Ntụleghachi A Ga-eme n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị na-esonụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ga-amalite n’April 30, 2007. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-eduzi ntụleghachi ga-ewe minit 30 dabere n’ihe ndị a tụlere n’ihe omume ndị e mere n’izu March 5 ruo April 30, 2007. [Ihe Ị Ga-arịba Ama: N’ebe ndị a na-enweghị ebe e zoro aka na ha ná ngwụsị ajụjụ ọ bụla, ọ ga-adị mkpa ka i mee nnyocha nke gị iji chọta azịza ha.—Lee akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 36-37.]
NKÀ OKWU
1. Olee otú anyị pụrụ isi mee ka ihe ndepụta anyị ga-eji kwuo okwu dị mfe? [be-IB p. 168 para. 3]
2. Kwuo ụzọ anọ ndị anyị pụrụ isi kwuo okwu anyị n’ụzọ ezi uche dị na ya. [be-IB p. 170 para. 3-p. 172 para. 4]
3. Olee ihe ndị anyị kwesịrị iburu n’uche mgbe anyị na-ekpebi ihe anyị ga-ekwu mgbe anyị nwere ihe omume? [be-IB p. 173 para. 1, 2]
4. Olee ụfọdụ uru ikwu okwu n’agụghị ya agụ bara? [be-IB p. 175 para. 2-4]
5. Gịnị mere ikwu okwu n’ụzọ mkparịta ụka ji dị mkpa, oleekwa otú anyị pụrụ isi mụta ya? [be-IB p. 179 para. 4, igbe; p. 180, igbe]
IHE OMUME NKE 1
6. Olee otú nwanna e kenyere ịtụle isi ihe sitere n’ọgụgụ Bible kwesịrị isi kwadebe ya? [be-IB p. 47 para. 3, 4]
7. Olee ihe dị nnọọ mkpa banyere àjà mgbapụta Kraịst karịa uru ndị anyị na-erite na ya? [w05-IB 11/1 p. 14 para. 1]
8. Olee otú e kwesịrị isi jiri akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha mee ihe mgbe a na-ekwu okwu ihu ọha? [be-IB p. 53 para. 1, 2]
9. Olee ebumnobi Jizọs ji kụzie ihe, oleekwa otú anyị pụrụ isi ṅomie ya? [be-IB p. 57 para. 1]
10. Olee uru ọ bara igosi ọdịiche dị n’ihe mgbe anyị na-ezi ihe? [be-IB p. 57 para. 3, 4]
ỌGỤGỤ BIBLE DỊỊRỊ IZU
11. Olee otú anyị pụrụ isi tinye ndụmọdụ ahụ dị na Jeremaịa 6:16 n’ọrụ, bụ́ nke kwuru ka anyị jụọ ajụjụ banyere “okporo ụzọ nile nke mgbe ebighị ebi gara aga, sị, Olee ebe ezi ụzọ dịkwa”?
12. Gịnị mere Jehova ji họrọ ụgbala dị ka ihe ọ ga-eji kụziere ndị Juu na-ekwesịghị ntụkwasị obi ihe gbara ọkpụrụkpụ, gịnịkwa ka anyị pụrụ ịmụta site na nke a? (Jer. 8:7)
13. Olee otú anyị pụrụ isi tinye ihe dị na Jeremaịa 15:17 n’ọrụ ma a bịa n’otú anyị si ele ntụrụndụ anya taa?
14. Olee otú ụmụ mmadụ si dị ka ụrọ n’aka Ọkpụite Ukwu, bụ́ Jehova? (Jer. 18:5-11)
15. Gịnị ka usoro e ji depụtasịa aha mba dị iche iche na Jeremaịa 25:17-26 na-egosi taa?