Ntụleghachi A Ga-eme N’ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-eji ọnụ tụlee ajụjụ ndị na-esonụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ga-amalite n’April 28, 2003. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi ga-ewe minit 30 dabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu March 3 ruo April 28, 2003. [Ihe Ịrịba Ama: N’ebe ndị a na-enweghị ebe e zoro aka na ha ná ngwụsị ajụjụ ọ bụla, ọ ga-adị mkpa ka i mee nnyocha nke gị iji chọta azịza ha.—Lee akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 36-37.]
NKÀ OKWU
1. Olee ihe ndị pụrụ ime ka okwu ghara ịdị na-aga mmadụ were were n’ọnụ? [be p. 93]
2. Eziokwu Ka Ọ̀ Bụ Ụgha: E kwesịrị izere ime nkwụsịtụ ebe ọ bụ na ọ pụrụ ime ka uche ndị mmadụ si n’ihe a na-ekwu pụọ ma nye ha ohere ịnapụ ọkà okwu okwu n’ọnụ. Kọwaa.
3. Olee uru imesi echiche okwu ike n’ụzọ kwesịrị ekwesị baara ọkà okwu ma ọ bụ onye na-agụpụta ihe n’ihu ọha? (Neh. 8:8) [be p. 101]
4. Olee otú mmadụ pụrụ isi mụta imesi echiche okwu ike n’ụzọ kwesịrị ekwesị? [be p. 102-103]
5. Olee echiche ndị bụ́ isi e kwesịrị imesi ike mgbe a na-agụpụta ihe dị n’akwụkwọ n’oge a na-enwe ọmụmụ Bible ma ọ bụ ná nzukọ ọgbakọ? [be p. 105]
IHE OMUME NKE 1
6. Gịnị ka ndị mụrụ ụmụ pụrụ ime iji zụọ ụmụ ha “ka ha wee nụ, ka ha wee mụtakwa” ihe ná nzukọ Ndị Kraịst? (Deut. 31:12) [be p. 16]
7. Gịnị bụ paradaịs ime mmụọ ahụ? [w01 3/1 p. 8-10]
8. Olee otú Ilu 8:1-3 si egosi na amamihe Chineke dị n’ebe ọ ga-eru mmadụ nile aka, dịkwa ka Ndị Kọlọsi 2:3 si kwuo, olee ebe a pụrụ inweta ya? [w01 3/15 p. 25, 28]
9. Olee otú anyị pụrụ isi mee ka a mara aha Chineke? (Jọn 17:6) [be p. 273-275]
10. Olee ihe ndị ọ dị mkpa ka ndị mmadụ mara banyere ‘ozi ọma nke alaeze’ ahụ? (Mat. 24:14) [be p. 279-280]
ỌGỤGỤ BIBLE KWA IZU
11. (a) Na narị afọ mbụ, gịnị bụ “ihe arụ” ahụ a kpọtụrụ aha na Mak 13:14? (b) Gịnị ka nguzo o ‘guzo n’ebe nsọ’ na-ezo aka na ya?
12. Olee otú Oziọma Luk si egosi na Jizọs bụ onye nketa nke ocheeze Devid n’ụzọ ọmụmụ? (Luk 3:23-38) [w92 10/1 p. 9 para. 3]
13. Gịnị ka okwu Jizọs e dekọrọ na Luk 12:2 pụtara?
14. N’ilu Jizọs banyere mkpụrụ ego drakma ahụ furu efu, n’ihi gịnị ka mmeghachi omume ndị mmụọ ozi ji bụrụ ihe dị ịrịba ama? (Luk 15:10) Olee otú ihe nlereanya ha kwesịrị isi metụta anyị?
15. Olee ọgbụgba ndụ abụọ a kpọtụrụ aha na Luk 22:29?