Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na December: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. N’ọnọdụ ya, ị pụrụ inyefe Akwukwọm nke Akukọ Bible, ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu enweghị nke ọ bụla n’ime akwụkwọ ndị ahụ a pụrụ inyefe n’ọnọdụ nke ahụ a ga-enyefe n’ọnwa ahụ, biko chọọnụ ma ọgbakọ ndị dị unu nso hà nwere nke unu pụrụ inweta iji mee ihe. January: Akwụkwọ ọ bụla e bipụtara tupu 1988 nke ọgbakọ nwere. Ọ bụrụ na unu enweghị nke ọ bụla n’ime ndị a, biko chọọnụ ma ọgbakọ ndị dị unu nso hà nwere akwụkwọ ndị ahụ meworo ochie karị ndị unu pụrụ inweta iji mee ihe. Ọgbakọ ndị na-enweghị akwụkwọ ndị meworo ochie nwere peeji 192 pụrụ inyefe Mankind’s Search for God. A ga-eme mgbalị pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi.
◼ A ga-ezitere ọgbakọ unu akwụkwọ ịkpọ òkù Ememe Ncheta maka 2003 n’oge na-adịghị anya.
◼ Ndị nkwusa nile e mere baptizim bịara Nzukọ Ije Ozi n’izu January 6 pụrụ inweta kaadị Advance Medical Directive/Release na Identity Card maka ụmụ ha.
◼ A na-eme mgbanwe n’ụzọ a ga-esi na-eduzi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’oge nleta onye nlekọta sekit. Malite na January 2003, mgbe a bụsịrị abụ ma kpee ekpere mmeghe, a ga-eduzi ụlọ akwụkwọ ahụ ruo ihe dị ka minit 25. A ga-ekwu okwu ga-ewe minit ise banyere otu nkà okwu, okwu izi ihe nke ga-ewe minit iri, na isi ihe ndị sitere na Bible nke ga-ewe minit iri. A gaghị eme ihe omume nke 2, 3, na nke 4. Nzukọ Ije Ozi nke ga-ewe minit iri atọ ga-esochi ụlọ akwụkwọ ahụ. Mgbe a bụsịrị abụ, a ga-enwe ihe omume ga-ewe minit iri atọ nke onye nlekọta sekit ga-eme, nke abụ na ekpere mmechi ga-esochi.