Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na July na August: A pụrụ inyefe nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ nwere peeji 32: Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị Ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?, Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?, na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs. September: Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụrụ na e nweghị ya, ị pụrụ inyefe akwụkwọ bụ́ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala.
◼ Malite na September, ndị nlekọta sekit ga-ekwu okwu ihu ọha isiokwu ya bụ “Iji Okwukwe na Obi Ike Na-atụ Anya Ihe Ọdịnihu Ga-abụ.”
◼ A na-ezigara ọgbakọ ọ bụla fọm Literacy Report abụọ. Mgbe unu dejupụtasịrị ha, biko zighachirinụ alaka ụlọ ọrụ otu n’August 1. Tinyenụ nke ọzọ na faịlụ ọgbakọ.
◼ Mgbe ndị nkwusa na-arụ ókèala a na-eketaghị ọrụ, ha pụrụ inyefe broshuọ Na-achọ ma ọ bụ akwụkwọ Ihe Ọmụma. A pụrụ inyefe akwụkwọ ọzọ ma ọ bụrụ na onye nwe ụlọ enweworị akwụkwọ abụọ ndị a. Mmadụ nile kwesịrị ịchịrị traktị dị iche iche maka ndị na-anọghị n’ụlọ ma ọ bụ ndị na-anataghị akwụkwọ. E kwesịrị ime mgbalị ịgaghachi iji wulite mmasị, karịsịa n’ókèala ndị a na-eketaghị ọrụ bụ́ ebe ọgbakọ ndị dị nso pụrụ ịgaru.
◼ Ndị odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị inwe ọnụ ọgụgụ ga-ezunụ nke fọm bụ́ Application for Regular Pioneer Service (S-205) na Application for Auxiliary Pioneer Service (S-205b). A pụrụ iji fọm bụ́ Literature Request Form (S-14) tụọ ọda ha. Nwee ma ọ dịkarịa ala nke ga-ezu otu afọ.
◼ Tupu odeakwụkwọ ọgbakọ ezitewere alaka ụlọ ọrụ fọm maka ozi ọsụ ụzọ oge nile, o kwesịrị ịtụleghachi fọm ahụ iji hụ na e dejupụtara ha nke ọma. Ọ bụrụ na ndị dejupụtara ya apụghị icheta kpọmkwem ụbọchị e mere ha baptizim, ha pụrụ ịhọrọ otu ụbọchị ma buru ya n’uche. Odeakwụkwọ kwesịrị idetu ụbọchị ahụ na kaadị Ihe Ndekọ Onye Nkwusa nke Ọgbakọ.
◼ Mgbe ọ bụla atụmatụ ị na-eme maka ime njem na-agụnye ije nzukọ ọgbakọ, mgbakọ nta, ma ọ bụ mgbakọ distrikti ná mba ọzọ, ọ ghaghị ịbụ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta ọrụ ahụ ná mba ahụ ka ị ga-esi n’aka ya nweta ihe ọmụma banyere ụbọchị, oge, na ebe ndị a na-enwe ha. E depụtara adres alaka ụlọ ọrụ dị iche iche na peeji ikpeazụ nke Yearbook kasị ọhụrụ.
◼ Ọ dị mkpa ka alaka ụlọ ọrụ na-enwe ihe ndekọ kasị ọhụrụ nke adres na nọmba telifon nke ndị isi oche ndị nlekọta na nke ndị odeakwụkwọ nile. Ọ bụrụ na e nwee mgbanwe mgbe ọ bụla, Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwesịrị idejupụta fọm bụ́ Presiding Overseer/Secretary Change of Address (S-29), bịanye aka na ya, ma zitere ya alaka ụlọ ọrụ ozugbo. Nke a na-agụnye mgbanwe ọ bụla e nwere na nọmba ndị a na-apị tupu a kpọọ ógbè nke ọ bụla.