Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/02 p. 1
  • Na-ebute Alaeze ahụ Ụzọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-ebute Alaeze ahụ Ụzọ
  • Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Nọgidenụ Buru Ụzọ Na-achọ Alaeze Ahụ”
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
  • Ndị Ohu Na-eje Ozi Na-arụ Ọrụ Bara Uru
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Ọ̀ Bụ Ihe Mgbochi Nye Ime Nkwusa?
    Ozi Alaeze Anyi—2001
  • “Ka Alaeze Gị Bịa” Bụ Ekpere Ọtụtụ Nde Mmadụ Na-ekpekarị
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2002
km 1/02 p. 1

Na-ebute Alaeze ahụ Ụzọ

1 Ibute Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ na ịnọgide na-eme otú ahụ adịghị mfe mgbe anyị dabara n’ajọ ọnọdụ akụ̀ na ụba na nsogbu ndị ọzọ. Olee otú anyị ga-esi na-ebute Alaeze ahụ ụzọ mgbe ihe isi ike bilitere? Gịnị ma ọ bụrụ na e nye anyị ọrụ nke ga-eme ka anyị ghara ịga nzukọ ma ọ bụ nke na-egbochi anyị ije ozi ubi? Alaeze ahụ ọ̀ ga-anọzi n’ọnọdụ nke abụọ ná ndụ anyị?

2 Okwukwe Siri Ike Dị Mkpa: Mgbe e lere okwukwe anyị ule n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ, anyị ekwesịghị ichefu nkwa Jehova na mmesi obi ike Jizọs nyere banyere nkwado Chineke ma ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ chọọ Alaeze ahụ. (Ọma 37:25; Mat. 6:31-34) Mmetụta nke ụwa na nrụgide dị iche iche pụrụ ime ka anyị ghara inwe echiche ziri ezi ma gbochie anyị idote Alaeze ahụ n’ọnọdụ mbụ. Ụfọdụ ndị ekwewo ka atụmanya nke ịbụ ndị a ma ama n’ọrụ ma ọ bụ nke inweta uru ego ghọọ ihe dị mkpa ná ndụ ha. Otú ọ dị, dị ka Pọl, ọ dị anyị mkpa ịchọpụta n’ụzọ ziri ezi ihe ndị dị mkpa n’ezie ná ndụ.—Fil. 3:7, 8.

3 Ọ̀ Dị Mkpa Ime Mgbanwe?: Otu onye nkwusa kwuru, sị: “Obi m dịkwasịrị n’achụmnta ego m—ọ bụ ihe m kasị hụ n’anya. Echere m na m ka pụrụ ịbụ Onyeàmà n’agbanyeghị na m na-etinye ihe ka ukwuu n’oge m n’ihe ndị metụtara achụmnta ego.” Ma uche ya nọgidere na-agwa ya na ọ pụrụ imekwu ihe iji jeere Jehova ozi. Ka oge na-aga, ọ hapụrụ achụmnta ego ahụ na-egbochi ọganihu ime mmụọ ya. Ozugbo ọ raara ndụ ya nile nye n’ọrụ Alaeze ahụ, o kwuru, sị: “Ugbu a, echere m na ndụ m dị mma n’anya Jehova, bụ́ ihe kasị mkpa n’ezie.”

4 N’ụzọ kwesịrị ịja mma, ọtụtụ ndị ahapụwo ọrụ ego na ohere ndị ha nwere inweta nnukwu uru ego, mee ka ndụ ha dị mfe, ma banye n’ozi oge nile. Ndị ohu na-eje ozi na ndị okenye bụ́ ndị na-akatabeghị ahụ, ndị na-alụbeghị nwunye bụ́ ndị gara Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi emewo ya, ha nwekwara ihe ùgwù ije ozi ndị dị mma. N’iṅomi ihe nlereanya magburu onwe ya nke Pọl, ha nwere afọ ojuju n’ezie n’inwe ihe ndị bụ́ isi e ji ebi ndụ.—1 Kọr. 11:1; 1 Tim. 6:6-8; Hib. 13:5.

5 Ọ bụ ezie na ụwa pụrụ ịkwa anyị emo n’ihi echiche anyị nwere banyere ndụ, anyị nwere ngọzi Jehova. (1 Kọr. 1:26-31) Ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe na-agba ume ịmara na ọ ga-eji anyị rụọ ọrụ n’ụzọ zuru ezu nakwa na ọ ga-enyere anyị aka ịrụzu ọrụ ya? Ohere anyị nwere ugbu a ịkpọsa Alaeze Chineke e guzobere eguzobe agaghị abịara anyị ọzọ. Ya mere, ugbu a bụ oge ibute Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ anyị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya