Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na March: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. A ga-eme mgbalị pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. April na May: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Ndị nkwusa kwesịrị ịgwa ndị nwe ụlọ na ha pụrụ inye onyinye maka ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ ma ọ bụrụ na ha achọọ. N’ebe e gosiri mmasị, nyefee broshuọ Na-achọ, na-eme mgbalị pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible. June: Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? ma ọ bụ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere akwụkwọ ndị a, nyefee broshuọ kwesịrị ekwesị nke ọgbakọ nwere.
◼ Ndị nkwusa chọrọ ije ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa April kwesịrị ime ndokwa ha ugbu a ma tinye akwụkwọ ha n’oge. Nke a ga-enyere ndị okenye aka ime ndokwa ndị dị mkpa maka ozi ubi ma nwee magazin na akwụkwọ ndị ọzọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ga-ezu ezu. E kwesịrị ịmara ọgbakọ ọkwa aha ndị nile a kwadoworo ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka kwa ọnwa.
◼ A ga-eme Ememe Ncheta na Thursday, March 28, 2002. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu na-enwe nzukọ na Thursday, a ga-ebugharị ya gaa n’ụbọchị ọzọ n’izu ma ọ bụrụ na ohere dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. Ọ bụrụ na nke a agaghị ekwe omume, ọ bụrụkwa na o metụtara Nzukọ Ije Ozi unu, a pụrụ ịgbakwụnye ihe omume ndị metụtara ọgbakọ unu karịsịa ná Nzukọ Ije Ozi ọzọ.
◼ Alaka ụlọ ọrụ adịghị ahụ maka ọda akwụkwọ nke ndị nkwusa n’otu n’otu. Onyeisi oche ndị nlekọta kwesịrị ime ndokwa maka ịma ọkwa kwa ọnwa tupu e zigara alaka ụlọ ọrụ ọda akwụkwọ nke ọgbakọ kwa ọnwa ka ndị nile nwere mmasị inweta akwụkwọ nke onwe ha nwee ike ịgwa nwanna na-elekọta akwụkwọ. Biko buru n’uche akwụkwọ ndị bụ́ ndị a na-emere ọda pụrụ iche.
◼ E kwesịrị ịtụ ọda akwụkwọ ndị e nwere na Braille site n’aka ọgbakọ. A ga-ezite Literature Request Form (S-14) dị iche maka akwụkwọ ndị e nwere na Braille, gụnyere aha na adres onye na-agụ Braille. Biko dee ya ATTENTION: BRAILLE DESK.
◼ Ọ dị mkpa ka ìgwè ruru mmadụ 20 ma ọ bụ karịa bụ́ ndị na-eme atụmatụ ileta ihe owuwu alaka ụlọ ọrụ buru ụzọ deta akwụkwọ ozi na Watch Tower Society, P.M.B. 1090, Benin City 300001, Edo State. Biko zitenụ ihe ọmụma banyere mmadụ ole na-abịanụ nakwa ụbọchị na oge ha ga-abịa nleta. Òtù ndị okenye nke ọgbakọ ndị na-eme nleta kwesịrị ijide n’aka na ha nwere ndepụta nke aha ndị nile so eme njem ahụ, na-edepụta n’ụzọ doro anya ndị bụ́ ndị e mere baptizim, ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim, na ndị nwere mmasị. Ọ dịghị onye ọzọ a ga-ekwe ka o soro ọgbakọ mee ngagharị ma e wezụga ndị aha ha dị n’akwụkwọ. Jidenụ n’aka na unu malitere njem n’oge ka unu wee nwee ike ịlaghachi ụbọchị ahụ mgbe unu mesịrị ngagharị. Jidenụ n’aka na ụgbọala unu dị mma. Tupu unu abịa nleta, biko tụleghachinụ Igbe Ajụjụ nke dị n’Ozi Alaeze Anyị nke March 1998 banyere ejiji kwesịrị ekwesị mgbe a na-eme nleta n’ebe obibi Betel.
◼ E nwere Ụlọ Nche ugbu a ná mbipụta mkpụrụ akwụkwọ gbara okpotokpo n’asụsụ Efịk, Igbo, na Yoruba.
◼ Mbipụta Ọhụrụ Ndị E Nwere:
A Satisfying Life—How to Attain It —Bekee
Does Fate Rule Our Lives?—Or Does God Hold Us Responsible? (maka ndị Alakụba) (Traktị nke 71) —Bekee
The Greatest Name (maka ndị Alakụba) (Traktị nke 72) —Bekee
Who Are Jehovah’s Witnesses? (maka ndị Alakụba) (Traktị nke 73)—Bekee
Hellfire—Is It Part of Divine Justice? (maka ndị Alakụba) (Traktị nke 74) —Bekee
Watch Tower Publications Index 1986-2000 —Bekee
Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst—Igbo