Akwụkwọ Ozi Sitere n’Aka Òtù Na-achị Isi
Ezi Ụmụnna Anyị:
Lee ihe obi ụtọ ọ bụ idetara unu akwụkwọ ozi! Anyị na-aja unu mma maka ịhụnanya na mmụọ ịchụ onwe onye n’àjà nke unu nọgideworo na-egosipụta. Ọ bụrụ na unu elee anya na Yearbook nke afọ a, unu ga-ahụ na a rụzuru ọtụtụ ihe ọma n’ime afọ ije ozi gara aga. Ọzọkwa, anyị etinyewo ihe karịrị otu ijeri awa n’ọrụ ime nkwusa na izi ihe, na-agba ndị mmadụ ume kpọmkwem ịbịaru Jehova nso. Ọ́ bụghị ihe ùgwù ịbụ ndị ha na Chineke anyị dị ebube na Nna anyị nke eluigwe na-arụkọ ọrụ?—1 Kọr. 3:9.
Ka anyị na-ele anya n’ọrụ ndị dị n’ihu, anyị nwere obi ike na unu ga-anọgide na-eṅomi ịnụ ọkụ n’obi na okwukwe nke ndị ohu Chineke, dị ka a kọwara ha n’ime Bible. Dị ka ihe atụ, ọ gụsiri Pọl onyeozi agụụ ike ịbụ onye ozi dị irè ruo n’ókè o kwere mee n’ịkwalite ihe ndị metụtara Alaeze. Dị ka ihe àmà na-egosi, ọ bụ n’afọ ikpeazụ ọ nọrọ n’Efesọs ka o dere akwụkwọ ozi mbụ o degaara ọgbakọ Ndị Kraịst dị na Kọrint. Banyere atụmatụ ya n’oge ahụ, o dere, sị: “M na-anọgide n’Efesọs ruo n’ememe Pentikọst; n’ihi na e megheworo m ọnụ ụzọ buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ, ma e nwere ọtụtụ ndị mmegide.”—1 Kọr. 16:8, 9.
Pọl meburu atụmatụ ịga Masedonia na Kọrint. Otú ọ dị, ọ ghọtara na e nwere ohere nke ịrụ ọrụ bara uru ma ọ nọtụkwuo n’Efesọs. Pọl na-eme mgbanwe; ọ hụrụ ohere dị mma ọ pụrụ iji kwalite ihe ndị metụtara Alaeze n’ebe ọ nọ kpọmkwem, n’ihi ya, o mere mgbanwe n’usoro ihe omume ya dị ka o kwesịrị. E megheworo ya ọnụ ụzọ buru ibu nke na-eduga n’ọrụ, ọ gụsịkwara Pọl agụụ ike iji ohere ahụ mee ihe.
Ime otú ahụ ga-achọ ọrụ buru ibu—ma ikwusa ozi ọma ma iwulite ọgbakọ dị n’Efesọs. Pọl mesịrị gwa ndị okenye nọ n’ọgbakọ dị n’obodo ahụ, sị: “[Alaghị m] azụ ịgwa unu nke ọ bụla n’ime ihe ndị bara uru ma ọ bụ izi unu ihe n’ihu ọha nakwa site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Kama agbasiiri m ma ndị Juu ma ndị Grik àmà ike banyere nchegharị n’ebe Chineke nọ na okwukwe n’Onyenwe anyị Jizọs.”—Ọrụ 20:20, 21.
N’otu aka ahụ, ọtụtụ n’ime unu, ezi ụmụnna anyị, ejiriwo ohere ndị e megheere unu mee ihe. N’ime afọ ije ozi gara aga, nkezi nke 798,938 nwere ike ịhazi ihe omume ha iji kere òkè n’ụdị ụfọdụ nke ozi ọsụ ụzọ. Ụfọdụ n’ime unu agawo ebe ndị dị nnọọ anya iji jee ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ. Unu ji ịnụ ọkụ n’obi na-ezisa ozi ọma ma na-ewuli ọgbakọ dị iche iche elu. Ndị ọzọ n’ime unu amụwo asụsụ ọzọ ka unu wee nwee ike inyere ndị na-asụ asụsụ mba ọzọ bi unu nso aka. Ọtụtụ ndị ọzọkwa ahaziwo ihe omume ha iji rụọ ọrụ n’ókèala a na-eketaghị ọrụ ma ọ bụ jee ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Ụfọdụ ndị achọpụtawo ọbụna na e megheworo ha ọnụ ụzọ buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ n’ụlọ akwụkwọ, n’ụlọ ọrụ ha, ma ọ bụ n’ọnọdụ ndị ọzọ a pụrụ iji gbaa àmà dị irè, dị ka iji telifon eme ihe. Ahụmahụ ndị e nwetara gburugburu ụwa na-egosi na ndị Chineke, ma nwata ma okenye, ji ịnụ ọkụ n’obi na-achọ ma na-enweta ohere iji kụbanye ihe ọmụma nke eziokwu ahụ n’ime ndị mmadụ n’ebe nile.
Jidenụ n’aka na Jehova na-ahụ ma nwee obi ụtọ dị ukwuu ná mgbalị unu na-eme. Bible na-ekwu, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.” (Hib. 6:10) Nọgidenụ na-amụrụ anya maka ohere ndị unu pụrụ iji kwalite ofufe dị ọcha. Ụfọdụ n’ime unu pụrụ inwe ike ịmụba ozi ha. Anyị nile pụrụ ịgbalịsi ike ime ka ozi anyị dịkwuo irè.
Anyị adịghị arụ ọrụ ime nkwusa e nyere anyị n’enwetaghị mmegide. Cheta na mgbe Pọl kwusịrị okwu banyere ọnụ ụzọ buru ibu nke na-eduga n’ọrụ nke e meghewooro ya, o dere, sị: “E nwere ọtụtụ ndị mmegide.” Nye Pọl, ndị mmegide ahụ gụnyere ma ndị Juu ma ndị Jentaịl, ụfọdụ ndị bụ́ ndị wakporo ya ihu na ihu na ndị ọzọ bụ́ ndị ji aghụghọ gbaa izu megide ya.—Ọrụ 19:24-28; 20:18, 19.
Anyị na-eche ihe yiri ya ihu taa. Ka anyị na-abịaru mbibi nke ajọ usoro ihe a nso, anyị na-atụ anya mmegide ka ukwuu. “Oké iwe” ji Setan, ọ bụkwa ndị na-ejere Chineke ozi ka ọ na-ewesa iwe ahụ karịsịa. (Mkpu. 12:12) Echefula mgbe ọ bụla na ọ bụ Setan bụ “onye na-achị ụwa.” Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “A sị na unu bụ akụkụ nke ụwa, ụwa gaara ahụ ihe bụ́ nke ya n’anya. Ma n’ihi na unu abụghị akụkụ nke ụwa, kama ahọpụtawo m unu n’ụwa, n’ihi nke a ụwa na-akpọ unu asị.”—Jọn 14:30; 15:19.
Anyị ekpebisiwo ike na anyị agaghị ekwe ka onye ọ bụla mee ka okwukwe anyị nwere n’ebe Chineke nọ daa mbà ma ọ bụ dọlaa anyị azụ n’ọrụ nkwusa anyị. Anyị maara na a ga-anọgide na-enwe ndị na-awakpo anyị ma na-agba izu megide anyị. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị na-aga n’ihu n’ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ, na-enwe obi ike na Jizọs ga-egwepịa Setan na usuu ndị na-esonyere ya mgbe oge Jehova ruru. Ndị mmegide emeghị ka Pọl onyeozi mechie ọnụ ya; ha adịghịkwa eme ka ndị ohu Jehova mechie ọnụ ha taa. N’agbanyeghị iwe Setan na ịkpọasị nke ụwa, mmụọ Jehova na-arụsi ọrụ ike n’etiti ndị Ya. Lee ihe na-enye ọṅụ ọ bụ ịmara na ọnụ ọgụgụ nke ndị na-ekwusa ozi ọma ahụ eruwo ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu nke bụ́ 6,304,645!
Ekpere anyị bụ ka unu nọgide jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ na-eme ihe iji kwalite ihe ndị metụtara Alaeze Jehova nke dị ebube. Jidenụ n’aka na anyị nwere mmasị ịhụnanya n’ebe unu nọ n’otu n’otu ka anyị ji ‘otu ubu’ na-ejere Chineke Kasị Ihe Nile Elu, bụ́ Jehova, ozi.—Zef. 3:9.
Ụmụnna unu,
Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova