Ruo n’Obi Onye Ị Na-amụrụ Ihe
1 Tupu Jisọs arịgoro eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha zie ndị ọzọ ‘idebe’ ihe nile o nyere n’iwu. (Mat. 28:19, 20) Ọ bụrụ na mmadụ gaje ‘idebe’ iwu Kraịst, ihe ọmụma ahụ aghaghị iru n’obi ya. (Ọma 119:112) Olee otú ị pụrụ isi kpalie obi onye ị na-amụrụ Bible?
2 Kpee Ekpere Maka Nduzi Jehova: Ime ndị na-eso ụzọ bụ ọrụ sitere n’aka Chineke. Ọ bụ ngọzi ya dị mkpa maka inwe ọganihu ọ bụghị ikike anyị. (Ọrụ 16:14; 1 Kọr. 3:7) N’ihi ya, ikpe ekpere maka enyemaka Jehova n’izi ndị ọzọ eziokwu ahụ dị oké mkpa.—Aịsa. 50:4.
3 Chọpụta Ihe Onye ahụ Ị Na-amụrụ Ihe Kweere: Ịmata ihe ndị mmadụ kweere na ihe mere ha ji kwere ya pụrụ ime ka anyị mata ihe anyị ga-ekwu iji ruo n’obi ha. N’ihi gịnị ka otu ozizi karịsịa ji amasị onye a na-amụrụ ihe? Gịnị mere ka o kweta na ọ pụrụ ịbụ eziokwu? Ihe ọmụma dị otú ahụ pụrụ inyere anyị aka iji nghọta na-ekwu okwu.—Ọrụ 17:22, 23.
4 Wepụta Isi Ihe Ndị Ezi Uche Dị na Ha, Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ: Eziokwu ahụ aghaghị ịbụ nke ezi uche dị na ya nye onye a na-amụrụ ihe. (Ọrụ 17:24-31) Anyị aghaghị igosipụta ezi ihe mere anyị ji nwee olileanya anyị nwere. (1 Pita 3:15) Otú ọ dị, na-eme otú ahụ mgbe nile n’ụzọ obiọma na ndidi.
5 Jiri Ihe Atụ Mesie Ya Ike: Ọ bụghị nanị na ihe atụ na-eme ka ọ dịrị onye a na-amụrụ ihe mfe ịghọta ihe kama ha na-akpalikwa mmetụta uche. Ha na-emetụta ma uche ma obi. Jisọs jiri ha mee ihe ọtụtụ mgbe. (Mak 4:33, 34) N’ezie, iji dị irè, ihe atụ e ji mee ihe aghaghị ikwekọ n’ihe a na-atụle, o kwesịkwara inwe ihe jikọrọ ya na ndụ nke onye ahụ a na-amụrụ ihe.
6 Gosi Abamuru Dị n’Ịnakwere Eziokwu Ahụ: Ndị mmadụ chọrọ ịmata abamuru ndị dị n’itinye ihe ha na-amụta n’omume. Nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ịghọta amamihe dị n’ihe Pọl kwuru na 2 Timoti 3:14-17.
7 Enwela nkụda mmụọ ma ọ bụrụ na ụfọdụ anabataghị ihe i ziri ha. Ọ bụghị obi nile na-anabata ihe. (Mat. 13:15) Otú ọ dị, ụfọdụ ndị na-aghọ ndị kwere ekwe. (Ọrụ 17:32-34) Ka mgbalị ị na-eme iji jiri ozi ọma ahụ ruo n’obi ndị mmadụ nyere ọtụtụ ndị ọzọ aka ịnabata na ‘idebe’ ihe Jisọs nyere n’iwu.