Ntụleghachi A Ga-eme N’ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-eji ọnụ zaa ajụjụ ndị na-esonụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ga-amalite n’April 25, 2005. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi ga-ewe minit 30 dabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu March 7, 2005 ruo April 25, 2005. [Ihe Ịrịba Ama: N’ebe ndị a na-enweghị ebe e zoro aka na ha ná ngwụsị ajụjụ ọ bụla, ọ ga-adị mkpa ka i mee nnyocha nke gị iji chọta azịza ha.—Lee akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 36-37.]
NKÀ OKWU
1. Mgbe anyị na-akwadebe ihe omume, olee otú anyị ga-esi jiri ebe ihe omume e kenyere anyị sitere mee ihe nke ọma, gịnịkwa mere nke a ji dị mkpa? [be-IB p. 234 para. 1-3, igbe abụọ]
2. Ihe ọmụma ha aṅaa dị n’okwu e kenyere anyị ka anyị kwesịrị ịgbalị ịtụle? [be-IB p. 234 para. 4–p. 235 para. 1]
3. Olee otú anyị pụrụ isi jiri ajụjụ kpalie mkparịta ụka mgbe anyị nọ n’ozi ubi? (Ọrụ 8:30) [be-IB p. 236 para. 2-5]
4. Olee otú anyị pụrụ isi jiri ajụjụ nyere ndị anyị na-amụrụ Bible aka iji ‘ikike iche echiche ha’ na-eme ihe? (Rom 12:1) [be-IB p. 237 para. 5]
5. Gịnị ka ajụjụ ndị ahụ a jụrụ ná Ndị Rom 8:31, 32 nakwa n’Aịsaịa 14:27 rụpụtara? [be-IB p. 238 para. 5-p. 239 para. 1]
IHE OMUME NKE 1
6. Olee otú anyị ga-esi jiri ‘Kraịst mere ntọala’ n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ anyị? (1 Kọr. 3:11) [be-IB p. 278 para. 1-2]
7. Ebe ọ bụ na Jehova nyere Ọkpara ya ike zuru ezu ịchị achị n’afọ 1914, gịnịzi bụ nzube anyị mgbe anyị na-ekpe ekpere, sị, “Ka Alaeze gị bịa”? (Mat. 6:9, 10) [be-IB p. 279 para. 4]
8. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị ka Ndị Kraịst nile nwee mmasị n’ịmụta ka e si agụ ihe, oleekwa otú Jizọs si setịpụ ihe nlereanya na nke a? [w03-IB 3/15 p. 10 para. 5; p. 12 para. 2]
9. Olee otú ihe nlereanya Josaịa na Jizọs pụrụ isi nyere ndị ntorobịa aka inwe ọganihu ime mmụọ? [w03-IB 4/1 p. 8 para. 3-4; p. 10 para. 3]
10. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji tụkwasị Chineke obi? (Ilu 3:5, 6) [w03-IB 11/1 p. 4 para. 6-p. 5 para. 1]
ỌGỤGỤ BIBLE KWA IZU
11. N’ihi gịnị ka Hana ji kpee ekpere ka Jehova ‘nye eze ya ike’ ebe ọ bụkwanụ na e nweghị eze bụ́ mmadụ n’Izrel? (1 Sam. 2:10)
12. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta n’eziokwu ahụ bụ́ na e meriri ndị Izrel n’agbanyeghị na igbe ọgbụgba ndụ ahụ dị n’etiti ha? (1 Sam. 4:3, 4, 10)
13. N’ihi gịnị ka 1 Ihe E Mere 2:13-15 ji zoo aka n’ebe Devid nọ dị ka nwa nwoke nke asaa nke Jesi, ebe 1 Samuel 16:10, 11 na-egosi na ọ bụ nke asatọ?
14. Gịnị bụ “mmụọ ọjọọ” mere ka Sọl tụọ egwu nke ukwuu? (1 Sam. 16:14)
15. Amụma “Samuel” buru site n’ọnụ nwanyị na-ajụ ndị mmụọ ase n’En-doa ò mezuru? (1 Sam. 28:16-19)