụ abụọ ahụ aghaghị iru eru n’ụzọ iwu kwadoro ịlụ di na nwunye, nakwa (b) a ghaghị ịkwụ ndị mụrụ nwanyị ahụ a na-aga ịlụ ma ọ bụ onye na-elekọta ya, ụgwọ isi nwanyị.
4 Ụlọikpe ahụ kọwara na a na-eme ka alụmdi na nwunye ọdịnala dị irè site n’ịkpọla nwa agbọghọ ahụ n’ụlọ di ya mgbe e mesịrị ememe ahụ. Ma e meghị nke a, n’ezie, ha alụbeghị di na nwunye. N’ihi ya, dị ka anyị kọwara na mbụ, alụmdi na nwunye ọdịnala na-agụnye ịkwụ ụgwọ isi nwanyị na inyefe nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ. A na-emekarị nnyefe a nke nwanyị a na-alụ ọhụrụ n’otu ụbọchị ahụ a naara ego isi nwanyị. Site mgbe ahụ gaa n’ihu, a na-ewere mmadụ abụọ ahụ dị ka di na nwunye. Otú ọ dị, ka onye nke ọ bụla n’ime ha wee nwee ihe ùgwù dị iche iche n’ọgbakọ, ma e wezụga ịbụ onye nkwusa, e kwesịrị ideba alụmdi na nwunye ọdịnala ahụ n’akwụkwọ n’aka ndị ọchịchị ime obodo, na steeti ebe ndị o kwere omume.—Lee Ozi Alaeze Anyị nke March 1991, peeji nke 2, paragraf nke 5.
5 Na steeti ụfọdụ, e nweghị ndokwa maka ideba alụmdi na nwunye ọdịnala n’akwụkwọ. Ọ bụrụ na ndị gaje ịlụ di na nwunye achọpụta na ọ dị otú ahụ n’ebe ha bi, ha ga-eme nke ọma ime alụmdi na nwunye nke iwu tụpụtara. Nke a na ideba alụmdi na nwunye ọdịnala n’akwụkwọ abụghị otu ihe. Ọ bụ ụdị alụmdi na nwunye dị iche n’alụmdi na nwunye ọdịnala. A pụrụ ọbụna ime ya ma meekwa alụmdi na nwunye ọdịnala. N’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, anyị na-atụ aro ka a kwụọ ụgwọ isi nwanyị ma nyefee nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ tupu nakwa na nso nso ụbọchị ahụ a ga-eme alụmdi na nwunye nke iwu tụpụtara, ruo n’ókè o kwere mee. Ọ bụghị iwu na a ga-eme ụdị alụmdi na nwunye abụọ ahụ. Otú ọ dị, ọ ga-adị ndị ahụ gaje ịlụ di na nwunye mkpa ịtụle ma ịjụ ime alụmdi na nwunye ọdịnala ọ̀ pụrụ ime n’ụzọ na-adịghị mkpa ka ndị òtù ezinụlọ na-ekweghị ekwe sụọ ngọngọ.—Rom 14:13, 21.
6 Otu n’ime ihe omume a na-ewebata ugbu a n’agbamakwụkwọ ndị Kraịst n’akụkụ ụfọdụ nke mba a bụ iji onye ngabita bụ́ “nwanyị na-enye nkọwa” eme ihe mgbe a na-agba nkwụ. Onye a bụ onye na-enye nkọwa nke e goro ọrụ ikwuchitere nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na ezinụlọ ya ọnụ ha, onye na-eji ire ụtọ anapụta nwoke ahụ na-alụ nwanyị ọhụrụ na ezinụlọ ya ego na ihe onwunwe ndị ọzọ dị oké ọnụ ahịa. Bible na-adọ ndị Kraịst aka ná ntị ka ha ‘ghara inwe ịhụnanya ego.’ Kama nke ahụ, anyị kwesịrị igosirịta ibe anyị ịhụnanya ma na-achọ ọdịmma nke ụmụnna anyị. (Hib. 13:5; Fil. 2:4) Onye Kraịst bụ́ nwanyị nke na-eji nkà ya amanye ma ọ bụ na-emenye nwanna nwoke bụ́ onye Kraịst ihere iwepụta ihe onwunwe ya, agaghị na-eme omume n’ezie n’ụzọ kwekọrọ na ndụmọdụ a dabeere n’Akwụkwọ Nsọ.
7 Ụgwọ Isi Nwanyị: Omenala nke ịkwụ ụgwọ isi nwanyị adịghị njọ. (Jen. 24:53, 54) Ònye kwesịrị ịnara ụgwọ isi nwanyị? Dị ka ọ na-adịkarị, ọ bụ nna nke nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ ma ọ bụ onye na-elekọta ya. Ego ole a na-akwụ n’ụgwọ isi nwanyị na-adị iche site n’otu ebe ruo n’ebe ọzọ. N’ọnọdụ ụfọdụ, gọọmenti na-ekwu ego ole a na-agaghị akwụfe. N’ebe ọ dị otú ahụ, ndị Kraịst kwesịrị irube isi n’iwu ahụ.—Rom 13:1-7.
8 Ụgwọ isi nwanyị pụrụ ịgụnye ma ọ bụ ghara ịgụnye onyinye. Ọ bụrụ na nwoke na-alụ nwanyị ọhụrụ enwee nkwali inye onyinye tụkwasị n’ụgwọ isi nwanyị e kwuru, nke ahụ agbasaghị ọgbakọ. Ma, ọ ga-abụ n’ezie ihe ịhụnanya na-adịghị na ya bụ́ nna nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ ikwu ka e nye ya ọtụtụ onyinye karịa ihe iwu chọrọ ma ọ bụ isi ọnwụ ka nwoke ahụ na-aga ịlụ nwanyị kwụọ ụgwọ isi nwanyị nke karịrị ihe iwu setịpụrụ. Ọ gaghịkwa ekwesị ekwesị ka o kwe ka ndị ikwu ya bụ́ ndị ụwa, ndị ụkpụrụ Bible na-adịghị achịkwa kwuo ka e weta ihe ndị dị otú ahụ n’aha ya. Ọ bụghị obodo nwe nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ; ọ bụ ndị mụrụ ya nwe ya. Ndị Kraịst bụ́ nna kwesịrị iguzosi ike maka ihe ziri ezi, n’agbanyeghị ihe ndị ikwu ha bụ́ ndị ụwa pụrụ ikwu. Ọ ka mkpa inweta nnwapụta Jehova karịa nke mmadụ.
9 Ụfọdụ ndị Kraịst bụ́ nna ekpebiwo ịhapụ kpam kpam ịnara ụgwọ isi nwanyị. Ọ bụrụ na ndị na-achọ ịlụ di na nwunye ahọrọ alụmdi na nwunye ọdịnala kama alụmdi na nwunye nke iwu tụpụtara, ọ pụrụ ịdị mkpa ka nna nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ (ma ọ bụ onye na-elekọta ya, ma ọ bụrụ na nna ya anwụọla) nara ma ọ dịkarịa ala, ntakịrị ego dị ka ụgwọ isi nwanyị kama ịhapụcha ya kpam kpam. Nke a bụ n’ihi na akwụghị ụgwọ isi nwanyị pụrụ imetụta ịdị irè nke alụmdi na nwunye ọdịnala. Ebe ọ bụ na ịkwụ ụgwọ isi nwanyị abụghị ihe a chọrọ maka alụmdi na nwunye nke iwu tụpụtara, nsogbu ndị dị otú ahụ metụtara iwu agaghị ebilite ma ọ bụrụ na nna nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ ahọrọ ịhapụ ya kpam kpam mgbe e mere alụmdi na nwunye nke iwu tụpụtara.
