Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/03 p. 7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 8/03 p. 7

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’August: A pụrụ iji nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ nwere peeji 32 mee ihe: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị Ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?, Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs, na Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya? September: Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụrụ na e nweghị ya, ị pụrụ iji Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala mee ihe. October: Nyefee magazin Ụlọ Nche na Teta! N’ebe e gosiri mmasị, nyefee broshuọ Na-achọ, na-eme mgbalị pụrụ iche iji malite ọmụmụ Bible. November: Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya? N’ebe ndị nwe ụlọ nwerela akwụkwọ a, nyefee akwụkwọ Ihe Ọmụma, Fee Chineke Ofufe, ma ọ bụ broshuọ Na-achọ.

◼ Malite n’izu October 20, 2003, anyị ga-amụ akwụkwọ Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ.

◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị ịgụzigharị ihe ndekọ ego ọgbakọ na September 1 ma ọ bụ ngwa ngwa September 1 gasịrị dị ka o kwere mee. Mgbe e meworo nke a, maara ọgbakọ ọkwa mgbe a gụsịrị akụkọ ndekọ ego ọzọ.

◼ Dị ka a na-eme kwa afọ, e kwesịrị ịgụkọ akwụkwọ na magazin nile e nwere n’August 31, 2003, ma ọ bụ n’oge dị ya nso, dị ka o kwere mee. Ngụkọ a yiri ọgụgụ onye nlekọta akwụkwọ nke ọgbakọ nhazi dị n’aka na-agụ akwụkwọ ole e nwere kwa ọnwa, e kwesịkwara idebanye ọnụ ọgụgụ ha na fọm Literature Inventory (S-18). E kwesịrị ịjụta ohu/ndị ohu na-elekọta magazin ọnụ ọgụgụ magazin e nwere. Odeakwụkwọ ọgbakọ nke nhazi dị n’aka kwesịrị ilekọta ngụkọ ahụ. Ya na onyeisi oche ndị nlekọta nke ọgbakọ nhazi dị n’aka ga-abịanye aka na fọm ahụ. Ọgbakọ ọ bụla nhazi dị n’aka ga-enweta fọm Literature Inventory (S-18) atọ. Biko ziterenụ alaka ụlọ ọrụ ibé nke mbụ tupu September 6 agafee. Debenụ otu ibé na faịlụ unu. A pụrụ iji ibé nke atọ mee ihe dị ka ibé akwụkwọ a ga-eji rụọ ọrụ.

◼ Malite n’August 28 ruo September 3, 2003, a ga-eme ngụkọ nke akwụkwọ nile e nwere na Betel dị n’Igieduma. N’ụbọchị ndị ahụ, a ga-emechi ebe a na-anata akwụkwọ.

◼ Kaseti Vidio Ọhụrụ E Nwere:

Respect Jehovah’s Authority—Bekee

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya