Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa May: A ga-enyefe Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị na-eme nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, nke gụnyere ndị bịara ihe omume e ji echeta ọnwụ Jizọs ma ọ bụ ndị bịara ya ma na-abịakwa nzukọ anyị ndị ọzọ ma ha adịghị eso ọgbakọ akpachi anya, gbalịsie ike inyefe ha akwụkwọ Bible Na-akụzi. Nzube anyị ji enyefe ha ya kwesịrị ịbụ iji ya duziwere ha ọmụmụ Bible. June: Nyefee akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ, ma ọ bụ akwụkwọ Obi Ụtọ Ezinụlọ. July na August: A pụrụ inyefe nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị a dị peeji 32: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ?—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, Ịdị Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke! “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ bụ Imerụ Gị Ahụ́? Hà Dị Adị n’Ezie, Nọrọ na Nche!, Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs, na Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?
◼ N’akwụkwọ ndọrọ ego ọ bụla e nyere n’onyinye bụ́ nke e tinyere n’igbe onyinye ndị dị ná mgbakọ distrikti maka ọrụ zuru ụwa ọnụ nakwa nke a na-ezitere alaka ụlọ ọrụ anyị, e kwesịrị ide “Watch Tower Society” dị ka ndị ọ bụ ha ga-adọrọ ego ahụ.
◼ Òtù ndị okenye kwesịrị ịtụleghachi akwụkwọ ozi July 6, 2006, bụ́ nke kwuru banyere ịkwadebe maka ọdachi, ma jide n’aka na ha ji adres ma ọ bụ nọmba fon nke onye nkwusa ọ bụla. N’ebe ọdachi na-emekarị, e kwesịrị inweta ihe ọmụma ndị ọzọ ga-eme ka e nwee ike ịkpọtụrụ onye nkwusa mgbe e nwere ọnọdụ mberede. N’ezie, e wezụga oge e nwere ọnọdụ mberede, ọ dịkwa mma ka ndị nkwusa na-eme ka onye nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ha mara mgbe ha na-agaghị anọ ya ruo ogologo oge, dị ka mgbe ha na-eme njem maka ezumike ma ọ bụ maka achụmnta ego, mgbe ha nọ n’ụlọ ọgwụ, nakwa n’oge ndị ọzọ.