10 Imekọta Ụdị Alụmdi na Nwunye Abụọ: Iwu Nigeria kwadoro ụdị alụmdi na nwunye abụọ, nke ọdịnala na nke iwu tụpụtara. Nke ọ bụla n’ime ha zuru ezu. Otú ọ dị, ụfọdụ ụmụnna na-achọ ime ma ịgba nkwụ (bụ́ nke gụnyere inye ihe oriri na mmanya), nke ememe oriri na-esochi, na ememe iwu kwadoro nke a na-ekwu okwu agbamakwụkwọ ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, bụ́ nke ememe oriri ọzọ na-esochi. Ime ememe oriri abụọ pụrụ ịkpata mmefu na-adịghị mkpa. Ozugbo e mere ememe ọdịnala, alụmdi na nwunye ahụ aghọwo ihe dị irè. Otú ọ dị, n’ebe di na nwunye mere alụmdi na nwunye ọdịnala n’ebe a na-enweghị ndokwa maka ideba alụmdi na nwunye ọdịnala n’akwụkwọ, ọ ga-abụ ihe kwesịrị ekwesị ka ha meekwa alụmdi na nwunye nke iwu tụpụtara. Ọ bụghị ememe oriri na-eme ka alụmdi na nwunye ahụ bụrụ ihe dị irè. Ọ bụrụ na e mee ememe oriri abụọ, a na-emefusi ego n’ụzọ na-adịghị mkpa. Ọtụtụ di na nwunye abanyewo n’oké ụgwọ, bụ́ nke na-ewetara alụmdi na nwunye ha ihe isi ike, n’ihi ime ndokwa maka ememe oriri abụọ. Gịnị kpataworo omume a?
11 E kwuru isi ihe na-akpata ya na 1 Jọn 2:16, bụ́ nke na-asị: “Ihe nile nke dị n’ụwa, bụ́ agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ, na agụụ ihe ọjọọ nke anya, na oké okwu nke ibi obi, esiteghị ná Nna anyị, kama o sitere n’ụwa.” Ọtụtụ ememe oriri agbamakwụkwọ na-aghọ oge iji gosipụta akụ̀ na ụba. Nke a emewo ka ime ememe oriri ndị buru ibu bụrụ ihe na-ewu ewu. A na-arụgide ụfọdụ ndị ime otú ndị ọzọ mere n’ihi na ha achọghị iyi ka ha dị iche. N’ihi ya, ha na-agbalịsi ike iṅomi ndị ọzọ. Ụfọdụ na-ahazi nnukwu ememe oriri na-eche na inwe ọtụtụ ndị bịaranụ ga-apụta inwetakwu onyinye.
12 N’ememe oriri ndị dị otú ahụ buru ibu, ọ na-esi ike ịchịkwa ihe. Ọtụtụ mgbe, a na-enwekarị ihe ọṅụṅụ ndị na-aba n’anya n’ụba, ụfọdụ na-adabakwa n’omume na-ekwesịghị ekwesị n’ihi ịṅụbiga mmanya ókè. A dịghị anabata omume dị otú ahụ n’etiti ndị Chineke.—1 Pita 4:3; Efe. 5:18.
13 Ànyị kwesịrị iṅomi ihe nile ụwa na-eme, ọ bụrụgodị na ọ dịghị iwu a kapịrị ọnụ megidere ihe ụfọdụ? Ọ dịghị ma ọlị! Ndị Rom 12:2 na-agba anyị ume ka anyị ‘ghara ikwe ka e mee ka anyị yie ajọ oge a.’ Ọzọkwa, ná 1 Ndị Kọrint 10:23, anyị na-agụ, sị: “Ihe nile ziri ezi n’iwu; ma ọ bụghị ihe nile bara uru. Ihe nile ziri ezi n’iwu; ma ọ bụghị ihe nile na-ewuli mmadụ elu dị ka ụlọ.” Ụdị ndụ mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke gbara ndị Kraịst oge mbụ gburugburu enweghị mmetụta n’ahụ ha. Ha dị iche. Ka anyị wee nọgide na-enwe nnwapụta Jehova, anyị onwe anyị kwa aghaghị ịjụ mmụọ nke ụwa.
