Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 3/05 p. 2-3
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2005
Ozi Alaeze Anyi—2005
km 3/05 p. 2-3

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na March 1 ruo March 20: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. March 21 ruo April 17: A ga-eme mkpọsa pụrụ iche iji kesaa Nọrọ na Nche! April 18 ruo April 30, na May: Nyefee Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị na-eme nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, gụnyere ndị bịara Ememe Ncheta nakwa/ma ọ bụ nzukọ anyị ndị ọzọ ma ha adịghị eso ọgbakọ akpachi anya, lekwasị anya n’inyefe akwụkwọ Fee Chineke Ofufe. E kwesịrị ịgbalịsi ike ịmalite iduziri ha ọmụmụ Bible ebe obibi, karịsịa ma ọ bụrụ na ụfọdụ n’ime ha amụwo akwụkwọ Ihe ọmụma na broshuọ Na-achọ. June: Nyefee akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ, ọ bụrụ na ndị mmadụ asị na ha enweghị ụmụaka, nyefee broshuọ Na-achọ. Gbalịa ịmalite iduziri ha ọmụmụ Bible ebe obibi.

◼ E kwesịrị inye ndị nọ n’ọgbakọ Ụlọ Nche na Teta! ndị kasị ọhụrụ ozugbo e nwetasịrị ha. Nke a ga-eme ka ndị nkwusa mara ihe ndị dị n’ime ha tupu ha amalite inyefe ha n’ozi ubi. E kwesịkwara inye ndị nkwusa Ozi Alaeze Anyị ozugbo e nwetasịrị ya. A pụrụ inye ha ya n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ.

◼ Mgbe ọ bụla ị na-eme atụmatụ ịga mba ọzọ ma na-atụ anya iso ndị ebe ahụ gaa nzukọ ọgbakọ, mgbakọ sekit, mgbakọ pụrụ iche, ma ọ bụ mgbakọ distrikti, ọ bụ alaka ụlọ ọrụ na-elekọta ọrụ ná mba ahụ ka ị na-aghaghị ịjụ ajụjụ iji mata ụbọchị, oge, na ebe a ga-enwe nzukọ ma ọ bụkwanụ mgbakọ nke ọ bụla. E depụtara adres alaka ụlọ ọrụ dị iche iche na peeji ikpeazụ nke Yearbook kasị ọhụrụ.

◼ Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ịhụ mgbe nile na ọgbakọ nwere fọm Application for Regular Pioneer Service (S-205) na Application for Auxiliary Pioneer Service (S-205b), ole zuoro ha. A pụrụ iji fọm Literature Request Form (S-14) tụọ ọda ha. Hụ na ọgbakọ nwere, ọ dịkarịa ala, nke ga-ezu otu afọ.

◼ A ga-eme Ememe Ncheta na Thursday, March 24, 2005. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu na-enwe nzukọ n’ụbọchị Thursday, bufeenụ ya n’ụbọchị ọzọ n’izu ahụ ma ọ bụrụ na ohere ga-adị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze unu. Ọ bụrụ na ohere agaghị adị, ya abụrụkwa na nke a ga-emetụta Nzukọ Ije Ozi, unu pụrụ ime akụkụ ndị nke metụtara ọgbakọ unu ná Nzukọ Ije Ozi ọzọ.

◼ Anyị ga-amalite ịmụ Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel! n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ site n’izu ga-amalite June 27, 2005.

◼ A ga-ekwu okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge Ememe Ncheta nke 2005 na Sunday, April 10. Isiokwu ya ga-abụ, “Gịnị Mere Jizọs Ji Taa Ahụhụ Ma Nwụọ?” Ọgbakọ ndị ga-enwe onye nlekọta sekit, mgbakọ sekit, ma ọ bụ mgbakọ pụrụ iche ná ngwụsị izu ahụ, ga-ekwu okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche n’izu nke na-esonụ. Ọ dịghị ọgbakọ kwesịrị ikwu ya tupu Sunday, April 10, 2005.

◼ Compact Disc Ndị Ọhụrụ A Na-egere Egere E Nwere:

Appreciating Our Spiritual Heritage—Bekee

Doing What is Right in Jehovah’s Eyes—Bekee

Jehovah’s Judgment Against Law-Defying People—Bekee

Marked for Survival—Bekee

Preserving Life in Time of Famine—Bekee

◼ Maka mgbakọ sekit na ụbọchị mgbakọ pụrụ iche nke afọ 2005, sekit ndị na-esonụ ga-enwe ebe e debere oche maka ndị ntị chiri bụ́ ebe a ga-atụgharị ihe omume ahụ gaa n’Ụdị Asụsụ Ogbi nke America (ASL):

Akabo (EE-08) May 14 na February 26-27

Akure (WE-12) June 4 na March 26-27

Badagry (WE-02) July 23 na April 2-3

Badagry (WE-04) June 11 na February 5-6

Badagry (WE-23) June 12 na February 12-13

Calabar (EE-21) February 12 na June 11-12

Daluwon (WE-03) May 14 na August 6-7

Daluwon (WE-13) April 9 na September 3-4

Enugu (EE-17) April 3 na January 8-9

Ibadan (WE-09) July 30 na May 7-8

Igwuruta Ali (EE-22) February 12 na June 11-12

Ilesa (WE-15) February 6 na July 23-24

Kaduna (NE-01b) July 3 na March 19-20

Ota (WE-05) July 2 na April 9-10

Ota (WE-06) July 16, na February 12-13

Ota (WE-07) July 17 na April 2-3

Ota (WE-25) July 3 na April 23-24

Ubogo (ME-07) February 13 na September 3-4

Uli (EE-24) July 31 na April 23-24

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya