Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?
1 Nke a bụ isiokwu broshuọ ọhụrụ e wepụtara ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi” anyị nwere n’oge na-adịbeghị anya. Ka anyị matakwuo ngwá ọrụ ọhụrụ a mara mma, nke dịkwa irè nke ọma, nke a kwadebere karịsịa maka ókèala Africa. Ị pụrụ iji ya mụọrọ ndị ezinụlọ gị ihe, ị pụkwara iji ya duziere ndị ọzọ ọmụmụ Bible. Obi abụọ adịghị ya na ọ ga-abụ otu n’ime ngwá ọrụ anyị ndị bụ́ isi maka iji malite ọmụmụ Bible! Ị̀ gụwo ya nke ọma? Biko mee otú ahụ.
2 Rịba ahịrịokwu abụọ mbụ dị n’Ihe Ọmụmụ nke 1 ama: “Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ọ bụla nọ n’Africa kwetara na ife Chineke dị mkpa. Ma, mmadụ nile ekwekọrịtachaghị n’ihe metụtara otú a ga-esi efe ya.” Ọ kọwara okpukpe ọdịnala nke ndị Africa nke ọma na ụjọ a na-atụkarị banyere ịta amoosu. Ọ ga-enyere ndị mmadụ aka n’otu n’otu ịmata otú ha ga-esi họrọ ezi okpukpe n’agbanyeghị na e nwere okpukpe dịgasị iche iche na-akpata mgbagwoju anya ndị gbara ha gburugburu, karịsịa ebe a na-enwe ọtụtụ ndị ọhụrụ na-amalite kwa ụbọchị. O nwere ọtụtụ ihe osise mara mma na ihe atụ ndị dị mfe nghọta. O nwere ozi dị nnọọ oké mkpa maka ndị Africa! Tụlee ụfọdụ n’ime isiokwu ndị a tụlere na broshuọ ọhụrụ a:
● Ihe Ọmụmụ nke 3 kọwara n’ụzọ doro anya ndị Jehova, Jizọs, na ndị mmụọ ozi bụ, gosikwa otú Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya si malite na otú ha si “na-eduhie ụwa dum mmadụ bi.”—Mkpu. 12:9.
● Ihe Ọmụmụ nke 4 na-ekwu banyere ife ndị nna ochie ofufe na omume ndị e jikọtara ha na ya, ihe mere ndị Africa ji kwere na ya, na ihe mere o ji bụrụ ihe na-abaghị uru ma dị nnọọ ize ndụ. Ọ na-akọwa n’ụzọ dị mfe ihe mere mkpụrụ obi ma ọ bụ mmụọ na-ejighị anọgide na-adị ndụ mgbe mmadụ nwụsịrị.
● Ihe Ọmụmụ nke 5, nke isiokwu ya bụ “Eziokwu Banyere Ime Anwansi, Ịgba Afa, na Ịta Amoosu,” na-egosi otú nkwenkwe ndị dị otú a si gbanyesie mkpọrọgwụ ike n’ọdịbendị ndị Africa. Paragraf nke 4 na-ekwu, sị: “A na-ekwu na ndị amoosu na-ahapụ ahụ́ ha n’abalị fepụ, ịga soro ndị amoosu ndị ọzọ nwee nzukọ ma ọ bụ ịga jiri nwayọọ gbuo ndị mmadụ.” Olee otú anyị pụrụ isi gosi na nke a bụ ụgha? Paragraf nke 10-12 zara ya. Paragraf nke 7 na-egosi otú Setan si aghọgbu ndị mmadụ iche na ya nwere ike karịa otú o nwere n’ezie. Paragraf nke 15-17 na-egosi na Jehova dị nnọọ ike karịa ndị mmụọ ọjọọ, n’ihi na o nwere ike ime ihe nile. Paragraf nke 7 na nke 8 na-egosi na nkwenkwe bụ́ na ọ dịghị ihe na-emenụ ma ọ bụ na ọ dịghị onye ga-anwụ ma ọ bụghị site n’ike dị omimi ezighị ezi.
● Ihe Ọmụmụ nke 6-9 na-enyere ndị mmadụ aka ịhụ n’ụzọ doro anya otú ha ga-esi amata ọdịiche dị n’etiti ezi okpukpe na okpukpe ụgha nile e nwere. Paragraf nke 9-11 n’Ihe Ọmụmụ nke 7 na-ekpughe na nzọrọ nke chọọchị ndị dị n’Africa na-azọrọ na ha na-arụ ọrụ ebube bụ ihe sitere n’ike ịta amoosu nke ndị mmadụ na-enwe mmasị ikwere na ha. E nyere agbamume dị mma n’Ihe Ọmụmụ nke 8 ka e soro ezi okpukpe na-akpakọrịta.
3 Ọ̀ bụ na i kwetaghị na broshuọ ọhụrụ a ga-abụ ngwá ọrụ dị irè iji mee ihe n’ọrụ ụlọ n’ụlọ, nletaghachi, na iduzi ọmụmụ Bible? Ị pụrụ iche na ọ dị mma iji ya mụọrọ onye na-akwadebe ime baptizim ihe. Nke a ga-enye aka ma ọ bụghị iwu na a ga-eme otú a. Ọ ga-aba uru n’ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ. N’ihi njupụta òtù nzuzo jupụtara n’ụlọ akwụkwọ dị iche iche ná mba a, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ka ndị nne na nna soro ụmụ ha mụọ broshuọ a nke ọma. Ọ ga-echebe ha pụọ n’aka ndị na-agbalị ime ka ha tinye aka ná mgbaasị site n’ikwu okwu banyere ya dị ka ihe ga-echebe ha ma nyere ha aka inweta akara mmụta ka mma. A pụrụ iji ya mụọrọ ndị ka na-atụ ụjọ maka ịta amoosu, ma ọ bụ ndị na-atụ ụjọ na ọ bụ mmadụ “na-akpatara” ha ọrịa ihe. Ọ bụ otu n’ime akwụkwọ ndị a ga-enyefe na June. Nọgide jiri ya na-eme ihe n’ụzọ zuru ezu!