14 Ọ bụ ezie na e nweghị iwu megidere ime ememe oriri abụọ, iji zere ibu arọ ndị na-adịghị mkpa, ọ́ gaghị akasị mma ka anyị nwee afọ ojuju n’ime nanị otu? N’ezie nke a ga-eme ka ibu anyị bu ‘n’oge ndị a dị oké egwu,’ dị mfe. (2 Tim. 3:1) Jisọs kwuru, sị: “Bịakwutenụ m, unu nile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndị e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike. . . . Mụtakwanụ ihe n’ọnụ m . . . N’ihi na yoke nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.” (Mat. 11:28-30) Lee mmesi obi ike na-enye ume ọhụrụ nke ahụ bụ! N’ihi ya, anyị na-atụ aro ka ndị na-alụ di na nwunye chee echiche ime nanị otu ememe oriri.
15 Zere Omume Ụwa: Omume ụwa nke na-agbanye mkpọrọgwụ n’agbamakwụkwọ ndị Kraịst n’oge a bụ “itu” ego n’ememe oriri ma ọ bụ n’ememe alụmdi na nwunye ọdịnala. Ezi uche nke ndị Kraịst kwesịrị ime ka anyị zere omume ụwa a kpam kpam. Bible na-akatọ ụdị ngosi dị otú ahụ nke akụ̀ na ụba mmadụ. (1 Jọn 2:15-17) O kwekọghịkwa n’ụkpụrụ dị na Matiu 6:1-4.
16 A chọpụtawo na n’oge ememe oriri agbamakwụkwọ ụfọdụ ma ọ bụ n’ememe alụmdi na nwunye ọdịnala, ụfọdụ ụmụnna na-eji abụ Alaeze anyị eto ndị mmadụ. Ọ̀ bụ nke a ka e mepụtara abụ ọchịchị Chineke anyị iji ya na-eme? Ọ dịghị ma ọlị! Nke a ga-abụ ịkwalite ife ihe e kere eke ofufe, bụ́ nke Akwụkwọ Nsọ katọrọ n’ụzọ doro anya. (Rom 1:25) N’ezie, mgbe mmadụ na-enye ụmụ mmadụ otuto dị otú ahụ, ọ gaghị na-eme “ihe nile ka e wee nye Chineke otuto.”—1 Kọr. 10:31.
17 Mgbe ụfọdụ, a hụwo ka ndị a chụpụrụ achụpụ so ụmụnna na-akpakọrịta n’enweghị ihe mgbochi ọ bụla n’ụfọdụ oriri agbamakwụkwọ na ná nnọkọ ntụrụndụ ndị ọzọ. Bible katọrọ isoro ndị dị otú ahụ a chụpụrụ achụpụ ‘na-emekọ ihe.’ (1 Kọr. 5:9-13) Ọ bụ ọrụ dịịrị onye na-ahazi nnọkọ ijide n’aka na a chịkwara nnọkọ ahụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na ndị a chụpụrụ achụpụ gaje ịnọ n’ememe oriri ahụ, ọtụtụ ndị Kraịst pụrụ ikpebi na ha agaghị aga n’ihi ntụziaka Pọl nyere ná 1 Ndị Kọrint 5:11.
18 N’ihi ọnyà ndị a, anyị aghaghị ‘ilezi anya nke ọma otú anyị na-ejegharị, ọ bụghị dị ka ndị na-amaghị ihe, kama dị ka ndị maara ihe.’ Na nke a, nakwa n’okwu ndị ọzọ, anyị agatụghị ‘aghọ ndị na-enweghị uche, kama ndị na-aghọta ihe bụ́ ihe Onyenwe anyị na-achọ.’ (Efe. 5:15-17) Nke a na-achọ n’aka anyị inwe echiche ziri ezi n’ebe nnọkọ ntụrụndụ dị. Nnọkọ ntụrụndụ ndị a haziri ma lekọta nke ọma pụrụ ime ka e nwee ntụrụndụ bara uru. Otú ọ dị, ha abụghị oké ihe ná ndụ. Ọtụtụ ndị adịghị ekere òkè n’ozi ubi nakwa ná nzukọ n’ụzọ zuru ezu n’ihi itinye aka n’oriri agbamakwụkwọ. A na-adọ anyị aka ná ntị na na “mgbe ikpeazụ,” ndị mmadụ ga-abụ “ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya.” (2 Tim. 3:1, 4) N’ihi ya, ọ dị anyị mkpa ịtụle otú oge anyị na-etinye n’ịhazi na ịga nnọkọ ntụrụndụ hà. Ọ̀ pụrụ ịbụ na echiche a juru ebe nile n’ụwa taa amalitewo inwekwa mmetụta n’ahụ anyị, ma eleghị anya n’ụzọ ndị dị aghụghọ?
