Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 2/06 p. 2-7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2006
Ozi Alaeze Anyi—2006
km 2/06 p. 2-7

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na February: A ga-enyefe akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụrụ na e nweghị ya, a pụrụ inyefe akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ akwụkwọ ọ bụla ka ya mee ochie unu nwejuru enweju. March: Nyefee akwụkwọ ọhụrụ ahụ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịsie ike ịmalite ọmụmụ Bible. April na May: Nyefee Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị na-eme nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, hụ na ị gara na nke ndị bịara ihe omume e ji echeta ọnwụ Jizọs ma ọ bụ na nke ndị bịara ya ma na-abịakwa nzukọ anyị ndị ọzọ ma ha adịghị eso ọgbakọ akpachi anya. Lekwasị anya n’inyefe akwụkwọ ọhụrụ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Nzube anyị kwesịrị ịbụ iji akwụkwọ ahụ malite ọmụmụ Bible.

◼ Ebe ọ bụ na e nwere ngwụsị izu ise zuru ezu n’ọnwa April, ọ ga-abụ ọnwa magburu onwe ya ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.

◼ Isiokwu nke okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge ihe omume e ji echeta ọnwụ Jizọs nke afọ 2006 ga-abụ “Ọ̀ Bụ Chineke Ka Na-achịkwa Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa.” Lee Ozi Alaeze Anyị nke September 2005 maka ịma ọkwa yiri nke a.

◼ A ga-atụle isiokwu dị na peeji nke 6 nke bụ́ “Nweta Obi Aṅụrị n’Ịmụ Akwụkwọ Bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?” ná Nzukọ Ije Ozi nke izu nke April 3. Biko, chekwaa isiokwu ahụ na usoro ọmụmụ ihe ya na ya so.

◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ bụla ọ họpụtara kwesịrị inyocha ihe ndekọ ego ọgbakọ na March 1 ma ọ bụ ngwa ngwa o kwere mee mgbe ụbọchị ahụ gasịrị. Ọ bụrụ na unu nwere ihe ndekọ ego ụlọ akụ dị iche, dị ka nke ego e ji elekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ ego e ji ewu nke ọhụrụ, e kwesịkwara ime ndokwa ka e nyochaa ya. Mgbe e mesịrị nke a, e kwesịrị ịmara ọgbakọ ọkwa ya mgbe a gụsịrị akwụkwọ ndekọ ego ọzọ.

◼ Odeakwụkwọ na onye nlekọta ije ozi kwesịrị ịtụleghachi ọrụ ndị nile na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ oge nile. Ọ bụrụ na e nwere onye ọ na-esiri ike ịrụzu awa ole a chọrọ ya n’aka, ndị okenye kwesịrị ime ndokwa ka e nyere ya aka. Maka aro ụfọdụ, tụleghachi akwụkwọ ozi S-201 bụ́ nke a na-edeta kwa afọ.

◼ Ọ dịghị onye ma ọ bụ ìgwè a chọrọ ka ha gaa n’ebe a na-arụ ọfịs ọhụrụ anyị dị na Lagos, bụ́ nke a ka malitere ịrụ ọrụ na ya amalite. Nke a bụ n’ihi na ọ bụ ndị ọrụ na-abụghị Ndịàmà na-arụ ya, ịga nleta ebe ahụ ga-eme ka ọrụ ahụ ghara ịga ngwa ngwa dị ka e si chọọ ya.

◼ Ná mgbakọ sekit na nke pụrụ iche a ga-enwe n’afọ 2006, sekit ndị na-esonụ ga-enwe ebe e debeere ndị ntị chiri oche. A ga-eji asụsụ ndị ogbi tapịara ha usoro ihe omume ahụ. N’Ozi Alaeze Anyị nke March 2006, a ga-ebipụta mgbakọ ndị ọzọ a ga-enwe ndokwa dị otú a:

Badagry (WE-02) January 21-22 na April 23

Badagry (WE-14) January 14-15 na April 22

Ibadan (WE-09) February 11 na June 17-18

Ota (WE-05) January 14-15 na April 8

Ota (WE-25) January 21-22 na April 9

Ubogo (ME-07) February 4-5 na May 21

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya