Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa July na August: A pụrụ inyefe nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị a dị peeji 32: Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Ịdị Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Nọrọ na Nche!, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ bụ Imerụ Gị Ahụ́? Hà Dị Adị n’Ezie?, Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs, Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ?—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere?, na Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke! September: A ga-enyefe akwụkwọ Bible Na-akụzi. E kwesịrị ime mgbalị pụrụ iche iji malite iduziri ndị mmadụ ọmụmụ Bible n’oge mbụ anyị nyefere ha akwụkwọ a. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ enweela akwụkwọ a enwee, mee ka ha hụ otú ha pụrụ isi rite uru na ya site n’igosi ha, n’ụzọ dị nkenke, otú e si eji akwụkwọ ahụ amụ Bible. October: Nyefee magazin Ụlọ Nche na Teta! N’ebe e gosiri mmasị, biko nyefee ha traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible?, sorokwa ha kwurịta ihe dị na ya n’ebumnobi nke ịmalite ọmụmụ Bible.
◼ Ebe ọ bụ na e nwere ngwụsị izu ise zuru ezu n’ọnwa September, ọ ga-abụ ọnwa magburu onwe ya ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.
◼ Malite na September, ndị nlekọta sekit ga na-ekwu okwu ihu ọha nke isiokwu ya bụ, “Olee Ihe Ndị Na-egosi na Ihe Bible Na-ekwu Bụ Eziokwu?”
◼ A na-atụ aro ka a na-ezitere alaka ụlọ ọrụ fọm ndị chọrọ ịbanye n’ozi ọsụ ụzọ oge nile dejupụtara, ọ dịkarịa ala ụbọchị 30 tupu ụbọchị ha chọrọ ịmalite eruo. Odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị ịtụleghachi fọm ndị ahụ iji jide n’aka na e dejupụtara ha nke ọma. Ọ bụrụ na ndị dejupụtara ya apụghị icheta kpọmkwem ụbọchị e mere ha baptizim, ha kwesịrị ịhọrọ otu ụbọchị ma buru ya n’uche. Odeakwụkwọ kwesịrị idetu ụbọchị ahụ na kaadị Congregation’s Publisher Record (S-21).
◼ Dị ka a na-eme kwa afọ, e kwesịrị ịgụkọ akwụkwọ na magazin nile e nwere n’ọgbakọ n’August 31, 2007, ma ọ bụ n’ụbọchị dị ya nso, dị ka o kwere mee. Ngụkọ a yiri ọgụgụ onye nlekọta akwụkwọ nke ọgbakọ a na-esi n’aka ya atụ ọda akwụkwọ na-agụ akwụkwọ ole e nwere kwa ọnwa, e kwesịkwara idebanye ọnụ ọgụgụ ha na fọm Literature Inventory (S-18). E kwesịrị ịjụta onye ma ọ bụ ndị na-elekọta magazin, magazin ole e nwere. Odeakwụkwọ nke ọgbakọ a na-esi n’aka ya atụ ọda akwụkwọ kwesịrị ịhụ maka ngụkọ ahụ. Ya na onyeisi oche ndị nlekọta nke ọgbakọ a na-esi n’aka ya atụ ọda akwụkwọ ga-abịanye aka na fọm ahụ. Ọgbakọ ọ bụla a na-esi n’aka ya atụ ọda akwụkwọ ga-enweta fọm Literature Inventory atọ. Mgbe unu dejupụtasịrị fọm ahụ, biko ziterenụ alaka ụlọ ọrụ otu tupu September 6 agafee. Debenụ otu na faịlụ unu. Unu pụrụ iji fọm nke fọdụrụnụ mee mgbakọ na mwepụ unu ga-eme na ya.
◼ A na-ezitere ọgbakọ ọ bụla fọm Literacy Report abụọ. Mgbe ọgbakọ unu dejupụtasịrị nke ha, biko ziterenụ alaka ụlọ ọrụ anyị otu n’August 1. Tinyenụ fọm nke ọzọ na faịlụ ọgbakọ unu.