19 Olee nzọụkwụ ụfọdụ ndị dị irè anyị pụrụ iwere iji jide n’aka na anyị na-asọpụrụ Jehova n’oriri agbamakwụkwọ anyị? Ilu 15:22 na-egosi mkpa nke “izu nzuzo” dị iji zere “mmebi echiche.” Ọ bụrụ na ị na-eme ndokwa ịlụ nwunye, gịnị ma i soro ndị mụrụ nwa agbọghọ ị na-aga ịlụ kwurịta okwu, na-eme ka ha mara tupu oge eruo, ihe ndị ị pụrụ ime na ihe ndị ị na-apụghị ime? Ọ ga-adịkwa mma ime ka ha mara ihe ị ga-enwe ego imeli. Dị ka 1 Ndị Kọrint 7:29-31 na-echetara anyị, “e mewo ka oge a dị mkpụmkpụ.” N’ihi ya, ugbu a abụghị oge ‘iji ụwa emebiga ihe ókè, n’ihi na ụwa nke a na-agabiga agabiga.’
20 “Echiche nile nke onye dị nkọ na-eduba nanị n’uru,” ka Ilu 21:5 na-ekwu. Atụmatụ e leziri anyị mee tupu oge eruo, ibu ụzọ kpebie otú ememe oriri ahụ ga-eburu ibu na ihe a pụrụ ịchịkwa n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ga-enyere onye ọ bụla aka izere nsogbu ndị a na-enwe n’oriri agbamakwụkwọ nakwa ná nnọkọ ntụrụndụ ndị ọzọ. Ime atụmatụ tupu oge eruo bara uru ọbụna n’ihe banyere ụdị alụmdi na nwunye a ga-eme, ma ọ̀ ga-abụ nanị nke ọdịnala ka ọ̀ ga-abụ nke iwu tụpụtara.
21 Ná nchịkọta, dị ka ezi ndị Kraịst, anyị chọrọ ịnọgide na-adị ọcha ma na-ezere ụzọ ndị ụwa ná nnọkọ ntụrụndụ anyị. N’ịmara na “e mewo ka oge a dị mkpụmkpụ,” anyị kwesịrị itinye uche anyị n’ihe omume ime mmụọ, ọ bụghị n’ịchụso ihe ụtọ. Ka anyị nọgide na-ejide ‘ihe ndị ka mkpa n’aka,’ n’okwu a nakwa n’okwu ndị ọzọ. Ọbụna n’okwu onwe onye ndị dị ka oriri agbamakwụkwọ na nnọkọ oriri na ọṅụṅụ ndị ọzọ, anyị ga-eme nke ọma ịdị na-etinye ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ ka anyị wee nwee ike ịdị na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ n’ihe nile. Ka anyị kpebisie ike ‘ịghara ịbụrụ ndị ọzọ ihe ịsụ ngọngọ’ site n’ihe anyị na-eme ná nnọkọ oriri na ọṅụṅụ anyị. (Fil. 1:10, 11) Ka anyị nọ na-aṅa ntị na ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ a ma na-etinye ụkpụrụ ndị a n’ọrụ, anyị ga-achọta ezi ‘izu ike nye mkpụrụ obi anyị’ site n’ịṅa ntị n’òkù Jisọs ji ịhụnanya na-akpọ na Matiu 11:28-30.