Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na September: A pụrụ iji nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ nwere peeji dị 32 mee ihe: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs. A pụrụ inyefe broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!, na Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie? n’ebe o kwesịrị. October: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Ebe e gosiri mmasị, nyefee broshuọ Na-achọ, na-etinye mgbalị pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible. November: Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? ma ọ bụ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. Ọ bụrụ na ndị mmadụ enwetawo ha, a pụrụ inyefe akwụkwọ mere ochie karị. December: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. N’ọnọdụ ya, ị pụrụ inyefe Akwukwọm nke Akụkọ Bible, ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala.
◼ E mewo mgbanwe ndị na-esonụ ‘n’Ebe Ndị A Ga-enwe Mgbakọ Distrikti nke 2002,’ bụ́ nke pụtara n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke May 2002. Onyeisi oche ndị nlekọta nke ọgbakọ ọ bụla o metụtara, bụ́ ndị a gbanwere mgbakọ ha kwesịrị ime ndokwa ka a maa ọkwa ná Nzukọ Ije Ozi na-esonụ mgbe a natasịrị mbipụta a nke Ozi Alaeze Anyị.
November 8-10, 2002
ENUGU 1 (Bekee) EE-12: Ayangba, Ogugu, Otukpa, Ubiadu, na Oguma Iso.; EE-17: Amanato, City Layout, Federal Housing, Hilltop, Ihe, Lakecity, Lakeside, Liberty, Odenigbo, na Trans Ekulu; EE-19: Mainland, Ndiagu, Onuasata, Real Estate, Station (Agbani), Uhueze, Umunevo, Urban, na Uwani
November 15-17, 2002
ILORIN 1 (Yoruba) Y-13A; Y-14: Akata, Idi Oro, Iresa Dudu, Jasenu, Odo Oba, Ojagbo, Onipele, na Osupa; Y-18: Ayeteju Amuro, Egbe, Isanlu, Mopa, na Odobukun
November 22-24, 2002
MGBOKO UMUORIA 7 (Igbo) IB-14: A ruo N; IB-16: A ruo O; IB-18: A ruo O E WEZỤGA Aleto, Odagwa, na Opobo Town; IB-35 E WEZỤGA Amaogudu, Ihuibe, Mpu, Amaeze (Ishiagu), Akpoha, na Amangwu Edda; IB-38: B ruo N
November 29–December 1, 2002
AGBOR 5 (Bekee) ME-10: Farm Settlement, Igwete, Ishimili, Ndemili, Ogbe Onishe, Olieogo, Umuekum, na Utagba Uno; ME-14: Ọgbakọ ndị a na-ekenyeghị n’Agbor 3; ME-15: A ruo N
ENUGU 4 (Igbo) IB-2: O ruo Z; IB-3; IB-34: B ruo Z; IB-35: Amangwu Edda
UBOGO 7 (Bekee) ME-6: A ruo B; ME-7: A ruo D; ME-9: A ruo Az; ME-10 E WEZỤGA Enede, Farm Settlement, Igwete, Ishimili, Ndemili, Ogbe Onishe, Olieogo, Oloa, Umuekum, na Utagba Uno
December 6-8, 2002
DALUWON 7 (Yoruba) Y-8: Ọgbakọ nile a na-ekenyeghị na Daluwon 1; Y-9: A ruo L
January 3-5, 2003
IGWURUTA ALI 10 (Bekee, Ụdị Asụsụ Ogbi nke America) EE-4: Unyengala; EE-22: M ruo Z; EE-23: J ruo Z; EE-28: C ruo K
◼ A na-echetara ndị okenye ịgbaso ntụziaka ndị e nyere na peeji nke 21-23 nke Ụlọ Nche April 15, 1991, banyere ndị ọ bụla a chụpụrụ n’ọgbakọ ma ọ bụ ndị kewapụrụ onwe ha bụ́ ndị pụrụ ịchọ ka a nabataghachi ha.
◼ Alaka ụlọ ọrụ adịghị ahụ maka ọda akwụkwọ nke ndị nkwusa n’otu n’otu. Onyeisi oche ndị nlekọta kwesịrị ime ndokwa ka a maa ọkwa n’ọnwa ọ bụla tupu e zigara alaka ụlọ ọrụ ọda akwụkwọ nke ọgbakọ kwa ọnwa ka ndị nile nwere mmasị inweta akwụkwọ nke ha nwee ike ịgwa nwanna na-elekọta akwụkwọ. Biko buru n’uche akwụkwọ ndị a na-emere ọda pụrụ iche.
◼ Mgbe ụfọdụ, ọgbakọ ma ọ bụ ndị nkwusa n’otu n’otu na-eche okwu ndị metụtara iwu ihu n’ihe metụtara ofufe anyị na-efe Jehova. E bipụtara akwụkwọ nta bụ́ Defending and Legally Establishing the Good News na 1950 iji nye aka n’okwu ndị a. Ọ bụ ezie na e ji akwụkwọ nta a mee ihe n’oge ndị gara aga, ihe ọmụma ndị metụtara iwu bụ́ nke dị n’ime ya abụkwaghị ihe ọmụma kasị ọhụrụ. N’ihi ya, ndị nkwusa n’otu n’otu ma ọ bụ òtù ndị okenye ekwesịghị ịnwa ime ihe n’ihe banyere okwu ndị metụtara iwu dabere n’ihe ọmụma dị n’ime akwụkwọ nta ahụ.
◼ A ga-ekwu okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge Ememe Ncheta 2003 na Sunday, April 27. A ga-ama ọkwa isiokwu nke okwu ahụ na ihe ndepụta ya ka oge na-aga. Ọgbakọ ndị ga-enwe onye nlekọta sekit ma ọ bụ mgbakọ ná ngwụsị izu ahụ, ga-ekwu okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche n’izu nke na-esonụ. Ọ dịghị ọgbakọ kwesịrị ikwu okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche tupu April 27.