Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/06 p. 1
  • Ahapụla Ịhụnanya ahụ I Nwere na Mbụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ahapụla Ịhụnanya ahụ I Nwere na Mbụ
  • Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ekwela Ka Ịhụnanya Gị Nyụọ Ka Ọkụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Ihe Ịhụ Onye Agbata Obi Anyị n’Anya Pụtara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • “Hụ Jehova Bụ́ Chineke Gị n’Anya”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2014
  • Bụrụ Onye Ịhụnanya Na-ewuli Elu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2006
km 12/06 p. 1

Ahapụla Ịhụnanya ahụ I Nwere na Mbụ

1 Jizọs ahụ e mere ka ọ dị ebube dụrụ ndị nọ n’ọgbakọ dị n’Efesọs na narị afọ mbụ ọdụ, sị: “Enwere m ihe a megide gị, na ị hapụwo ịhụnanya ahụ i nwere na mbụ.” (Mkpu. 2:4) O yiri nnọọ ka ọtụtụ n’ime ha hà ahapụla ịhụnanya mbụ ha nwere n’ebe Jehova nọ. Mgbe anyị ka na-amụ eziokwu ahụ ọhụrụ, anyị malitere ịhụ Jehova na ndị agbata obi anyị n’anya nke ukwuu, nke a kpalikwara anyị iji ịnụ ọkụ n’obi na-agwa ndị mmadụ banyere olileanya ọhụrụ anyị nwere. Olee ihe ga-eme ka anyị ghara ịhapụ ịhụnanya ahụ anyị nwere na mbụ na ịnụ ọkụ n’obi anyị jibu eje ozi?

2 Inwe Ọmụmụ Ihe Onwe Onye na Ịga Nzukọ: Gịnị kpaliri anyị ịhụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya mgbe anyị mụtara eziokwu ahụ ọhụrụ? Ọ́ bụghị ihe nile anyị mụtara banyere Jehova mgbe anyị na-amụ Bible kpaliri anyị ime otú ahụ? (1 Jọn 4:16, 19) N’ihi ya, ka ịhụnanya anyị “wee na-amụbawanye n’ezi ihe ọmụma na nghọta zuru ezu,” anyị ga-anọgiderịrị na-enweta ezi ihe ọmụma, ma na-enyocha “ihe ndị miri emi nke Chineke.”—Fil. 1:9-11; 1 Kọr. 2:10.

3 Ọ pụrụ isi nnọọ ike ịdị na-enwechi ọmụmụ ihe onwe onye anya n’ụbọchị ikpeazụ a jupụtara n’ọtụtụ nchekasị na ihe ndọpụ uche. (2 Tim. 3:1) Ma anyị aghaghị iwepụta oge iji na-amụ Okwu Chineke. Ịgachi ọmụmụ ihe anya dị oké mkpa karịsịa ka anyị “na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.”—Hib. 10:24, 25.

4 Ịga Ozi Ọma: Iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma na-enyere anyị aka ịnọgide na-ahụ Chineke n’anya dị ka anyị hụrụ ya na mbụ. Ka anyị na-ekwusa ozi ọma, anyị ga na-echeta nkwa ndị Jehova ji ịhụnanya kwe anyị, nke a ga-emekwa ka olileanya anyị sikwuo ike, meekwa ka anyị ghara ịhapụ ịhụnanya anyị nwere na mbụ. Iji nwee ike ịkụzi eziokwu Bible, ọ dị anyị mkpa ime nnyocha iji ghọta ha nke ọma n’onwe anyị, nke a na-emekwa ka okwukwe anyị sikwuo ike.—1 Tim. 4:15, 16.

5 Jehova kwesịrị ịnara ihe nile, gụnyekwara ịhụnanya anyị. (Mkpu. 4:11) Ekwela ka ịhụnanya gị jụọ oyi. Mee ka ịhụnanya i nwere na mbụ nọgide na-esi ike site n’ịdị na-enwe ọmụmụ Bible onwe onye, site n’ịdị na-agachi ọmụmụ ihe anya, nakwa site n’ịdị na-eji ịnụ ọkụ n’obi ezi ndị ọzọ ozi ọma.—Rom 10:10.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya