Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Mgbakọ Sekit
1 Onyenwe anyị buru amụma na a ga-akpagbu ndị na-eso ụzọ ya. (Mat. 24:9) Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ule anya? Gịnị ga-enyere anyị aka ịtachi obi ná mkpagbu? Usoro ihe omume mgbakọ sekit nke afọ 2004 ga-aza ajụjụ ndị a. Isiokwu ya bụ “Na-aṅụrịnụ Ọṅụ n’Olileanya Ahụ. Na-atachinụ Obi n’Ime Mkpagbu.”—Rom 12:12.
2 Usoro Isiokwu Abụọ Ọtụtụ Ndị Ga-ekwu: Usoro isiokwu nke mbụ ọtụtụ ndị ga-ekwu, nke isiokwu ya bụ́ “Jiri Ntachi Obi Na-amị Mkpụrụ,” ga-atụle ụzọ ndị anyị na-esi amị mkpụrụ. A ga-agba ọtụtụ ndị nkwusa ajụjụ ọnụ banyere otú ha na-esi eji echiche nke ịdị ngwa eme nkwusa ma na-ezi ihe. Ndị mụrụ ụmụ karịsịa kwesịrị ịṅa ntị n’isiokwu bụ́ “Mgbe Jehova Dọrọ Anyị Aka ná Ntị,” bụ́ nke ga-atụle otú ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi soro ụmụ ha tụgharịa uche. Onye ga-ekwu okwu ikpeazụ n’usoro isiokwu ahụ ọtụtụ ndị ga-ekwu ga-eme ka ọ pụta ìhè ihe anyị na-aghaghị ime ka ụwa ghara inwe mmetụta na-adịghị mma n’ebe anyị nọ, gharakwa ime ka anyị ghọọ ndị na-adịghị amị mkpụrụ.—Mak 4:19.
3 “Jiri Ntachi Obi Na-agba Ọsọ Ahụ” bụ isiokwu nke usoro isiokwu nke abụọ ọtụtụ ndị ga-ekwu. Ọ ga-eme ka otú ụzọ ndụ anyị si yie ọsọ asọmpi doo anya. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị na-agba ọsọ dị ka ụkpụrụ nduzi si dị? Olee otú anyị pụrụ isi yipụ ihe ọ bụla dị arọ ma ghara inwe ike ọgwụgwụ n’ọsọ nke ndụ ahụ? Ndụmọdụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ nke bịara n’oge ya, bụ́ nke a ga-enye, ga-enyere anyị aka ịnọgide jiri ntachi obi na-agba ọsọ ahụ.
4 Ntachi Obi Na-arụpụta Ihu Ọma Chineke: Okwu ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ga-ekwu ga-ewusikwu okwukwe nke ndị ga-ege ntị ma tinye ndụmọdụ ha n’ọrụ ike. Isiokwu nke otu n’ime okwu ndị onye nlekọta distrikti ga-ekwu bụ “Ntachi Obi Na-eduga n’Ọnọdụ A Nwapụtara Anwapụta.” Okwu ihu ọha ga-aza ajụjụ bụ́: N’aha ònye ka mba dị iche iche kwesịrị inwe olileanya, gịnịkwa ka ọ gụnyere? Okwu mmechi, bụ́ “Site n’Ịtachi Obi Unu Ga-enweta Mkpụrụ Obi Unu,” ga-atụle otú Jizọs si nwee ike ịtachi obi n’ikpe na-ezighị ezi n’enweghị obi ilu.
5 Cheta iweta akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi nke gị na Ụlọ Nche a ga-amụ n’izu ahụ. Na-edetu ihe ka o nyere gị aka itinye uche n’ihe a na-ekwu nakwa maka izo aka na ya n’ọdịnihu. Mgbe e mesịrị, a ga-atụleghachi ihe omume ahụ n’ọgbakọ.
6 Jehova n’onwe ya akwadebewo oké oriri nke nri ime mmụọ a. Bịa! Rie! Anyị ga-eti mkpu ọṅụ ma ọ bụrụ na anyị agaa mgbakọ a iji rite uru n’usoro ihe omume ahụ dum.—Aịsa. 65:14.