Jiri Akwụkwọ Fee Chineke Ofufe Na-eduzi Ọmụmụ Bible
E mere akwụkwọ bụ́ Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe iji nyere ndị ọhụrụ aka inwe ọganihu n’eziokwu ahụ na ime ka ekele ha nwere n’ebe Jehova nọ na n’ebe nzukọ ya dị bukwuo ibu. A pụrụ iji ya mee ihe dị ka akwụkwọ nke abụọ ndị a na-eduziri ọmụmụ Bible ga-amụ. Ozi Alaeze Anyị nke June 2000, peeji nke 4, kọwara, sị: “Ọ bụrụ na o doro anya na onye ahụ na-enwe ọganihu, ọ bụ ezie na ọ bụ nwayọọ nwayọọ, nakwa na ọ na-enwe ekele maka ihe ọ na-amụta, mgbe ahụ gaa n’ihu n’ọmụmụ Bible ahụ site n’ịmụ akwụkwọ nke abụọ mgbe a mụchara broshuọ Na-achọ na akwụkwọ Ihe Ọmụma. . . . N’ọnọdụ nile, a ga-ebu ụzọ mụọ broshuọ Na-achọ na akwụkwọ Ihe Ọmụma. E kwesịrị ịgụrụ ọmụmụ Bible, nletaghachi, na oge ndị e tinyere iji gaa n’ihu n’ọmụmụ ihe ahụ ma nye ha n’akụkọ ozi ma ọ bụrụgodị na e meela onye ahụ a na-amụrụ ihe [baptizim] tupu ọ mụchaa akwụkwọ nke abụọ.”
Olee ndị ọzọ pụrụ irite uru n’ọmụmụ Bible ahụ a ga-eji akwụkwọ Fee Chineke Ofufe duzie? Otu isiokwu ahụ gara n’ihu ikwu, sị “Ọ bụrụ na ị maara ụfọdụ ndị mụrụ [broshuọ Na-achọ na] akwụkwọ Ihe Ọmụma n’oge gara aga ma ha enweghị ọganihu ruo n’ókè nke ime nraranye na ịbụ ndị e mere [baptizim], ị pụrụ ịchọ ime ihe iji hụ ma hà ga-achọ ịmaliteghachi ọmụmụ Bible ha.” Ka anyị mee mgbalị pụrụ iche iji akwụkwọ Fee Chineke Ofufe malitere ndị dị otú ahụ ọmụmụ ihe n’April nakwa na May.