Ọmụmụ Bible Ezinụlọ Chiri Anya—n’Ihi Gịnị Ka O Ji Dị Nnọọ Mkpa?
1 “Lee ekele m nwere n’ebe Jehova nọ maka ọzụzụ ahụ nke nne na nna m nyere m! Amaara m na ọ tụnyewo ụtụ n’ime ka m nọgide na-anọ nzukọ Jehova nso mgbe nile.” Okwu ndị ahụ otu onye so n’Òtù Na-achị Isi kwuru na-eme ka mmetụta na-adịte aka nke ọmụmụ Bible ezinụlọ chiri anya na-enwe pụta ìhè. N’agbanyeghị ndọlị a na-adọlị kwa ụbọchị iji nweta ihe e ji ebi ndụ, n’ihi gịnị ka a ga-eji nọgide na-enwechi ọmụmụ Bible ezinụlọ anya?
2 Ọ Na-egosi Inwe Ịhụnanya n’Ebe Chineke Nọ: Inwe ịhụnanya siri ike n’ebe Chineke nọ ga-akwali anyị ịgbaso ntụziaka ya nile. (1 Jọn 5:3) Nke a na-agụnye izi ụmụ anyị ihe site n’oge ha bụ nnọọ ụmụaka. (Deut. 6:5-7) Ụmụaka na-enwe agụụ ebumpụta ụwa nke ịbụ ndị e ziri ihe. Ha bụ ndị na-eleru nnọọ anya n’ihe nile anyị na-eme, na-anụkwa ihe nile anyị na-ekwu, ha na-adịkwa ngwa n’iṅomi ihe nlereanya anyị. (Ilu 20:7) Ya mere, ndị nne na nna aghaghị ibu ụzọ nwee àgwà Chineke n’obi ha. Igosipụta àgwà ndị dị otú ahụ nke Chineke bụ ihe àmà nke inwe ịhụnanya n’ebe Chineke nọ.−Ilu 27:11.
3 Ọ Na-abụ Ihe Nchebe: Ebe ọ bụ na ụmụ anyị enweghị ahụmahụ ná ndụ, Setan na ajọ ụwa ya na-elekwasị ha anya. A na-arụgide ha ịchụso ihe mgbaru ọsọ nke ịkpakọba ihe onwunwe na ihe ndị nke ụwa a. Enyemaka dị ụmụaka bụ́ ndị Kraịst mkpa iji lekwasị anya n’ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ, ma ọ́ bụghị ya, ha ga-aghọ ndị dị mfe nnweta.−Rom 12:2.
4 Ọmụmụ Bible ezinụlọ a na-enwechi anya pụrụ inyere ụmụaka aka isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị bara uru bụ́ ndị dabeere n’Akwụkwọ Nsọ. Ha na-agụnye inwe ọgụgụ Bible onwe onye chiri anya kwa ụbọchị; ịghọ onye nkwusa a na-emebeghị baptism, na iji nraranye na baptism sochie ya. Ihe mgbaru ọsọ ndị ọzọ pụrụ ịgụnye ije ozi dị ka ọsụ ụzọ inyeaka, ime mgbalị iji ruo eruo maka ije ozi oge nile dị ka ọsụ ụzọ, na Betel; ma ọ bụ ịga Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi. (Ọma 110:3) Obi abụọ adịghị ya na ihe mgbaru ọsọ ndị dị otú ahụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ na-enyere ụmụaka aka ịnagide ụwa nke jupụtara ná nsogbu taa.−Ọma 119:93.
5 Jiri Ikwesị Ntụkwasị Obi Na-ezi Ụzọ Chineke: Iwulite ezinụlọ siri ike n’ụzọ ime mmụọ chọrọ nkà na oge. Ekwela ka ihe ọ bụla gbochie gị iwepụta oge kwesịrị ekwesị iji wusikwuo ezinụlọ gị ike na iji zie ha ihe. Jide n’aka na mmadụ nile nọ n’ezinụlọ maara oge ọmụmụ ihe ezinụlọ na ihe a ga-atụle. Nyere ha aka ime ka ụzọ Chineke bụrụ nke ha. (Ọma 119:33, 34, 66) Jiri ikwesị ntụkwasị obi na-agbalị isoro ezinụlọ gị na-amụchi Bible anya. Ọ karịrị ‘uru’ ihe onwunwe ọ bụla.−Ọma 119:36.