Ntụleghachi A Ga-eme N’ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-eji ọnụ tụlee ajụjụ ndị na-esonụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ga-amalite n’October 25, 2004. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi ga-ewe minit 30 dabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu September 6 ruo October 25, 2004. [Ihe Ịrịba Ama: N’ebe ndị a na-enweghị ebe e zoro aka na ha ná ngwụsị ajụjụ ọ bụla, ọ ga-adị mkpa ka i mee nnyocha nke gị iji chọta azịza ha.—Lee akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 36-37.]
NKÀ OKWU
1. Olee otú anyị pụrụ isi mee ka okwu anyị bụrụ nke na-ewuli elu mgbe anyị na-ekwu okwu banyere otu akụkụ nke ọrụ Ndị Kraịst? [be-IB p. 203 para. 2-3]
2. Gịnị bụ nkwughachi, oleekwa ihe mere o ji dị mkpa? [be-IB p. 206 para. 1-4]
3. Olee otú anyị pụrụ isi mesie isiokwu nke okwu anyị ike? [be-IB p. 210 para. 1-5, igbe]
4. Olee otú anyị pụrụ isi kpebie ihe ndị bụ́ isi n’okwu e kenyere anyị ka anyị kwuo? [be-IB p. 212 para. 1-4]
5. Gịnị mere anyị kwesịrị iji kpachara anya ka anyị ghara inwe ọtụtụ isi ihe gabigara ókè? [be-IB p. 213 para. 2-4]
IHE OMUME NKE 1
6. Olee ihe ndị mere tupu Iju Mmiri ahụ nke pụrụ imeworị ka o siere ndị mmadụ ike ikweta na ihe nile gbara ha gburugburu gaje ịbịa ná njedebe? [w02-IB 3/1 p. 5-6]
7. Gịnị mere o ji kwesị ịrịba ama na ndị ha na Jizọs dịkọrọ ndụ kpọrọ ya “Onye Ozizi,” ọ bụghị “Ọgwọ Ọrịa”? (Luk 3:12; 7:40) [w02-IB 5/1 p. 4 para. 3; p. 6 para. 6]
8. Olee otú Ilu 11:24, 25 si mee ka uru dị n’ikere òkè zuru ezu n’ozi ubi pụta ìhè? [w02-IB 7/15 p. 30 para. 3-5]
9. Ihe iseokwu dị aṅaa metụtara omume ka nnupụisi ahụ weere ọnọdụ n’Iden welitere, oleekwa ihe ndị siworo ná nnupụisi ahụ pụta? (Jen. 3:1-6) [w02-IB 10/1 p. 6 para. 1, 3-4]
10. Olee ihe ndị nọgideworo na-eyigharị mkpebi ha ịrara onwe ha nye Jehova Chineke pụrụ ịmụta site n’ihe ndekọ banyere Nikọdimọs? [w02-IB 2/1 p. 12 para. 4, 6]
ỌGỤGỤ BIBLE KWA IZU
11. Ebe ọ bụ na Jehova gwara Belam ka o soro ndị ikom Belak jee, gịnị mere O ji wee iwe mgbe Belam sooro ha jee? (Ọnụ Ọgụ. 22:20-22)
12. Di nke nwanyị bụ́ Onye Kraịst ọ̀ pụrụ iwezụga nkwa nwunye ya kwere? (Ọnụ Ọgụ. 30:6-8)
13. Gịnị ka ‘obodo nke mgbaba’ ahụ na-anọchite anya ya taa? (Ọnụ Ọgụ. 35:6) [w95-IB 11/15 p. 17 para. 8]
14. È kwesịrị ịghọta iwu ahụ dị na Deuterọnọmi 6:6-9 nke bụ́ ‘ike iwu Chineke n’elu aka na n’isi ka ha wee bụrụ mkpọ n’ihu gị’ n’ụzọ nkịtị?
15. Okwu ahụ bụ́ ‘uwe mgbokwasị gị akaghị nká,’ ọ̀ pụtara nanị na e meghị ka uwe kọọ ụmụ Izrel? (Deut. 8:4)