Ntụleghachi A Ga-eme N’ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-eji ọnụ zaa ajụjụ ndị na-esonụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ga-amalite na February 28, 2005. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi ga-ewe minit 30 dabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu January 3 ruo February 28, 2005. [Ihe Ịrịba Ama: N’ebe ndị a na-enweghị ebe e zoro aka na ha ná ngwụsị ajụjụ ọ bụla, ọ ga-adị mkpa ka i mee nnyocha nke gị iji chọta azịza ha.—Lee akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 36-37.]
NKÀ OKWU
1. Olee otú anyị pụrụ isi mee ka a ghọta okwu anyị karị? [be-IB p. 226 para. 1–p. 227 para. 1]
2. Olee ụdị okwu ndị pụrụ ịdị mkpa ka a kọwakwuo ha? [be-IB p. 227 para. 2–p. 228 para. 1]
3. Olee ihe ga-enyere anyị aka ikwu okwu n’ụzọ ndị na-ege anyị ntị ga-amụta ihe na ya n’ezie? [be-IB p. 231 para. 1-3]
4. Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ndị na-ege anyị ntị mụta ihe site n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ anyị na-agụ bụ́ nke a maara nke ọma? [be-IB p. 231 para. 4-5]
5. Gịnị ka ịgba ndị na-ege anyị ntị ume ilekwasị anya n’ihe ndị gbara otu akụkọ Bible ha maara nke ọma gburugburu pụrụ ịrụpụta? [be-IB p. 232 para. 2-4]
IHE OMUME NKE 1
6. Gịnị ka ịkụziri ndị mmadụ ‘ịtụ egwu ezi Chineke ahụ na idebe ihe nile O nyere n’iwu’ gụnyere? (Ekli. 12:13) [be-IB p. 272 para. 3–p. 273 para. 1]
7. Olee otú anyị pụrụ isi dọrọ uche gaa ọ bụghị nanị n’ebe aha Jehova dị, kamakwa n’ụdị onye ọ bụ? (Joel 2:32) [be-IB p. 274 para. 3-5]
8. Olee otú ọ dịruru ná mkpa inwe ihe ọmụma banyere Jizọs nakwa ịgba àmà banyere ya? (Jọn 17:3) [be-IB p. 275 para. 4]
9. Olee otú iso Chineke nwee mmekọrịta a nwapụtara anwapụta na ịghọta Bible si nwee njikọ kpọmkwem n’ịghọta ọrụ Jizọs na-arụ? [be-IB p. 276 para. 2]
10. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị kweere n’ezie na Jizọs Kraịst bụ Eze? [be-IB p. 277 para. 4]
ỌGỤGỤ BIBLE KWA IZU
11. Nna Ebreham, bụ́ Tira, ọ̀ bụ onye na-ekpere arụsị? (Josh. 24:2)
12. Ọ̀ bụ na Gidiọn enweghị obi ike iji rụzuo ọrụ Jehova nyere ya? Gịnị mere i ji zaa otú ahụ? (Ikpe 6:25-27)
13. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’otú Gidiọn si zaghachi ndị ebo Ifrem? (Ikpe 8:1-3)
14. Gịnị ka ọjụjụ ndị Gibea jụrụ ile ọbịa gosipụtara? (Ikpe 19:14, 15)
15. Ọ bụrụ na ‘onye ọ bụla na-eme ihe ziri ezi n’anya onwe ya,’ nke a ò mere ka e nwee ọgba aghara? (Ikpe 21:25)