Ịhụnanya Na-akpali Anyị Ime Nkwusa
1 Dị ka Ndịàmà Jehova, a maara anyị karịsịa maka ịbụ ndị nkwusa na-anụ ọkụ n’obi nke ozi Alaeze ahụ. (Mat. 24:14) Ihe karịrị nde mmadụ isii na-arụsi ọrụ ike n’ụwa nile; a na-atụkwasịkwa ndị ọhụrụ mgbe ha sonyeere anyị n’ime nkwusa. A na-edepụta ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa na-adabere n’òkè ha na-ekere n’ọrụ a.
2 Gịnị na-akpali anyị inye onwe anyị n’afọ ofufo maka ọrụ dị otú ahụ siri ike? A naghị amanye anyị amanye, were uru ihe onwunwe rata anyị, ma ọ bụ kwanyere anyị ùgwù pụrụ iche. Na mbụ, ụjọ tụrụ ọtụtụ n’ime anyị n’ihi na anyị chere na anyị erughị eru, ọha mmadụ anaghịkwa egekebe ntị. (Mat. 24:9) Ihe ka ọtụtụ ná ndị na-ahụ anyị adịghị aghọta ihe na-akpali anyị. A ghaghị inwe ihe dị ike mere anyị na-eji anọgidesi ike.
3 Ike nke Ịhụnanya: Jisọs mere ka a mara iwu kasịnụ n’ime iwu nile mgbe o kwuru na anyị ‘ga-ahụ Chineke n’anya, site n’obi anyị dum, mkpụrụ obi anyị dum, uche anyị dum, na ike anyị dum.’ (Mak 12:30) Ịhụnanya anyị n’ebe Jehova nọ sitere ná nghọta miri emi nke onye ọ bụ na ihe ọ bụ—Eze Na-achị Isi, Onye Okike nke ihe nile, onye “kwesịrị ịnara otuto nile na nsọpụrụ nile na ike nile.” (Mkpu. 4:11) Àgwà ya ndị magburu onwe ha enweghị atụ.—Ọpụ. 34:6, 7.
4 Ịmara Jehova na ịhụ ya n’anya na-akpali anyị ime ka ìhè anyị na-enwu n’ihu mmadụ. (Mat. 5:16) Ìhè anyị na-enwu mgbe anyị na-eto ya n’ihu ọha, na-ekwu banyere ọrụ ya ndị dị ebube, na-ezisakwa ozi banyere Alaeze ya. Dị nnọọ ka mmụọ ozi ahụ nke na-efe n’etiti eluigwe, anyị nwere “ozi ọma ebighị ebi izisara . . . mba nile ọ bụla na ebo nile ọ bụla na asụsụ nile ọ bụla na ndị nile ọ bụla.” (Mkpu. 14:6) Ịhụnanya anyị bụ ike na-akwali ọrụ nkwusa ahụ zuru ụwa ọnụ.
5 Ụwa na-ele ime nkwusa anyị anya dị ka “ihe nzuzu” nke e kwesịrị ileghara anya. (1 Kọr. 1:18) E mewo mgbalị n’ebe nile iji kwụsị ọrụ anyị. Ịhụnanya anyị nke na-eguzosi ike ewusiwo anyị ike ikwupụta, dị ka ndị ozi kwuru, sị: “Anyị apụghị ịghara ikwu ihe nile anyị hụrụ nụkwa. . . . Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.” (Ọrụ 4:20; 5:29) Ọrụ nkwusa ahụ nọgidere na-agbasa n’akụkụ nile nke ụwa n’agbanyeghị mmegide.
6 Ịhụnanya anyị n’ebe Jehova nọ yiri ọkụ na-ere ere nke na-arụgide anyị ikwusa ịdị mma ya n’ebe nile. (Jer. 20:9; 1 Pita 2:9) Anyị ga-anọgide ‘na-eme ka a mara omume Ya nile n’etiti ndị dị iche iche n’ihi na ihe ọkaka ka O meworo’!—Aịsa. 12:4, 5.