Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa February: A ga-enyefe Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụrụ na e nweghị ya, a pụrụ inyefe Ị pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’Ime Paradaịs n’Elu Ala, Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, na Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! March: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. April na May: Nyefee Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị na-eme nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, gaa na nke ndị bịara Ememe Ncheta ma ọ bụ na nke ndị bịara ya ma na-abịakwa nzukọ anyị ndị ọzọ ma ha adịghị eso ọgbakọ akpachi anya. Lekwasị anya n’inyefe akwụkwọ Fee Chineke Ofufe. E kwesịrị ịgbalịsi ike ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi, karịsịa ma ọ bụrụ na ụfọdụ n’ime ha amụwo akwụkwọ Ihe ọmụma na broshuọ Na-achọ.
◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ bụla ọ họpụtara kwesịrị inyocha ihe ndekọ ego ọgbakọ na March 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere omume. Ọ bụrụ na unu nwere ihe ndekọ ego dị iche, dị ka nke ego e ji elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ nke ego ihe owuwu, e kwesịrị ime ndokwa ka e nyochaa ya. Mgbe e meworo nke a, e kwesịrị ịmara ọgbakọ ọkwa ya mgbe a gụsịrị akụkọ ndekọ ego ọzọ.
◼ Odeakwụkwọ na onye nlekọta ije ozi kwesịrị ịtụleghachi ọrụ ndị nile na-arụ ọsụ ụzọ oge nile. Ọ bụrụ na e nwere onye ọ na-esiri ike ịrụzu awa ole a chọrọ, ndị okenye kwesịrị ime ndokwa ka e nyere ya aka. Maka aro ụfọdụ, tụleghachi akwụkwọ ozi S-201 bụ́ nke a na-edeta kwa afọ.
◼ Isiokwu okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge Ememe Ncheta nke 2005 ga-abụ “Gịnị Mere Jizọs Ji Taa Ahụhụ Ma Nwụọ?” Lee Ozi Alaeze Anyị nke January 2005 maka ịma ọkwa yiri nke a.
◼ A chọrọ ka mmadụ nile bịa gee Okwu Ihu Ọha na Sunday, March 20 iji nụrụ ọkwa pụrụ iche a ga-ama banyere ihe e mere ndokwa inye ndị nkwusa nile.
◼ Anyị ga-amalite ịmụ Nọrọ na Nche! n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ n’izu ga-amalite May 23, 2005.