Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa February 1-18: A ga-enyefe akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso. Ọ bụrụ na ọgbakọ enweghị ya, a pụrụ inyefe akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso! ma ọ bụ akwụkwọ ọzọ merela ochie unu nwere n’ọgbakọ unu. February 19–March 18: A ga-eme Mkpọsa Pụrụ Iche maka ikesa Akụkọ Alaeze nke 37, nke isiokwu ya bụ, “A Ga-ebibi Okpukpe Ụgha n’Oge Na-adịghị Anya!” March 19-31: Nyefee akwụkwọ Bible Na-akụzi ma gbalịsie ike iji ya duziwere ndị i nyefere ya ọmụmụ Bible. April na May: A ga-enyefe Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị na-eme nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, nke gụnyere ndị bịara ihe omume e ji echeta ọnwụ Jizọs ma ọ bụ ndị bịara ya ma na-abịakwa nzukọ anyị ndị ọzọ ma ha adịghị eso ọgbakọ akpachi anya, gbalịsie ike inyefe ha akwụkwọ Bible Na-akụzi. Nzube anyị ji enyefe ha ya kwesịrị ịbụ iji ya duziwere ha ọmụmụ Bible.
◼ Odeakwụkwọ na onye nlekọta ije ozi kwesịrị ịtụleghachi ọrụ ndị nile na-arụ ọrụ ọsụ ụzọ oge nile. Ọ bụrụ na e nwere onye ọ na-esiri ike ịrụzu awa ole a chọrọ ya n’aka, ndị okenye kwesịrị ime ndokwa ka e nyere ya aka. Maka aro ụfọdụ, tụleghachinụ akwụkwọ ozi S-201 bụ́ nke a na-edetara ndị okenye kwa afọ.
◼ Isiokwu nke okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge Ememe Ncheta nke afọ 2007 ga-abụ “Ị Pụrụ Ịnọ ná Nchebe n’Ụwa A Nsogbu Juru na Ya!” Lee Ozi Alaeze anyị nke October 2006 maka ịma ọkwa yiri nke a.
◼ Ná mgbakọ sekit na nke pụrụ iche a ga-enwe n’afọ 2007, sekit ndị na-esonụ ga-enwe ebe e debeere ndị ntị chiri oche. A ga-eji asụsụ ndị ogbi tapịara ha usoro ihe omume ahụ:
Akabo (EE-08) March 18 na September 22-23
Akure (WE-12) February 17 na August 11-12
Badagry (WE-02) June 9-10 na September 2
Badagry (WE-04) June 16 na July 28-29
Badagry (WE-14) May 12-13 na July 22
Badagry (WE-23) June 17 na September 8-9
Benin City (ME-01) March 24-25 na July 8
Calabar (EE-21) June 10 na September 15-16
Daluwon (WE-01) February 10-11 na July 8
Daluwon (WE-03) February 24-25 na June 2
Daluwon (WE-13) March 17-18 na June 23
Daluwon (WE-22) June 30 na October 6-7
Enugu (EE-17) February 4 na June 23-24
Enugu (EE-19) January 20-21 na August 4
Ibadan (WE-09) March 17 na July 28-29
Ibadan (WE-10) August 5 na September 29-30
Igwuruta Ali (EE-22) February 18 na May 5-6
Ilesa (WE-15) March 24-25 na July 7
Kaduna (NE-01b) May 5-6 na August 11
Ota (WE-05) March 31–April 1 na August 18
Ota (WE-06) January 6-7 na March 17
Ota (WE-07) May 5-6 na August 19
Ota (WE-25) March 18 na June 23-24
Ubogo (ME-07) February 3 na July 14-15
Uli (EE-24) May 26-27 na August 12
Uyo (EE-20) March 4 na July 7-8