Jiri Akwụkwọ Anyị Na-eme Ihe n’Ụzọ Amamihe Dị na Ya
1 Mgbe anyị malitere iji akwụkwọ anyị eme ihe n’ụzọ a haziri ahazi bụ mgbe e kesara puku isii nke Ụlọ Nche (Bekee) nke July 1, 1879. Kemgbe ahụ, anyị ebipụtala ma kesaa ọtụtụ akwụkwọ dị iche iche.
2 Ndokwa nke Inye Nanị Onyinye: Na December 1999, a kọwara na a ga na-enye ndị nkwusa na ndị nwere mmasị akwụkwọ na magazin nanị site n’ịnata ha onyinye, ya bụ, n’ekwughị ma ọ bụ tụọ aro ego ole a kapịrị ọnụ ha ga-akwụ tupu ha anata akwụkwọ. Ọ bụrụ na e nyefee mmadụ akwụkwọ, onye ahụ ga-enye onyinye iji kwado ọrụ ikwusa ozi ọma a na-arụ n’ụwa nile. Obi abụọ adịghị ya na anyị ahụla na Jehova na-agọzi ndokwa a.—Tụlee Matiu 6:33.
3 Ihe A Ga-eme Mgbe A Nọ n’Ozi Ubi: Anyị ga-anọgide na-eji okwu mmeghe ndị a kwadebere nke ọma na-eme ihe iji kpalie mmasị ndị mmadụ. Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ egosighị mmasị, ọ baghị uru inyewe ya akwụkwọ. Anyị achọghị imefusị akwụkwọ anyị site n’inye ya ndị na-enweghị mmasị. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na onye nwe ụlọ egosi mmasị, kwetakwa na ya ga-agụ akwụkwọ ahụ, e nwere ike inyefe ya ya. Anyị chọrọ iji akwụkwọ anyị na-eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya.
4 Ị pụrụ ikwu ihe ndị na-esonụ mgbe i gosichara onye nwe ụlọ akwụkwọ ahụ, ya egosikwa na ya nwere mmasị ma nara akwụkwọ ahụ: “Ama m na ọ ga-amasị gị. Ọtụtụ ndị na-eche otú e si enweta ego e ji akwado ọrụ a, ebe ọ bụ na anyị na-arụ ya n’ụwa nile. Ọtụtụ ndị natara akwụkwọ anyị egosila na ha nwere ekele maka ihe ha ga-amụta n’ime ya ma jiri obi ha nye ntakịrị onyinye iji kwadoo ọrụ a anyị na-arụ n’ụwa nile. Ọ bụrụ na ndị mmadụ emee otú ahụ, obi na-adị anyị ụtọ ịnabata onyinye ha.”
5 Onye Nwe Ụlọ Ò Gosiri Ezi Mmasị? O doro anya na nzube anyị abụghị ikesa akwụkwọ anyị aghara aghara. Anyị chọrọ ka akwụkwọ anyị mezuo nzube e ji bie ya, ya bụ, inyere ndị nwere obi eziokwu aka ịmụtakwu banyere nzube Jehova ndị dị ebube. Inye ndị na-ejighị ihe ime mmụọ kpọrọ ihe akwụkwọ anyị bụ imefusị ya. (Hib. 12:16) Iji kesaa akwụkwọ anyị n’ụzọ ga-arụpụta ihe, ọ dị mkpa na anyị ga-agbalị ịma mgbe mmadụ gosiri ezi mmasị. Olee otú anyị ga-esi mara mgbe mmadụ gosiri ezi mmasị? Ọ bụrụ na mmadụ ejiri obiọma soro gị kwurịta okwu, nke ahụ na-egosi na onye ahụ nwere ezi mmasị. Ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na ọ na-ege ntị mgbe ị na-ekwu okwu, na-aza ajụjụ ndị ị jụrụ ya, ma na-ekwupụtakwa echiche ya, nke ahụ na-egosi na uche ya dị n’ihe unu na-ekwu. Ọ bụrụ na o ji nkwanye ùgwù gwa gị okwu, nke ahụ na-egosi na o nwere obiọma. Ọ bụrụ na ọ na-ege ntị mgbe ị na-agụ Bible, nke ahụ na-egosi na ọ na-akwanyere Okwu Chineke ùgwù. Ọ na-abakarị uru ịjụ ma hà ga-agụ akwụkwọ ahụ e nyere ha. I nwekwara ike ịgwa ha na ị ga-achọ ịbịaghachi na nke ha ka unu wee gaa n’ihu ná mkparịta ụka ahụ. Ọ bụrụ na onye ahụ ekweta, nke ahụ bụ ihe àmà ọzọ na-egosi na o nwere mmasị. Mgbe ị hụrụ ihe àmà ndị ahụ na-egosi na mmadụ nwere ezi mmasị, o yiri ka onye ahụ ọ̀ ga-eji akwụkwọ ọ bụla ọ natara mee ihe n’ụzọ dị mma.
6 Akwụkwọ Ndị Ị Ga-eji Mee Ihe n’Onwe Gị: Mgbe anyị natara akwụkwọ ndị anyị ga-eji mee ihe n’onwe anyị, anyị kwesịrị icheta na anyị nwere ibu ọrụ nke inye onyinye. Anyị nwere ike inye onyinye ahụ ozugbo anyị natara akwụkwọ ma ọ bụ mgbe e mesịrị. Anyị kwesịkwara ilezi akwụkwọ ndị anyị natara maka iji mee ihe n’onwe anyị anya nke ọma ka anyị wee ghara imetọ ha ma ọ bụ dọkaa ha. Ịhapụrụ ha ụmụaka ka ha jiri gwuriwe egwu adịghị egosi na anyị ji akwụkwọ ndị ahụ dị oké mkpa eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya.
7 Ka mbibi Babilọn Ukwu ahụ na-eru nso, ọtụtụ mmadụ anaghịzi enwecha mmasị n’okpukpe. Ihe kasị dịrị anyị mkpa bụ ịhụ na a nọgidere na-arụ ọrụ a dị mkpa, nke bụ́ ikwusa banyere Alaeze ahụ n’ụwa nile, n’enweghị ihe mgbochi ọ bụla, si otú a na-enye ọtụtụ ndị ọzọ ohere nke inweta nzọpụta.—Mat. 24:14; Rom 10:13, 14.