Ntụleghachi A Ga-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-eji ọnụ zaa ajụjụ ndị na-esonụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ga-amalite na February 27, 2006. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi ga-ewe minit 30 dabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu January 2 ruo February 27, 2006. [Ihe Ịrịba Ama: N’ebe ndị a na-enweghị ebe e zoro aka na ha ná ngwụsị ajụjụ ọ bụla, ọ ga-adị mkpa ka i mee nnyocha nke gị iji chọta azịza ha.—Lee akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 36-37.]
NKÀ OKWU
1. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke si enyere anyị aka ‘ịchụrụ Chineke àjà otuto mgbe nile na ikwupụta aha ya n’ihu ọha’? (Hib. 13:15) [be-IB p. 5 para. 3–p. 6 para. 1]
2. N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị itinye mgbalị dị ukwuu iji na-agụzi ihe agụzi? [be-IB p. 83 para. 1-5]
3. Mgbe anyị na-ekwu okwu ma na-ezi ihe, n’ihi gịnị ka o ji dị nnọọ mkpa ikwu okwu n’ụzọ doro anya? [be-IB p. 86 para. 1-6]
4. N’ihi gịnị ka ịkpọzi okwu akpọzi ji dị mkpa, oleekwa ihe ndị ọ dị mkpa ka anyị lebara anya? [be-IB p. 89 para. 1–p. 90 para. 2, igbe]
5. Olee aro ụfọdụ ga-enyere anyị aka ịbụ ndị okwu na-aga were were n’ọnụ karị? [be-IB p. 94 para. 4-5, igbe]
IHE OMUME NKE 1
6. Olee ụfọdụ ọnyà ndị eze Izrel dabara na ya, ịdọ aka ná ntị dịkwa aṅaa ka ha bụụrụ anyị taa? [w85-IB 11/1 p. 29 para. 4; p. 30 para. 2-4]
7. Ọ̀ bụ na ndị Izrel ahụ fọdụrụ na Babilọn ekwesịghị ntụkwasị obi? (Ezra 1:3-6) Ànyị nwere ọnọdụ yiri nke ahụ taa? [w86-IB 2/15 p. 29 para. 4, 5, 10]
8. Olee otú akwụkwọ Ezra si gosi na Jehova bụ ezi Chineke ahụ ma mee ka a tụkwasị obi na ya? [w86-IB 2/15 p. 30 para. 17]
9. Olee otú Nehemaịa si bụụrụ ndị ohu Chineke ezi ihe nlereanya taa? [w86-IB 6/1 p. 21 para. 9]
10. Olee otú anyị pụrụ isi malite inwe ọṅụ Jehova ma nọgide na-enwe ya? [w86-IB 6/1 p. 22 para. 10]
ỌGỤGỤ BIBLE KWA IZU
11. Ndị Izrel ahụ na-alaghachi n’ala ha hà ji Ìhè na Izu Okè ahụ, bụ́ ihe ndị e ji eme ihe mgbe a chọrọ inweta azịza n’aka Jehova? (Ezra 2:61-63)
12. Gịnị mere obi akaghị ọtụtụ ndị Juu nọ na Babilọn iso Ezra gaa Jeruselem? (Ezra 7:28–8:20)
13. Olee otú o si bụrụ na e ji nanị otu aka wughachi mgbidi ahụ? (Neh. 4:17, 18)
14. Ebe ọ bụ na a na-etinye akwụkwọ ozi a na-achọghị ka onye ọzọ gụọ n’akpa e mechiri nke ọma, gịnị mere Sanbalat ji zigara Nehemaịa ‘akwụkwọ ozi a na-emechighị emechi’? (Neh. 6:5)
15. Tụkwasị ‘n’isesa ndị Juu ahụ si n’ezi ofufe dapụ okwu,’ dị ka o mere ndị isi na ndị a maara aha ha na mbụ, olee ihe ndị ọzọ Nehemaịa mere iji dozie nsogbu e nwere? (Neh. 13:25, 28)