Ịhụnanya—Isi Ihe Na-eme Ka Anyị Na-arụpụta Ihe n’Ozi Ubi
1 “Bịakwutenụ m, . . . m ga-emekwa ka unu nwee ume ọhụrụ.” (Mat. 11:28) Okwu ndị a na-emetụ n’ahụ́ Jizọs kwuru na-eme ka a hụ ezi ịhụnanya o nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ. Dị ka ndị ozi bụ́ Ndị Kraịst, anyị na-achọ iṅomi Jizọs site n’igosipụta ịhụnanya anyị nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ, bụ́ ndị ike ibi n’ụwa a ịhụnanya na-adịghị na ya gwụrụla. Olee otú anyị pụrụ isi mee nke a mgbe anyị nọ n’ozi ubi?
2 N’okwu Ọnụ: Ịhụnanya Jizọs nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ kpaliri ya iji ohere ọ bụla dapụtaranụ zie ha ozi ọma. (Jọn 4:7-14) Ịhụnanya ga-eme ka anyị ghara ịdị na-atụ ụjọ ịgba àmà mgbe anyị na-anọghị n’ozi. Otu nwata nwanyị dị afọ isii ziri otu nwanyị nọ n’akụkụ ya ozi ọma mgbe ha na-eche ịhụ dọkịta. Gịnị kpaliri ya izi nwanyị ahụ ozi ọma? Nwata ahụ kwuru, sị, “Nwanyị ahụ yiri m onye ga-achọ ịmata Jehova.”
3 Anyị pụrụ iji ezigbo ihu ọchị na olu ọma gosi na anyị nwere mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ. Anyị na-egosikwa na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya mgbe anyị na-ege ha ntị nke ọma ma ha kwuwe okwu, mgbe anyị na-egosi na anyị ghọtara nchegbu ndị ha na-enwe, na mgbe anyị na-egosi na anyị nwere ezi mmasị n’ebe ha nọ. (Ilu 15:23) Dị ka Jizọs mere, anyị kwesịrị ime ka ndị mmadụ mara nnọọ uru ozi Alaeze ahụ bara, meekwa ka ha mara na Jehova nwere ezi ịhụnanya n’ebe ndị mmadụ nọ.—Mat. 24:14; Luk 4:18.
4 N’omume: Jizọs gosiri na nsogbu ndị mmadụ nọ ya na-emetụ ya n’ahụ́ site n’ime ihe banyere ya. (Mat. 15:32) Anyị onwe anyị nwekwara ike ịhụ ọnọdụ ndị chọrọ ka anyị gosi ndị mmadụ obiọma mgbe anyị nọ n’ozi ubi. Otu nwanna nwanyị hụrụ otú o si esiri otu nwanyị na-akpọ fon dị ya mkpa ike ịghọta asụsụ onye ya na ya na-ekwu na fon ji agwa ya okwu. Nwanna nwanyị ahụ bịara nyere ya aka site n’ịsụgharịrị ya ihe onye ahụ ya na ya na-ekwu na fon na-agwa ya. Ihe a nwanna nwanyị a ji ịhụnanya mee mere ka o nwee ike izi nwanyị ahụ ozi ọma, nke a mekwara ka nwanyị ahụ kweta ịmụ Bible. Ihe atụ ọzọ bụ nke nwanna nwoke gara nletaghachi na nke otu nwoke, ma hụ na ike agwụchaala nwoke ahụ n’ihi oche dị arụ o bu rute n’ọnụ ụzọ ya. Nwanna nwoke ahụ nyeere ya aka buba oche ahụ n’ime ụlọ. Nke a tọkwara nwoke ahụ ụtọ. Nwanna ahụ nọdụrụ n’oche ahụ ma malite iduziri nwoke a ọmụmụ Bible.
5 Mgbe anyị na-aga ozi ọma, anyị na-egosi na anyị hụrụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya. (Mat. 22:36-40) Ụdị ịhụnanya a anyị ji okwu ọnụ na omume egosipụta na-enyere ndị nwere obi eziokwu aka ịma na anyị na-akụzi eziokwu ahụ.