Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/03 p. 2-7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 4/03 p. 2-7

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’April na May: Nyefee Ụlọ Nche na Teta! Mgbe a na-aga nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, nke pụrụ ịgụnye ịkpọtụrụ ndị bịara Ememe Ncheta ma ọ bụ ihe omume ndị ọzọ nke ọchịchị Chineke ma ha adịghị eso ọgbakọ akpachi anya, lekwasị anya n’inyefe Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe. E kwesịrị ime mgbalị siri ike iji malite ọmụmụ Bible ebe obibi, karịsịa ma ọ bụrụ na ụfọdụ ndị amụworị akwụkwọ Ihe Ọmụma na broshuọ Na-achọ. June: Nyefee akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ broshuọ Na-achọ. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ enwetawo akwụkwọ ndị a, nyefee broshuọ ọzọ kwesịrị ekwesị nke ọgbakọ nwere. July na August: A pụrụ iji nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ nwere peeji 32 mee ihe: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị Ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs, na Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?

◼ Ọ dị mkpa ka alaka ụlọ ọrụ na-enwe ihe ndekọ kasị ọhụrụ nke adres na nọmba telifon nke ndị isi oche ndị nlekọta na nke ndị odeakwụkwọ nile. Ọ bụrụ na e nwee mgbanwe mgbe ọ bụla, Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwesịrị idejupụta fọm bụ́ Presiding Overseer/Secretary Change of Address (S-29), bịanye aka na ya, ma zitere ya alaka ụlọ ọrụ ozugbo. Nke a na-agụnye mgbanwe ọ bụla e nwere na nọmba code telifon nke ógbè.

◼ Ndị odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ịdị na-enwe mgbe nile ọnụ ọgụgụ zuru ezu nke fọm Application for Regular Pioneer Service (S-205) na Application for Auxiliary Pioneer Service (S-205b). A pụrụ iji Literature Request Form (S-14) tụọ ọda ha. Nwee, ma ọ dịkarịa ala, nke ga-ezu ruo otu afọ. Nyochagharịa akwụkwọ ndejupụta dum e tinyere maka ịsụ ụzọ oge nile iji jide n’aka na e denyezuru ihe nile. Ọ bụrụ na ndị na-etinye akwụkwọ apụghị icheta kpọmkwem ụbọchị e mere ha baptizim, ha kwesịrị ikwu otu ụbọchị o yikarịrị ka ọ̀ bụ ya ma detuo ya edetuo.

◼ Mgbe ọ bụla atụmatụ ị na-eme maka ime njem na-agụnye ije nzukọ ọgbakọ, mgbakọ, ma ọ bụ mgbakọ distrikti ná mba ọzọ, ọ ghaghị ịbụ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta ọrụ ahụ ná mba ahụ ka ị ga-esi n’aka ya nweta ihe ọmụma banyere ụbọchị, oge, na ebe ndị a na-enwe ha. A na-edepụta adres alaka ụlọ ọrụ dị iche iche na peeji ikpeazụ nke Yearbook kasị ọhụrụ.

◼ Na May 31, 2003, a ga-emechi ihe owuwu Betel. N’ihi ya, biko unu abịala maka ngagharị ma ọ bụ inweta akwụkwọ n’ụbọchị a.

◼ Kaseti Vidio Ọhụrụ E Nwere: Transfusion-Alternative Health Care—Meeting Patient Needs and Rights—Bekee

◼ Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị E Nwere ná Mkpụrụ Akwụkwọ Ndị Ìsì: Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II (mpịakọta anọ)—Grade-two, Bekee

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya