Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na May: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Ndị nkwusa kwesịrị ịgwa ndị nwe ụlọ na ha pụrụ inye onyinye maka ọrụ ahụ zuru ụwa ọnụ ma ọ bụrụ na ha achọọ. N’ebe e gosiri mmasị ná nletaghachi, gụnye onye ahụ n’ụzọ magazin. Nyefee broshuọ Na-achọ, n’ebumnobi nke ịmalite ọmụmụ Bible. June: Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? ma ọ bụ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere akwụkwọ ndị a, nyefee broshuọ kwesịrị ekwesị nke ọgbakọ nwere. July na August: A pụrụ iji nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ nwere peeji 32 mee ihe: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụru, na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs. A pụrụ inyefe broshuọ ndị a, Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!, na Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie? n’ebe o kwesịrị.
◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị ihe ndekọ ego ọgbakọ na June 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume mgbe ọ gasịrị. Mgbe e meworo nke a, maara ya ọgbakọ n’ọkwa mgbe a gụsịrị akụkọ ndekọ ego ọzọ.
◼ Onyeisi oche ndị nlekọta kwesịrị ịkpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ ma ọ bụrụ na o nwetaghị Ozi Alaeze Anyị nke ọgbakọ ha ka ọ na-erule ụbọchị 25 nke ọnwa bu ọnwa a ga-atụle ya ụzọ.