Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/05 p. 7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2005
Ozi Alaeze Anyi—2005
km 12/05 p. 7

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na December: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụrụ na e nweghị ya, ị pụrụ inyefe Akwukwọm nke Akukọ Bible, ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. January: A pụrụ inyefe akwụkwọ ọ bụla dị peeji 192 nke e biri n’akwụkwọ na-achanwụ achanwụ nke ọgbakọ nwere. Ọ bụrụ na e nweghị ya, ị pụrụ inyefe akwụkwọ bụ́ Mankind’s Search for God, ma ọ bụ broshuọ Nọrọ na Nche! February: A ga-enyefe akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụrụ na e nweghị ya, ị pụrụ inyefe Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla ka ya mee ochie unu nwejuru enweju.

◼ Biko rịbanụ ama na ụbọchị a ga-eme ihe omume a ga-eji echeta ọnwụ Jizọs n’afọ 2007 ga-abụ na Monday, April 2, mgbe anyanwụ dasịrị. Ihe mere e ji na-ama ọkwa a n’oge bụ ka ụmụnna wee nwee ike ime ndokwa ndị dị mkpa iji nweta ụlọ nzukọ ọgbakọ ga-anọ eme ya ma ọ bụrụ na e nwere ọtụtụ ọgbakọ ji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe, ya abụrụkwa na a ghaghị inweta ụlọ nzukọ ọzọ. N’ọnọdụ dị otú ahụ, ndị okenye kwesịrị iso ndị nwe ụlọ nzukọ ọ bụla e nwetara mee nkwekọrịta iji jide n’aka na ọ dịghị ihe omume ọzọ a ga-anọ n’ụlọ nzukọ ahụ mee n’ụbọchị ahụ, ka e wee nwee ike ime ihe omume a e ji echeta ọnwụ Jizọs n’udo nakwa n’ụzọ dị n’usoro.

◼ N’ihi otú ihe omume e ji echeta ọnwụ Jizọs dịruru ná mkpa, òtù ndị okenye kwesịrị ịhọrọ otu n’ime ndị okenye ka ruo eru ka ọ bụrụ ọkà okwu, kama ịdị na-eke ya eke ma ọ bụ ikwe ka otu nwanna na-ekwu ya kwa afọ. Ọ bụrụ na e nwere okenye so ná ndị e tere mmanụ nke nwere ike ikwu okwu ahụ, e kwesịrị ịhọrọ ya ka o kwuo ya.

◼ Biko gbanwee paragraf nke 3 nke ntụziaka Usoro Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 2006, bụ́ nke dị n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke October 2005, peeji nke 3, ka ọ gụọ, sị: “E kwesịrị iji abụ, ekpere, na okwu nnabata malite ụlọ akwụkwọ ahụ N’OGE, mgbe ahụ gaa n’ihu dị ka e depụtara n’okpuru. Mgbe e mesịrị ihe omume nke ọ bụla, onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-akpọpụta onye ga-eme ihe omume nke na-esonụ.”

◼ Ọ bụrụ na ihe ruru mmadụ 20 ma ọ bụ karịa chọrọ ịbịa leta alaka ụlọ ọrụ anyị dị n’Igieduma, ọ dị mkpa ka ha detara anyị akwụkwọ tupu ha abịawa. N’akwụkwọ ozi ahụ, ha kwesịrị ide mmadụ ole na-abịa na ụbọchị ha ga-abịa. Ha pụkwara iji telifon gwa anyị ya, ọ dịkarịa ala, ụbọchị abụọ tupu ha abịawa. Ozugbo ha rutere Betel, ha kwesịrị inye anyị akwụkwọ ha dere aha ndị ahụ bịaranụ, bụ́ nke ga-egosi ndị nke e mere baptizim, ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim, na ndị nwere mmasị. Ọ na-ewe awa abụọ iji gagharịa ma kirie ihe ndị dị n’alaka ụlọ ọrụ anyị, n’ihi ya, anyị na-agba unu ume ịhapụ ụlọ n’oge ma rute n’oge ka unu wee nwee ike ịgagharị kirie ihe ndị a ma laghachikwa n’udo n’otu ụbọchị ahụ. Ihe unu ga-ede n’elu envelopu unu tinyere akwụkwọ ozi ahụ bụ: “Attention Bethel Office.” Tupu unu abịawa, biko tụleghachinụ Igbe Ajụjụ dị n’Ozi Alaeze Anyị nke June 2002, bụ́ nke kwuru banyere mmadụ iyi uwe na iji ejiji n’ụzọ kwesịrị ekwesị mgbe ọ na-abịa ileta ebe obibi Betel.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya