Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 12/06 p. 2-7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2006
Ozi Alaeze Anyi—2006
km 12/06 p. 2-7

Ịma Ọkwa

◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa December: Nyefee akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụrụ na e nweghị ya, ị pụrụ inyefe Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible na Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. January: A pụrụ inyefe akwụkwọ ọ bụla e bipụtara tupu 1991. Ọ bụrụ na ọgbakọ enweghị ya, a pụrụ inyefe akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ọ bụ broshuọ bụ́ Nọrọ na Nche! February: A ga-enyefe akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụrụ na ọgbakọ enweghị ya, a pụrụ inyefe akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! ma ọ bụ akwụkwọ ọzọ merela ochie unu nwere n’ọgbakọ unu. March: Nyefee akwụkwọ Bible Na-akụzi ma gbalịsie ike iji ya duziwere ndị i nyefere ya ọmụmụ Bible.

◼ Biko maranụ na ụbọchị a ga-eme ihe omume a ga-eji echeta ọnwụ Jizọs n’afọ 2008 bụ na Saturday, March 22, mgbe anyanwụ dasịrị. Ihe mere e ji ama ọkwa a n’oge bụ ka ụmụnna wee nwee ike ime ndokwa ndị dị mkpa iji nweta ụlọ nzukọ ọgbakọ ha ga-anọ eme ya ma ọ bụrụ na e nwere ọtụtụ ọgbakọ ji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe, ya abụrụkwa na a ga-enwetarịrị ụlọ nzukọ ọzọ. N’ọnọdụ dị otú ahụ, ndị okenye kwesịrị iso ndị nwe ụlọ nzukọ ọ bụla e nwetara nwee nkwekọrịta iji jide n’aka na ọ dịghị ihe omume ọzọ a ga-anọ n’ụlọ nzukọ ahụ mee n’ụbọchị ahụ, ka e wee nwee ike ime ihe omume a e ji echeta ọnwụ Jizọs n’udo nakwa n’ụzọ dị n’usoro. N’ihi otú ihe omume e ji echeta ọnwụ Jizọs dịruru ná mkpa, òtù ndị okenye kwesịrị ịhọrọ otu n’ime ndị okenye ka ruo eruo ka ọ bụrụ ọkà okwu, kama ịdị na-eke ya eke ma ọ bụ ikwe ka otu nwanna na-ekwu ya kwa afọ. Ọ bụrụ na e nwere okenye so ná ndị e tere mmanụ nke nwere ike ikwu okwu ahụ, e kwesịrị ịhọrọ ya ka o kwuo ya.

◼ Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị E Nwere:

Teta! (Mpịakọta nke 2005)—Bekee

Ụlọ Nche (Mpịakọta nke 2005)—Bekee

◼ Kaseti Ndị Ọhụrụ A Na-egere Egere E Nwere:

Doing God’s Will With Zeal (Ihe Nkiri, ọ dị otu kaseti)—French

Bịaruo Jehova Nso (kaseti asatọ dị n’ime otu ọ́bọ́)—French

Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ (kaseti ise dị n’ime otu ọ́bọ́)—French

Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ (kaseti asatọ dị n’ime otu ọ́bọ́)—French

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? (kaseti ise dị n’ime otu ọ́bọ́)—French

◼ Compact Disc Ndị Ọhụrụ E Nwere:

A Satisfying Life—How to Attain It—nke dị na Compact Disc (ọ dị disc abụọ)—Bekee

Bịaruo Jehova Nso—nke dị na Compact Disc (ọ dị disc iri na otu)—French

Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible—nke dị na Compact Disc (ọ dị disc isii)—Bekee

Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?—nke dị na Compact Disc (ọ dị disc abụọ)—Bekee

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?—nke dị na Compact Disc (ọ dị disc asaa)—French

◼ Vidio Ndị Ọhụrụ E Nwere:

Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie?—nke dị na kaseti Vidio—Ụdị Asụsụ Ogbi nke America

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?—nke dị na kaseti Vidio, Mpịakọta nke 1-6—Ụdị Asụsụ Ogbi nke America

Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe—nke dị na kaseti Vidio, Mpịakọta nke 1-8—Ụdị Asụsụ Ogbi nke America

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya