Ntụleghachi A Ga-eme N’ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-eji ọnụ tụlee ajụjụ ndị na-esonụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ga-amalite n’October 27, 2003. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi ga-ewe minit 30 dabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu September 1 ruo October 27, 2003. [Ihe Ịrịba Ama: N’ebe ndị a na-enweghị ebe e zoro aka na ha ná ngwụsị ajụjụ ọ bụla, ọ ga-adị mkpa ka i mee nnyocha nke gị iji chọta azịza ha.—Lee akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 36-37.
NKÀ OKWU
1. Gịnị ka ndụmọdụ ahụ e nyere na 1 Timoti 2:9 bụ́ ka mmadụ jiri “uwe a haziri nke ọma” chọọ onwe ya mma pụtara, oleekwa otú nke a pụrụ isi metụta ihe omume anyị n’ikpo okwu ma ọ bụ ozi ubi anyị? [be-IB p. 132 para. 4-5]
2. Olee otú ụkpụrụ Bible ndị dị na 1 Jọn 2:15-17, Ndị Efesọs 2:2, na Ndị Rom 15:3 kwesịrị isi metụta ọdịdị anyị? [be-IB p. 133 para. 2-4]
3. N’ihi gịnị ka ahụ́ iru ala ji dị mkpa, oleekwa otú anyị pụrụ isi nwee ahụ́ iru ala mgbe anyị na-ekwu okwu n’ikpo okwu ma ọ bụ na-ekere òkè n’ozi? [be-IB p. 135 igbe; p. 136 para. 5, igbe]
4. Dị ka “ezi onye àmà ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi,” olee otú Jizọs si setịpụrụ anyị ihe nlereanya n’iji Bible eme ihe n’ozi? (Mkpu. 3:14) [be-IB p. 143 para. 2-3]
5. Olee ụzọ anyị pụrụ isi dịkwuo nkà n’iji Bible eme ihe? (Taị. 1:9) [be-IB p. 144 para. 1, igbe]
IHE OMUME NKE 1
6. Gịnị ka ịmụ ihe na-agụnye, oleekwa ụfọdụ n’ime uru ndị ịmụchi Okwu Chineke anya bara? [be-IB p. 27 para. 3; p. 32 para. 4]
7. N’ụzọ kwekọrọ na Jems 1:5, 6, gịnị dị oké mkpa ka anyị mee mgbe anyị na-aga ime mkpebi dị mkpa? [w01-IB 9/1 p. 28 para. 4]
8. Olee ihe mere na nanị inwe Bible ma ọ bụ ọbụna ikwere na e ji ike mmụọ nsọ dee ya ezughị? [w01-IB 10/1 p. 6 para. 1]
9. Olee otú “onye na-eme ka akụkọ ọjọọ pụta” si bụrụ onye nzuzu? (Ilu 10:18) [w01-IB 9/15 p. 25 para. 3]
10. Gịnị bụ isi ihe ga-eme ka e nwee ụwa obi ụtọ? [w01-IB 10/15 p. 7 para. 1-2]
ỌGỤGỤ BIBLE KWA IZU
11. Eziokwu Ka Ọ̀ Bụ Ụgha: Ná Ndị Kọrint 2:9, Pọl onyeozi na-ezo aka n’ihe Jehova kwadebewooro ndị ya na-ekwesị ntụkwasị obi dị ka ihe nketa. Kọwaa. [ip-2-IB p. 366 igbe]
12. Ọnwụnwa dịgasị aṅaa ka okwu ndị ahụ e dekọrọ ná 1 Ndị Kọrint 10:13 na-ekwu banyere ha, oleekwa otú Jehova na-esi ‘eme ụzọ mgbapụ’? [w91-IB 10/1 p. 10-11 para. 11-14]
13. Olee otú ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ banyere mmesapụ aka si emetụta Ndị Kraịst? (2 Kọr. 8:9) [w92-IB 1/15 p. 16 para. 10]
14. Olee otú Iwu ahụ si bụrụ ‘onye nduzi nke na-eduga na Kraịst’? (Gal. 3:24) [w02-IB 6/1 p. 15 para. 11]
15. Gịnị bụ “ihe ndị mbụ nke ụwa” bụ́ ndị anyị na-aghaghị ịnọrọ ná nche megide ka e wee ghara idufu anyị? (Kọl. 2:8)