Ntụleghachi A Ga-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-eji ọnụ zaa ajụjụ ndị na-esonụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ga-amalite n’April 24, 2006. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi ga-ewe minit 30 dabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu March 6 ruo April 24, 2006. [Ihe Ịrịba Ama: N’ebe ndị a na-enweghị ebe e zoro aka na ha ná ngwụsị ajụjụ ọ bụla, ọ ga-adị mkpa ka i mee nnyocha nke gị iji chọta azịza ha.—Lee akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 36-37.]
NKÀ OKWU
1. Mgbe anyị na-ezi ihe, n’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị na anyị ga na-akwụsịtụ mgbe anyị na-agbanwe echiche okwu, oleekwa ihe pụrụ igbochi anyị ime nke ahụ? [be-IB p. 98 para. 2-3]
2. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka anyị na-akwụsịtụ n’okwu anyị mgbe anyị na-agbara ndị ọzọ àmà? [be-IB p. 99 para. 5–p. 100 para. 3]
3. N’ihi gịnị ka imesi okwu ike ji dị mkpa mgbe anyị na-ekwu okwu n’elu ikpo okwu, oleekwa otú anyị ga-esi na-emesi okwu ike n’ụzọ kwesịrị ekwesị? [be-IB p. 101 para. 1-5, igbe]
4. Mgbe anyị na-agụpụta ihe n’ihu ọha, olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na e mesiri echiche ndị bụ́ isi dị n’ihe omume anyị ike? [be-IB p. 105 para. 1-6]
5. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa iji ụda olu kwesịrị ekwesị na-ekwu okwu mgbe anyị na-ezi ihe, oleekwa otú anyị pụrụ isi mata ụda olu dị mma iji mee ihe? [be-IB p. 107-108]
IHE OMUME NKE 1
6. Olee uru Ndịàmà Jehova nke oge a pụrụ irite site n’ịgụ akwụkwọ Esta? [w86 7/1 p. 28 para. 18]
7. Mgbe Solomọn kwuru na “ihe nile bụ ihe efu na ịchọ ijide ifufe,” gịnị ka ọ na-akọwa? (Ekli. 2:11) [w04 10/15 p. 4 para. 3-4]
8. Olee ihe ndị ga-eme ka anyị malite ịhụ Chineke n’anya? (Mak 12:30) [w04 3/1 p. 19-21]
9. Olee ọdịiche dị n’etiti ịchụso ihe ime mmụọ na ịhụ ihe onwunwe n’anya? [w04 10/15 p. 5-7]
10. Gịnị pụrụ inyere anyị aka ịdị na-aṅa ntị ná mgbakọ n’enweghị ihe ọ bụla na-adọpụ uche anyị? [be-IB p. 15-16]
ỌGỤGỤ BIBLE KWA IZU
11. Gịnị mere e ji kpuchie ihu Heman? (Esta 7:8)
12. Olee ụdị mmụọ metụtara echiche Elifaz? (Job 4:15, 16) [w05 9/15 p. 26 para. 2]
13. Okwu Job ahụ e dekọrọ na Job 7:9, 10 nakwa na Job 10:21, ọ̀ na-egosi na Job ekwenyeghị ná mbilite n’ọnwụ?
14. Gịnị ka ọ pụrụ ịbụ na okwu Job ahụ bụ́, “M wee were akpụkpọ ezé m wepụga onwe m,” pụtara? (Job 19:20)
15. Gịnị ka Job bu n’uche mgbe o kwuru, sị, “Ruo mgbe m kubiri ume m gaghị esi n’ebe m nọ wezụga izu okè m,” oleekwa ihe anyị pụrụ isi na nke a mụta? (Job 27:5)