Ịma Ọkwa
◼ August: E nwere ike inyefe nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị a dị peeji iri atọ na abụọ: Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Nọrọ na Nche!, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ́? Hà Dị Adị n’Ezie?, Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs, Ụzọ Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi—Ị̀ Chọtawo Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ?—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere?, na Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke! September: A ga-enyefe akwụkwọ Bible Na-akụzi. E kwesịrị ime mgbalị pụrụ iche ịmalite iduziri ndị mmadụ ọmụmụ Bible n’ụbọchị mbụ anyị gara na nke ha. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere akwụkwọ a, mee ka ha hụ otú ha nwere ike isi rite uru na ya site n’igosi ha, ná nkenke, otú e si eji akwụkwọ ahụ amụ Bible. October: Nyefee magazin Ụlọ Nche na Teta! N’ebe e gosiri mmasị, nyefee ha traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? Gị na ha kwurịta ihe dị na ya ka i wee malite iduziri ha ọmụmụ Bible. November: A ga-enyefe akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ asị na ha enweghị ụmụaka, nyefee ha broshuọ bụ́ Nọrọ na Nche!
◼ Ebe ọ bụ na a ga-enwe ngwụsị izu ise zuru ezu n’ọnwa September, ọ ga-abụ ọnwa magburu onwe ya ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.
◼ A na-echetara ndị okenye ka ha soro ntụziaka ahụ e nyere n’Ụlọ Nche April 15, 1991, peeji nke iri abụọ na otu ruo iri abụọ na atọ, banyere ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ ma ọ bụ ndị kewapụrụ onwe ha, bụ́ ndị chọrọ ka a nabataghachi ha.
◼ A jụọla ma ò kwesịrị ekwesị ka e rie oriri agbamakwụkwọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụkwanụ n’ogige ya. Biko, buru n’uche na nke a ekwesịghị ekwesị. E kwesịghị ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze rie oriri agbamakwụkwọ, n’ihi na ọ ga-ewetu ùgwù nke ebe ahụ a na-anọ efe ofufe. Ụlọ Nche (Bekee) nke September 15, 1956, peeji nke narị ise na iri asaa na otu, paragraf nke iri na abụọ, kwuru, sị: “E nwere ike ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze gbaa akwụkwọ n’oge ọ bụla na-agaghị emetụta nzukọ ọgbakọ ma ọ bụ ihe omume ndị ọzọ metụtara ozi anyị. E kwesịghị ịnọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze rie oriri agbamakwụkwọ, werezie ya mere ebe a na-anọ atụrụ ndụ.” Òtù ndị okenye ekwesịghị ịkwado ka e jiri Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ ogige ya rie oriri agbamakwụkwọ. Peeji nke otu narị na iri abụọ ruo otu narị na iri abụọ na atọ nke akwụkwọ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova kwuru ihe e nwere ike iji Ụlọ Nzukọ Alaeze mee na otú a ga-esi na-elekọta ya.