Akwụkwọ Ozi Sitere n’Aka Òtù Na-achị Isi
Ezi Ụmụnna Anyị Ndị Nwoke na Ndị Nwanyị:
“NWEENỤ obiọma na-erughịrị mmadụ na udo sitere n’aka Chineke bụ́ Nna anyị nakwa n’aka Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.” (1 Kọr. 1:3) Lee ka anyị si nwee atụmanya siri ike ịhụ mgbe ihe nile na-eku ume ga-enye Jehova otuto ruuru ya! (Ọma 150:6) Ka anyị na-echere ụbọchị ahụ dị ebube, anyị na-anọgide na-akpọsa ozi ọma nke Alaeze Chineke ma na-eme ndị na-eso ụzọ.
Izisa ozi ọma bụ ọrụ bụ́ isi Jehova lekwasịrị anya na ya ugbu a n’ụwa. (Mak 13:10) N’ihi na anyị maara nke ọma na Jehova nwere mmasị n’ọrụ a, anyị na-arịọ ya n’ekpere ka o nyere anyị aka ịrụ ya, na-aghọta na onye ọ bụla nwere ohere nke irite uru n’ihe mgbapụta ahụ. (Mkpu. 14:6, 7, 14, 15) N’eziokwu, anyị na-eche ihe ịma aka dị iche iche ihu, ma lee ka anyị si nwee ekele ịbụ ndị ‘e yikwasịrị ike sitere n’elu’ iji jezuo ozi a!—Luk 24:49.
Ọ bụ ihe na-eju afọ ileghachi anya azụ n’afọ ije ozi gara aga ma tụgharịa uche n’ihe ndị Jehova rụzuworo site n’aka ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe. N’ịbụ ndị mmụọ nsọ nyere ike, ndị Chineke egosipụtawo ịhụnanya yiri nke Kraịst, na-emeri ịkpọasị n’ụwa nile. Ịhụnanya dị otú ahụ pụtara ìhè ná mgbakọ anyị. Malite na June ruo December 2003, ndị sitere n’ihe karịrị otu narị ala mere njem gaa mgbakọ mba nile 32 e nwere na kọntinent isii. A gbara ndị ozi ala ọzọ, ndị ozi nke mba nile, na ndị na-eje ozi na Betel ná mba ọzọ ajụjụ ọnụ ná mgbakọ distrikti nakwa ná mgbakọ mba nile.
Ná mgbakọ ndị a, anyị nwetara akwụkwọ ndị bụ́ ‘Ka Anyị Hụ Ezi Ala Ahụ’ na Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Tụkwasị na nke ahụ, a mara ọkwa na a na-eme ndokwa ịmalite iji akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọsụ Ụzọ e degharịrị edegharị eme ihe n’ihe dị ka ná ngwụsị afọ ije ozi 2004. Nke nta nke nta, ndị nọteworo aka n’ozi ọsụ ụzọ bụ́ ndị gaworo ụlọ akwụkwọ ahụ ga na-esonye na klas nke ndị malitere ịsụ ụzọ ọhụrụ.
Nkwado Chineke na mmesapụ aka nke ụmụ mmadụ emewo ka e nwee ike iwukwu ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, karịsịa n’ala ndị nwere ihe onwunwe dị nta. N’ihi mkpa na-amụba amụba e nwere maka nri ime mmụọ n’ụwa nile, atụmatụ iwusawanye alaka na-aga n’ihu n’ọtụtụ ala. Broshuọ bụ́ Idi Ndu n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi! dị ugbu a n’asụsụ 299, e biwokwa ngụkọta nke nde 139 n’ime ya; Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi agafewo nde 93 n’asụsụ 161; e biwokwa ihe karịrị nde 200 nke broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị? n’asụsụ 267.
Anyị ji obi ụtọ na-anabata mmadụ 258,845 bụ́ ndị gosipụtara nraranye ha site na baptizim ime mmiri n’afọ ije ozi gara aga! Ọ bụ ezie na nkwado unu na-akwado Alaeze Chineke emewo ka unu bụrụ ndị Setan kpọrọ asị karịsịa, o mewokwa ka unu bụrụ ndị na-enweta ngọzi na nchebe ime mmụọ nke Jehova karịsịa ka unu nọ na-agba ọsọ ahụ e setịpụrụ n’ihu unu. (Hib. 12:1, 2; Mkpu. 12:17) Ee, jidenụ n’aka na “e nweghị ka ụra ga-esi atụ Onye na-eche [unu] nche.”—Ọma 121:3, NW.
Isiokwu dịịrị afọ 2004 bụ́, “Nọrọnụ na nche . . . Gosipụtanụ na unu bụ ndị dị njikere” bịara nnọọ n’oge ya. (Mat. 24:42, 44) A kọwara Ndị Kraịst n’Okwu Chineke dị ka ndị na-ebi nwa oge n’usoro ihe a na-anwụ anwụ. (1 Pita 2:11; 4:7) N’ihi ya, anyị kwesịrị ilegide anya n’otu ebe, ime ka ndụ anyị dị mfe, na iji nlezianya nyochaa obi anyị. “Dragọn ukwu ahụ” na-achọ iripịa anyị, na-emikpu anyị n’usoro ihe ya.—Mkpu. 12:9.
Ịgụ Bible kwa ụbọchị dị oké mkpa iji nọgide na-amụ anya. Ọ pụrụ inyere anyị aka ime ‘ka Ee anyị bụrụ Ee’ banyere nraranye anyị, nakwa ịhụ na ‘anyị na-ejidesi aka ike n’obi ike ahụ anyị nwere ná mmalite ruo ọgwụgwụ.’ (Jems 5:12; Hib. 3:14) Ịgụ Bible kwa ụbọchị pụrụ inyere anyị aka icheta otú omume ndị mmadụ bụruru nke na-ekwekọghị n’ụkpụrụ Chineke ndị a na-apụghị ịgbanwe agbanwe. (Mal. 3:6; 2 Tim. 3:1, 13) Ihe ọmụma Bible pụrụ inyere anyị aka ịjụ “akụkọ ụgha e ji akọ chepụta” na ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova.—2 Pita 1:16; 3:11.
Ndị nne na nna, ka unu na-azụlite ụmụ unu n’ọzụzụ na nduzi echiche nke Jehova, ùnu na-enyere ha aka isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ na ‘ịnọrọ na nche’? (Efe. 6:4) Ùnu na-azụ ha ile ọdịnihu ha anya dị ka onye kasị nwee amamihe nke dịtụworo ndụ n’ụwa si lee nke ya? Jizọs gaara abụworị ọkwa nkà kasịnụ, onye nchepụta kasịnụ ma ọ bụ dọkịta kasịnụ nke dịtụworo ndụ n’ụwa, ma kama nke ahụ, ọ chụsoro ozi oge nile. Ka ihe nlereanya ya kpalie unu inyere ụmụ unu aka ibute ọdịmma Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ ha.
Òtù ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke Òtù Na-achị Isi na-anọchite anya ya, na-ekele nnọọ “oké ìgwè mmadụ” ahụ n’ihi inyere anyị aka ịrụzu ọrụ anyị nke ime ka ‘e kwusaa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.’ (Mkpu. 7:9; Mat. 24:14, 45) Unu ndị anyị hụrụ n’anya, jidenụ n’aka na Jehova na-echeta “ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya, ebe unu jewooro ndị nsọ ozi ma nọgide na-eje ozi.” (Hib. 6:10) Ka unu na-agụ ahụmahụ ndị na-akpali akpali ma na-arịba ama ihe ndị si ná mgbalị unu jikọtara aka mee pụta na 2004 Yearbook of Jehovah’s Witnesses, maranụ na unu ekerewo òkè dị ukwuu n’ịgba àmà a zuru ụwa ọnụ.
Jirinụ obi ike na-eche ọdịnihu ihu ka unu na-anọgide ‘na-elegide anya n’ụgwọ ọrụ a ga-akwụ,’ n’ekweghị ka mmadụ ọ bụla ma ọ bụ mmụọ ọjọọ ọ bụla napụ ya unu. (Hib. 11:26; Kọl. 2:18) Ee, tụkwasịnụ Jehova obi, na-enwe obi ike na ọ ga-enyere ndị nile hụrụ ya n’anya aka inweta ndụ zuru ezu.—Jọn 6:48-54.
Jidenụ n’aka na anyị ji obi ụtọ soro unu na-ejekọ ozi iji wetara Jehova otuto.
Ụmụnna unu,
Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova