Leta Alaka
Ezi Ndị Nkwusa Alaeze:
Ọ dị ihe ọhụrụ na-akpali akpali na-ewere ọnọdụ n’ihe banyere ibi magazin na Nigeria. Òtù Na-achị Isi kwadoro ka e butere alaka anyị ígwè obibi akwụkwọ rotary. Ígwè obibi akwụkwọ anọ anyị nwere ugbu a na-ebi ihe dị ka magazin 20,000 n’otu awa, ebe ígwè obibi akwụkwọ rotary ahụ nwere ike ibi magazin 38,000 n’otu awa. Nke a pụtara na a na-akwadebe anyị inwe ike ibipụtakwu magazin n’ọdịnihu. Ígwè obibi akwụkwọ ahụ rutere n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Igieduma n’April nke afọ a, ọ fọkwara obere ka a rụnyechaa ya. Anyị na-enwe olileanya na ígwè obibi akwụkwọ rotary a ga-amalite ọrụ n’ihe dị ka October 1, 2004. N’ihi ya, anyị na-atụ anya inwe ike inye ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị nkwusa na ndị nwere mmasị nọ na Nigeria, nri ime mmụọ na-abịa n’oge ya.
A malitere ụlọ akwụkwọ ọhụrụ maka ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị n’alaka ụlọ ọrụ dị n’Igieduma. Klas nke mbụ, nke mmadụ 20 mejupụtara, malitere akwụkwọ na July 2004 maka ihe ọmụmụ nke were izu asatọ. Ndị bịara ya bụ ndị nlekọta sekit na distrikti si n’akụkụ nile nke Nigeria. E lebaara akụkụ nile nke ọrụ ha anya, nke a ga-abakwara ọtụtụ puku ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị nọ n’ọgbakọ nakwa na sekit ndị ha na-eje ozi na ha uru dị ukwuu.
Anyị so unu na-atụ anya ‘inwe ọtụtụ ihe ime n’ọrụ Onyenwe anyị’ ka anyị na-amalite afọ ije ozi 2005.—1 Kọr. 15:58.
Ụmụnna unu,
Alaka Ụlọ Ọrụ Nigeria